Etu e si kpụpụ Loveth Helen n'ụlọikpe maka ịgba ama 'ihe ịrịbaama ụgha' n'ụlọekpere Ebuka Obi

Loveth Helen Alo
Nkọwa foto, Loveth Helen Alo
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ngalaba nyocha ihe miri emi nke ndị uweojii n'Enugwu steeti ejidela ma kpụpụ nwada Lovett Helen Alo ụlọikpe maka ebubo ịgbaama asi a sị ọ gbara n'ụlọ ekpere 'Zion Ministry' dị na Legọs steeti.

Dịka ndị uweojii siri kwuo, e boro nwada ahụ ebubo ịtụ asị kwuo na ya zụtara ụlọ ebe obibi dị n'Enugwu steeti; mana abụghị eziokwu, ụlọ ahụ bụ nke onye ọzọ.

Ha sị na nwada Lovett kwukwara na ya goro ụlọ ahụ ihe karịrị narị nde abụọ (N200 million) nke mere e jiri kpụpụ ya ụlọikpe maigie dị 'Enugwu Nọt n'ụbọchị Tụzde 11 Maachị 2025.

E kwuru na Loveth Helen Alo dị afọ iri atọ na abụọ (32) gara n'ụlọ ekpere 'Zion Ministry' dị na Legọs n'ọnwa Febụwarị 2025, nwere gbaa ama ahụ na-ese okwu.

Oge onye ekpere bụ Ebuka Obi gwara ya ka o gosị ihe akaebe "evidence" n'ụlọ bụ nke ya, nwada ahụ gosiri ihe onyonyo na foto o mechara n'ime ụlọ ahụ nakwa gburu gburu ya. Nke a mere onye ọbụla jiri kweta na ọ bụ ụlọ ya n'ezie.

Ụlọ ahụ a na-ekwu maka ya bụ "dụplex" nọ na "Plot 16 WTC Estate" dị n'Enugwu steeti.

Mana ka mkpụrụ ụbọchị ole ma ole gachara, a chọpụtara na ọ bụ okpotokpo asị ka ya bụ nwaagbọghọ tụrụ.

Aka ndị uweojii nakwa nke onye nwe ya bụ "Estate" bụ Mazị Jude Asogwa kpaara Loveth ka ya bụ eze ka udene kwuo mmụọ chiri ya ọzọ.

Ka a kpụpụtara Loveth n'ụlọikpe 'Enugu North Magistrate Court' na Tụzde, a gụpụtara ụzọ ebubo ise a na-ebo ya nke gụnyere, ịtụ asị, ịgba ama asị, ịkwutọ aha mmadụ, ịchọ ịnara ma ree ụlọ mmadụ n'ike, mana nwada ahụ kwuru na-ikpe amaghị ya "not guilty".

Ihe Helen na ọkaiwu ya kwuru n'ụlọikpe

Enugu North Magistrate Court
Nkọwa foto, Enugu North Magistrate Court

Okaikpe Charles Emeka Nwodo bụ onye na-ekwuchitere Loveth Helen kwuru na aka Nwada ahụ dị ọcha.

Loveth Helen gara n'ihu gwa ndị ntaakụkọ na ihe ya jiri gbaama asị ahụ bụ maka na ya nwere olileanya na ya ga-azụ ụlọ ahụ n'ọdịnihu.

O kwuru na ọ bụ okwukwe ka ya jiri gaa mee ihe onyonyo n'ụlọ mmadụ ma kwupụta na ya zụrụ ụlọ ahụ.

O tiri mkpu sị na onweghị onye ya na ya kpara nkata ahụ, na ọ bụ nanị ya chepụtara ajọ echiche ahụ.

Anyị gbara mbọ ka anyị na ndị ọkaikpe ndị uweojii bụ onye wetara ikpe ahụ n'ụlọikpe kwuo okwu, mana ọ jụrụ ajụ, sị na ọ bụ ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii ga-enye osịsa niile.

Ọkaikpe nke nọchitekwara mazi Jude Asogwa bụ onye nwe ụlọ ahụ jụkwara ịkwuokwu n'ihi na onye isi ha abịaghị ụlọikpe.

Ihe ndị uweojii kwuru

Anyị gbara mbọ ka anyị na ndị ọkaikpe ndị uweojii bụ onye wetara ikpe ahụ n'ụlọikpe kwuo okwu, mana ọ jụrụ ajụ, sị na ọ bụ ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii ga-enye osịsa niile.

Mana ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Daniel Ndukwe wepụtara, Nwada Loveth asaala asịsa n'aka ndị Uweojii sị na ọ bụ eziokwu na ya gbara ama asị were kwuo na onweghị onye ya na ya kpara nkata ahụ.

N'aka nke ọzọ, ọkaikpe nke nọchitekwara mazi Jude Asogwa bụ onye nwe ụlọ ahụ jụkwara ịkwuokwu n'ihi na onye isi ha abịaghị ụlọikpe.

O nwere ihe Ebuka Obi kwuru banyere ikpe a?

Evang. Ebuka Obi
Nkọwa foto, Evang. Ebuka Obi

Cheta na kamgbe akụkọ a na-efegharị na soshal midia, onyeisi ụlọ ekpere 'Zion Ministry' bụ Evangelist Ebuka Obi agwala ndị uweojii na ndị ọ dị n'aka itinye anya na mmiri chọpụta ndị ziri nwaagbọghọ ahụ nakwa ndị niile ya na ya kpara nkata ka ọ bia gbaa ama asị ahụ.

Mana ka agụpụtachara ya bụ ebubo e boro Nwada ahụ n'ụlọikpe, Magistrate nke Enugwu North gwara ya ka ọkwụ ụgwọ ruru otu nde naira tupu enye ya bail.

E bugazịrị ịnụ ikpe ahụ n'uju n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Eprel 2025.