Raila Odinga bụ 'nna ọchịchị onye kwuo uche ya' na Kenya anwụọla ka ọ gbara afọ 80

Ebe foto si, Reuters
- Onye dere ya, Basillioh Rukanga
- Ebeg o si, Nairobi
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Raila Odinga bụbu Praịm Mịnịsta mba Kenya anwụọla dịka ọ gbachara afọ iri asatọ, otu onye ezinaụlọ ha gwara BBC.
Odinga nwụrụ na Wednezde mgbe ọ na-ata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ dị n'India. Ọ dara n'ala mgbe ọ na-aga ije ụtụtụ e buru ya gawa n'ụlọọgwụ Deyamatha ebe e kwuru na ọ bụ ọrịa obi mkpochi 'cardiac arrest' mana e nweghi ike ịtute ya dịka e kwupụtara ọnwụ ya n'elekere ise nke ụtụtụ.
Na nso nso a e nweela ọtụtụ kepu kepu banyere ahụike ya, mana ndị ezinaụlọ na ndị otu katọrọ akụkọ ndị ahụ kwuru na ahụ adịghị ya.
Onyeisiala mba Kenya bụ William Ruto akwanyerela ya ugwu ikpeazụ ma sị na ọ bụ "ọkụ na-esi obi ike" na "nna ọchịchị onye kwuo uche ya".
Ọ gakwara njem nleta n'ezinaụlọ Odinga ebe o tiri ha nwunye ya bụ Ida Odinga aka n'obi maka ọnwụ di ya na nna ha.
E nyere iwu na mba Kenya niile na-eru uju Odinga ụbọchị asaa dịka gọọmenti ga-ahụ maka olili ya.
Ndị ndọrọ ndọrọ na mba Kenya nakwa ndị ndu mbaụwa na-eziga ozi itiaka n'obi ha.
Ndị a gụnyere Praịm Mịnịsta mba India bụ Narendra Modi kọwara Odinga dịka "ezigbo onyendu obodo na ezi enyi ndị India".
Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa kwuru na Odinga bụ "onyendu ji ihe banyere mba ya nakwa Afrịka niile kpọro ihu" ebe Hakainde Hichilema nke mba Zambia kọwara Odinga dịka "onye na-akwalite ọchịchị onye kwuo uche ya", onye ọrụ ya ga-anọte aka.
Ezinaụlọ Odinga na mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta Kenya na mba ndị ọzọ ga-aga mba Indi ibulata ozu Odinga.

Ebe foto si, State House Kenya
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Odinga bụ onye gbara nnukwu mgbọrọgwụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị mba Kenya, Ọ zọrọ ọkwa onyeisiala ugboro ise mana o merighi. Ọ na-ajụkaarị mpụtara ntuliaka ma kwuo na e zurula mmeri ya.
N'afọ 2017, ụlọikpe kagburu mmeri Uhuru Kenyatta meriri ya na ntuliaka ma sị ka e megharịa ntuliaka ahụ mana ọ jụrụ iso zọọ ọkwa na mmegharị ahụ.
Ọgbaghara kachasị nke mere na mba Kenya n'afọ 2007 mgbe Odinga kwuru na mmeri Mwai Kibaki mere ya bụ aghụghọ nke mere o jiri malite ngagharịiwe.
Ọgbaghara dapụtara n'obodo nke butere ọnwụ mmadụ 1,200 ebe mmadụ 600,000 hapụrụ ụlọ ha gbaa ọsọ n'ike.
Iji gboo nsogbu ahụ, otu United Nation nke onyeisi ha bụ Kofi Annan wepụtara usoro ikewa ọchịchị ụzọ abụọ bụ ebe e mere Odinga praịm mịnịsta.
Mgbe e merichara ya na ntuliaka afọ 2022, Odinga mechara soro ọchịchị Onyeisiala William Ruto nke mere e jiri tinye ọtụtụ ndị nkwado ya n'ọkwa ndị gbapụtara ihe.
Odinga kpalitere mmụọ ọtụtụ ndị mmadụ n'ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke mere ndị nkwado ya ji akpọ ya "Nna", "Ọrụ chukwu" na "Ngwa ọrụ".
Ọ bụ onye mkpọrọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma bụrụ nwafọ mba Kenya kachasị nọtee aka n'ụlọmkpọrọ. Agha o buru megide inwe naanị otu pati mere ka a tụọ ya mkpọrọ ugboro abụọ (site na 1982 ruo 1988 nakwa 1989 ruo 1991) mgbe Daniel arap Moi na-achị.
A tụburu ya mkpọrọ mgbe ọ chọrọ ịchutu ọchịchị n'afọ 1882, nke mere ka ọ gbapụta ihe na mba ha.
Nna ya bụ Jaramogi Odinga, bụ Osote onyeisiala mbụ nke mba Kenya mgbe Jomo Kenyatta bụ nna Uhuru Kenyatta nọ n'ọchịchị.










