Etu ọrịa otoro si gbuo ọtụtụ mmadụ n'Afikpo

Ọrịa otoro egbuola ihe ruru mmadụ iri na abụọ n'obodo Amata Akpogha dị n'okpuru ọchịchị Afikpo North n'Ebonyi steeti.

Dịka ndị obodo ahụ sị na ya bụ ọrịa malitere na ngwụcha ọnwa Disemba 2022 oge a chọpụtara na ọtụtụ mmadụ malitere ịgbọ agbọ na ịnyụ anyụ.

Tupu ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba 2022, ya bụ ọria egbuola ihe ruru mmadụ asatọ, dịka Donatus Uche bụ onyeisi ndị ntorobịa na mpaghara ahụ si gwa ndị ntaakụkọ.

Mana n'oge ahụ, onyeisioche Afikpo North bụ Uche Ibiam kwuru na ndị ọrụ ahụike agbatala ọsọ enyemaka, ma mekwaa nnyocha wee chọpụta na ọ bụ ọrịa a na-akpọ 'Gastroenteritis' na-akpata ọnwụ ndị ahụ, "Ọ bụghị 'cholera' dịka ndị mmadị si ekwubu".

Ibiam kwuru na oge ndị mmadụ chọpụtara ọnọdụ ọgbụgbọ na ọnyụnyụ ahụ, kama ha ga-aga ụlọọgwụ iji nweta ezigbo ọgwụgwụ, ha gara zụrụ ọgwụ na nke ndị na-ere ọgwụ a na-akpọ 'chemist', mana ọgwụ ndị ahụ arụghị ihe ọbụla,

"Ihe na-eme ebe a bụ nnukwu ọnọdụ gbatagbata mana anyị akpọtala ndị ọrụ ahụike ma butekwa ọgwụ e ji agwọ ya bụ ọrịa," Ibiam kwuru.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ọrịa a bụ Gastroenteritis na-emetụtakarị ụmụ ntakịrị na ndị okenye. Ọ na-ebute oke afọ ọsịsa nke na-eme ka mmadụ na-agbọ agbọ ma na-anyụkwa anyụ n'otu oge ahụ.

Mana ndị ahụike na-ekwu na gastroenteritis abụghị ọrịa n'onwe ya kama ọ bụ ọnọdụ nke ọrịa dịka cholera, diarrhea, na 'food poisoning' nwere ike ịkpata.

Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ na-agbali

Ka ọ dị taa bụ ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị 2023, ndị ya bụ ọrịa cholera gburula na mpaghara Amata Akpoha n'Afikpo North eruola 12.

Dịka Donatus Uche, bụ onyeisi ndị ntorobịa na mpaghara si gwa onyentaakụkọ anyị, ọrịa ahụ egbuola mmadụ anọ, kamgbe Disemba 31 ruo taa, agbakọnye ọnụọgụgụ a na mmadụ asatọ nwụrụ tupu Disemba 31, ọ pụtara na mmadụ iri na abụọ alaala mmụọ ugbua.

Mana gọọmentị Ebonyi steeti ekwupụtabeghị kpọmkwem ọnụọgụgụ ndị ọrịa a gburula.

Gọvanọ Umahi agaala ebe ọdachi a dapụtara

N'ụbọchị Tuzde, Jenụwarị 3, Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi gara njem nleta n'obodo Amata Akpoha ka o jiri anya ya hụrụ ihe na-eme ebe ahụ.

Umahi gara n'ụlọọgwụ ebe ụfọdụ ndị ọrịa metụtara na-anata ọgwụgwọ ma nye ha onyinye enyemaka nke gụnyere akpa osikapa, akwa, ego nakwa ihe ndị ọzọ.

Na njem ahụ, Kọmishọna ahịke Ebonyi steeti bụ Daniel Umezurike kwuru na ihe karịrị mmadụ otu narị anatala ọgwụgwọ maka ya bụ ọrịa cholera ma si n'ụlọọgwụ laa.

Umahi kwere nkwa na ya ga-agbapu mmiri 'borehole' iri n'ebe dị icheiche na mpaghara Akpoha iji mee ka ndị mmadụ nwee ezi mmiri ọṅụṅụ.

"Kọmishọna okwu mmiri dị n'aka nakwa Kọmishọna ahụike na ndị ndu obodo niile nọ ebe a ga-egosi anyị ebe anyị ga-egwu 'borehole' iri ahụ ma rụkwaa ụlọ mposi, nke a ga-amalite opekata mpe ụbọchị isii nke Jenụwarị," Umahi kwuru.

Ihe na-akpata cholera

Dịka ndị ọkachamara n'okwu ahụike si kwuo, cholera bụ ụdị nje bacteria nke nwere ịbanye n'ihe oriri maọbụ na mmiri mmadụ ma si etu ahụ banye onye ahụ n'ahụ.

Ihe ndị nwereike ịkpatara mmadụ ọrịa Cholera gụnyere:

  • Ịṅụ mmiri si n'ụmị maọbụ n'osimiri nke nje banyerela n'ime ya
  • Iri azụ maọbụ anụ mmiri ndị ọzọ nke si na mmiri nwere nje
  • Ịta mkpụrụ osisi maọbụ akwụkwọ nri nke nje a banyere n'ime ya
  • Akwọghị aka ma mmadụ gachaa mposi tupu o sibe nri maọbụ ribe nri
  • Ibi n'ebe ruru unyi