Ihe mere anyị ji alọta maka ntuliaka nke afọ a - Ụmụ Naịjirịa bi mba ofesi

Ọdọ ụgbọelu Abuja

Ebe foto si, Getty Images

Ọ fọla naanị ụbọchị ise tupu ụbọchị ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa eruo, ya bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023.

N'ihi nke a, ụfọdụ ụmụ Naịjirịa bi mba ofesi amalitela ịlọbata Naịjirịa iji sonye na ntuliaka a, n'ihi na iwu Naịjirịa akwadoghi ụmụ Naịjirịa bi mba ofesi ịnọ ebe ahụ tụọ vootu.

N'izu gara aga, BBC Igbo natara ozi n'aka ụfọdụ ndị ntorobịa ebe ha kọwara ihe mere ntuliaka afọ a jiri dị ha ezigbo mkpa mana n'ajụjụ ọnụ ọhụrụ BBC Igbo na ụfọdụ mmadụ olemole bụ ndị maliterela ime njem a - ịlọghachi Naịjirịa maka ịtụ vootu - ihe kpatara ha ji achụ aja dị otu a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ana m emefu N2m iji mee nje m a - Okonkwo Ugochukwu

Okonkwo Ugochukwu, nwaafọ Naịjirịa nọ na ngalaba Tekịnụzụ na mba Portugal, kwuru na ihe mere ya ji alọta ịtụ vootu bụ maka na "achọrọ m itinye aka na mmụpụta Naịjirịa ọhụrụ".

"Ibi na mba ofesi ga-eme ka ị hụ ihe niile kọrọ Naịjirịa n'agbanyeghị na anyị nwere ọtụtụ akụ ọnatarachi nakwa ụbara mmadụ. Agaala m ọtụtụ mba dị icheiche ndị na-enweghị ihe ndị a Naịjirịa nwere, mana ha nwere usoro ihe si aga nke na-eme ka ndụ dị mfe, ndị mmadụ a na-enwe aṅụrị."

Ndị soshal midia

Ebe foto si, Screengrab

"Ihe ndị a abụghị ihe nyịrị omume. Inweta ezigbo obodo bụ mkpebi mmadụ niile kwesịrị ime. Anyị niile kwesịrị itinye aka wugharịa Naịjirịa."

Ugochukwu kwuru na ọ ga-efu ya ihe karịrị nde naịra abụọ iji mee njem ịlọta Naịjirịa ma laghachi, "mana ọ bụ aja kweịrị ka a chụọ".

Twitter

Ebe foto si, Screengrab

Ihe mere ọtụtụ ndị Naịjirịa jiri biri na mba ofesi

Kemgbe ọnwa ole na ole ugbua, ihe na-ewu n'ọnụ ụfọdụ ndị Naịjiria bụ etu ha ga-esi si Naịjiria gbaga mba ofesi.

Mba ndị kacha ewu ewu nke ọtụtụ n'ime ha na-achọ ụzọ ha ga-esi gbaga gụnyere UK, Amerịka, Canada, Australia, New Zealand nakwa ụfọdụ mpaghara Yurop ndị ọzọ.

Ọtụtụ n'ime ndị na-agbapụ na-achọ ụzọ ha ga-esi "gaa gụọ akwụkwọ" na mba ofesi, dịka ha hụrụ na nke a abụrụla otu ụzọ dịtu mfe mmadụ ga-esinwu gafee mba ofesi.

Ihe ndị ọzọ gụnyekwara: ọnọdụ nchekwa Naịjirịa, nlekọta Ahụike, ndakpọ agụmakwụkwọ, ọnọdụ ọchịchị nakwa ndakpọ akụnaụba.