First-time voters: 'Ihe mere ntuliaka 2023 a ji dị mkpa'

Aha onyonyo, First-time voters:'Ihe mere ntuliaka 2023 a ji dị mkpa'
First-time voters: 'Ihe mere ntuliaka 2023 a ji dị mkpa'

Dịka ọtụtụ ihe na-eme na Naịjirịa na-emetụta ndị bi na mba a ugbua, ọtụtụ ndị na-apụta ịtụ vootu mbụ ha na ntuliaka Naịjirịa nke 2023 gwara BBC ihe ha na-atụ anya ya nakwa etu obi dị maka ya bụ ihe.

Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ntorobịa ndị kọwara na ihe so mee ha apụtaghi n’oge ntuliaka ndị gara aga bụ enweghi ntụkwasị obi n’usoro ntuliaka nakwa enweghi nakwa olileanya na vootu ha turu ga-enwe isi na ịmetụta mpụtara ntuliaka.

'Ihe mere ntuliaka 2023 a ji dị mkpa

Otu nwaamai kwuru na ọ nwere ntụkwasị obi na ntuliaka a dịka o kwuru:

“Obi siri m ike”

Ụfọdụ kwukwara na ọ bụ nsogbu enweghiike nwata akwụkwọ ikike ịtụ vootu bụ Permanent Voters Card (PVC) gbochiri ha ịtụ ya vootu.

Otu nwaada gwara BBC Igbo okwu kwuru “N’oge mbụ, anaghị m apụta ime ntuliaka mana dịka ọnọdụ ihe dị aṅaa ugbua, ekepbiela m isonye tụọ vootu ka m nwee ike inwe ọnụ onwu m ọha na-akpa nkata banyere ọchịchị.”

N'ụbọchị 25 nke ọnwa Febuwarị a ka ndị Naijirịa ga-eme ntụliaka ha iji ahọpụta onye ga-abụ onyeisiala mba ha. Ọha ndị mmadụ na-eche ịma etu ya bụ ihe ga-esi gaa.

Kirie ihe onyonyo nọ n’elu akụkọ ka ị gere ihe ha kwuru n’uju.