Dangote Refinery: Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ụlọ nrụpụta ọhụrụ a

Mmepe ụlọọrụ nrụpụta mmanụ agbidi Aliko Dangote na Legọs

Ebe foto si, NigerianPresidency/Twitter

Nkọwa foto, Mmepe ụlọọrụ nrụpụta mmanụ agbidi Aliko Dangote na Legọs

Ụlọnrụpụta mmanụ agbịdị ọhụrụ kachasị n'Afrịka emepela na Naịjirịa, dịka a na-atụ anya ga-ebelata nsogbu ụkọ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa na-agamiga.

Naịjirịa bụ mba mmanụ agbidi jupụtara n'ime ya mana a na-ebupu ya gawa mba ofesi ka e sie ya n'ọkụ iji mepụta mmanụ ụgbọala, kerozin, gaasị na ndị ọzọ tupu e bubatakwa ya na Naịjirịa.

Onyeisiala Naịjirịa Muhammadụ Buhari

Ebe foto si, Nigerian Presidency/Twitter

Ya kpatara mba Naịjirịa na-ahụkarị ụkọ mmanụ ụgbọala kwa mgbe kwa mgbe. Nsogbu a ka ụlọnrụpụta Aliko Dangote karịrị ijeri dọla iri na itoolu; $19 (maọbụ £15.2bn), nke onye nwe ya bụ oji ego Aliko Dangote.

"Ihe a bụ ihe ga-agbanwe ọnọdụ ndị mba Naịjirịa," dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru.

Ụlọọrụ nrụpụta Maazị Dangote dị na Lagos eweela ihe ruru afọ asaa iwu.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụlọọrụ nrụpụta Maazị Dangote dị na Lagos eweela ihe ruru afọ asaa iwu. A na-asị na ọ ga-abụ ụlọnrụpụta karịrị na mba ụwa niile. Ya bụ na ụlọ nrụpụta a nwere ike ịrụpụta imirikiti ngwa ahịa gbadoro ụkwụ na ngwa ahịa mmanụ agbidi kama i na-enwe ụlọnrụpụta dị icheiche maka ngwaahịa dị iche iche.

A na-atụ anya na ụlọ nrụpụta a ga na-ebipụta ihe karịrị udu mmanụ ụgbọala 650,000 kwa ụbọchị - ihe a tụrụanya ga-ezu mmanụ ndị mba Naịjirịa na-esi mba ọzọ azụ. Ọ ga-enwekwa ụlọnrụpụta ọkụ latrịk, ọdọụgbọmmiri nakwa ụlọ nrụpụta fatịlaịza.

Cheta na ụlọ mmanụ agbidi Naịjirịa anaghị arụ ọrụ ka mgbe afọ atọ gara aga maka etu e si ezu ya bụ mmanụ agbidi.

 "Ebumnuche anyị maka ụlọọrụ nrụpụta a bụ ka anyị hụ na anyị rụpụtachara ngwaahịa ndị mmadụ na-azụkarị n'afọ mbụ."

Ebe foto si, Nigerian Presidency Twitter

Nkọwa foto, "Ebumnuche anyị maka ụlọọrụ nrụpụta a bụ ka anyị hụ na anyị rụpụtachara ngwaahịa ndị mmadụ na-azụkarị n'afọ mbụ."

N'ụbọchị Mọnde e mere mmemme e ji mepe ya bụ ụlọọrụ nrụpụta mmanụ agbidi, Dangote onye ya kwuru na "Ebumnuche anyị maka ụlọọrụ nrụpụta a bụ ka anyị hụ na anyị rụpụtachara ngwaahịa ndị mmadụ na-azụkarị n'afọ mbụ."

Mana, o dochabeghị anya ma ya bụ ọlọọrụ nrụpụta ọ ga-enyeaka wetuo ọnụ ego mmanụ agbidi na Naịjirịa. Gọọment Naịjirịa sị na ha na-akwado iwepụ ego enyemaka a kpọrọ subsidi - ya bụ ego enyemaka riri nkeji anọ n'ime bọjeeti Naịjirịa.

Ya bụ ụlọọrụ nrụpụta so n'ihe ndị ịkpeazụ Onyeisiala Buhari ga-emeghe ka o ruru ngwụcha ọkwa oche ya.

Onyeisiala Buhari na-akwado inyefe Bola Tinubu ọchịchị onye mmeri ya dịka onyeisiala Naịjirịa ka dị n'ụlọikpe.

Ọkachamara n'ihe gbasara mmanụ agbịdị bụ Henry Adigun gwara BBC na mmepe ya bụ ụlọ nrụpụta ọhụrụ a gbadokarịrị aka na ndọrọndọrọ ọchịchị".

Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ụlọ nrụpụta Dangote dị na Legọs karịrị oke ala 2635 hectare

Ebe foto si, Nigerian Presidency

Nkọwa foto, Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ụlọ nrụpụta Dangote dị na Legọs karịrị oke ala 2635 hectare

Ihe ndị i kwesịrị ịma maka ụlọọrụ Dangote a dị na Legọs

  • Ndị ụlọọrụ Dangote Group sị na ụlọrọọrụ nrụpụta mmanụ agbidi a ga-arụpụta ihe karịrị udu mmanụ 650,000 kwa ụbọchị site n'ụlọnrụpụta ha nwere 900 KTPA Polypropylene plant.
  • O kwesịrị ịrụpụta 100% ngwa ahịa mmanụ agbidi ndị mba Naịjirịa na-azụ ma nweekwa nke ha ga-ebu ga mba ọzọ ga ree.
  • A na-atụanya na ọ ga-arụpụta ngwaahịa Afrịka ma nke Etiti ọwụwa anyanwụ mba ụwa ma ụdị mmanụ mba Amerịka.
  • O nwere tankị 177 nke 4.742 ijeri lita site n'ozi ndị ụlọọrụ Dangote
  • Ha ga-eji igwe dreja bọpụta ihe karịrị nde 65 na kubik mịta aja ruru ọnụ ego nde €300.
  • Okeala ebe a rụrụ ụlọọrụ a karịrị oke 2635 hectare.