Adulterated Fuel: Etu ị ga-esi mata mmanụ ụgbọala adịgboroja
Ọtụtụ ndị ọkwọ ụgbọala na Naijiria okachasị ndị nọ na Legọs steeti na-atamu ntamu gbasara mmanụ ụgbọala adịgboroja nke juru ebe niile ugbua.
Nke a na-eme dika ngalaba na-ahụ maka ire mmanụ ụgbọala na Naijiria bụ NNPC kwuru ka eweghachị mmanụ ụgbọala ebidoro ire na steeti ahụ na nso nso a n'ihi na ya bụ mmanụ ụgbọala adịghị mma.
Kama tupu ozi a erute ndị mmadụ ntị, ọtụtụ ndị na-akwọ ụgbọala azụtala mmanụ adigboroja ahụ ma tinye n'ime ụgbọala ha.
Nke a mere ka ọtụtụ ụgbọala mebie maka mmanụ ụgbọala adịgboroja a.
BBC Igbo gara n'ụlọahịa atọ ebe a na-ere mmanụ ụgbọala n'Asaba, Delta Steeti, wee chọpụta na ụdị mmanụ ụgbọala atọ ndị a na-acha ụcha dị iche iche.
Nke a mere anyị ji gakwuru Obi Ejima Okogba, onye bụ ọkaibe n'ihe gbasara mmanụ ụgbọala na etu e si emepụta ya ka ọ kọwaara anyị etu mmadụ ga-esi amata mmanụ ụgbọala adịgboroja na-agbanyeghi etu ọ sị acha.
Okogba kụziri ihe gbasara ụgbọala na nnukwu ụlọọakwụkwọ a kpọrọ Asaba Technical College, Asaba ma rụkwaa ọrụ na ngalaba mmezi ụgbọala nke ndị agha Biafra n'oge a lụrụ agha.
O kwuru na ọtụtụ ndị na-ere mmanụ ụgbọala na-agwakọ ya na mmanụ ndị ọzọ dịka Kerozin, maọbụ 'Hydraulic', nke na-eme ka ụgbọala na-enwe nsogbu.
Okogba kọwara na ezigbo mmanụ ụgbọala na-akọ ngwangwa ma mmadụ metụ ya aka.
"Ngwangwa ị metụrụ ezigbo mmanụ ụgbọala aka, fụọ aka gị ikuku, ọ ga-akọ na-egbughi oge, aka gị ga-achakwa ntụ ntụ."
"Ọ bụrụ na ọ dịghị otu a, mara na ọ bụghị nke ọma ya."

