Ụkọ mmanụ n'Anambara: Ndị na-ere mmanụ ụgbọala akwụsịla abụbọọrụ

Onye na-achọ mmanụ ụgbọala

Ebe foto si, Getty Images

Nke a na-eme dịka otu jịkọtara ndị na-azụ ma na-ere mmanu ụgbọala a kpọrọ 'Independent Petroluem Marketers Association of Nigeria(IPMAN) )' ngalaba nke Anambara steeti na gọọmentị steeti ahụ nwechara ọgbakọ ụbọchị Toọsde.

Kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka mmiri na ihe eji enyere ndụ aka bụ Obi Nwankwo gwara ndị ntaakụkọ na ha "ekpeziela dịka ha kwekọrịtara ihiwe kọmịtị ga-eleba anya n'okwu ego iti aka n'obi na ihigharị ọdọmmanụ abụọ bụ isi sekpụ ntị na abụb ọrụ ahụ."

Ndị otu IPMAN jụburu iresị ndị ọkwọ ụgbọala mmanụ nke mere e ji nwee ụkọ mmanụ na steeti ahụ abalị ole na ole gara aga.

Iwe ha bụ na gọọmentị akwụbeghị ndị otu ha a kuturu ụlọọrụ mmanụ ụgbọala ha ego iti aka n'obi dịka ha si kwe na nkwa.

Abụbọọrụ ha mere ọtụtụ ndị ji ịkwọ ụgbọala akpa ego ji busa ụgbọala ha, ma meekwa ndị mmadụ were ụkwụ na-aga ogologo njem ịga ọrụ maọbụ ahịa ka ha aghara ịnọrọ n'ụlọ.

Otu onye BBC Igbo gbara ajụjụọnụ na-achọghị ka a kpọpụta aha ya, kwuru na ya bụ nsogbu metụtara ya na ndị be ya maka na ha ahụghị mmanụ ụgboala ha ga-eji mụnye igwe na-enye ọkụ.

O kwuru na ha ga-aga n'Asaba gaa gbata mmanụ ụgbọala ha ga-eji mee ihe.

Akụkọ ga-amasị gị