Ohaji/Egbema Imo State: Obodo nwere ọtụtụ mmanụ agbidi mana okporoụzọ ha jọgburu onwe ya

Aha onyonyo, Okporoụzọ ọjọọ n'Ohaji/Egbema

Nkụ dị na mba na-eghere mba nri, mana ilu a apụtaghị ihe n'ebe ndị Ohaji/Egbema nọ.

Ohaji/Egbema bụ obodo dị n'Imo Steeti nke nwere ihe ọnatarachi ebe ọ dị ukwu.

Mmanụ agbịdị dị n'ala ha nke ọma; ha nwekwara ikuku gaasị n'ebe o buru ibu.

Ọtụtụ nnukwu ụlọọrụ a na-anụ aha ha nọkwa n'obodo ahụ n'ihi ihe akụ ọnatarachi ha nwere.

Mana okporoụzọ e si aga obodo ahụ jọgburu onwe ya.

Lee ihe BBC Igbo hụrụ oge anyị gara Ohaji/Egbema.