Fuel scarcity: Ihe ndị mmadụ na-eme dịka ụkọ mmanụ ụgbọala rutere Ọwụwa Anyanwụ
Ndị bi n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjiria akọwaala etu ụkọ mmanụ ụgbọala si emetụta obibi ndụ ha kemgbe ọ malitere.
Ha gwara BBC na ebe ụkọ mmanụ ụgbọala a si ka njọ bụ na e nweghi kpọmkwem ego ole bụ ihe a na-ere ya.
Ụfọdụ n'ime ha kwuru na ego ahụ na-arị elu na-arịda ụfọdụ oge, ebe ndị ọzọ kwuru na ọ na-ara ahụ ịhụ ebe ha ga-agbata ya bụ mmanụ ụgbọala.
Ụfọdụ kwuru na ebe o si ka njọ bụ na ha anaghị enwe ọkụ latrik, nke bụ na ị na-achọghịgodu ịpụ n'ụlọ maka ụkọ mmanụ, ị ga-achọrịrị nke ị ga-eji mụọ ọkụ n'ụlọ.
Ndị bi n'Owerri, isiobodo Imo steeti nakwa Abakaliki nke Ebonyi steeti kwuru na ụkọ mmanụ a emeela ka ego njem ụgbọala tinye ego.
Ndị bi n'Enugwu kwuru na ha na-atụ ụjọ ka ha ghara ịzụta ma gbanye mmanụ adịgboroja n'ụgbọala ha, dịka ha kwukwara na ha na-ata ahụhụ ịzụta mmanụ ụgbọala ugbua.
Mara na ụkọ mmanụ ụgbọala a malitere na Legọs na Abuja n'ụbọchị asaa nke ọnwa Febrụwarị 2022, dịka gọọmentị etiti kwuputere na mmanụ adịgboroja e bubatara Naịjiria efesaala, ma mechaa kwuo na ha na-agba mbọ iweghachịte ya n'aka ọdọmmanụ ụgbọala ndị ọ banyere n'aka.
Ya bụ ụkọ mmanụ eruteghi mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ruo na ngwụcha Febrụwarị/mbido Maachị.
Gee ihe ndị mmadụ gwara BBC n'uju: