Sign Language: Ihe ndị ị na-amaghị maka asụsụ ndị na-anaghị anụ ntị maọbụ ekwu okwu
Otu United Nations bụ otu jịkọrọ ọtụtụ mba ụwa ọnụ hibere ụbọchị 23 nke afọ ọbụla ka ọ bụrụ ụbọchị a na-eme ncheta asụsụ ndị na-anaghị anụ ntị maọbụ ekwu okwu, nke a bụ ihe Bekee na-akpọ ‘Sign Language’
Kedụ ka iche ndị na-anaghị anụ ntị maọbụ ekwu okwu si enwe mkparịtaụka?
Ị ma maka asụsụ Sign Language a?
Ka anyị tụpenyere gị azụ banyere asụsụ a.
Mba dị iche iche nwere ụdịrị asụsụ ndị na-anaghị anụ ntị maọbụ ekwu okwu ji enwe mkparịtaụka.

E nwere ụdịrị asụsụ a ruru ihe karịrị narị atọ n’akụkụ ụwa dị icheiche mana nke kacha ewu ewu bụ nke mba Amerịka a na-akpọ ‘American Sign Language’.
Nwaada Treasures Uchegbu bụ ọkaibe n’asụsụ a kọwara BBC Igbo na ya bụ asụsụ nwere ọtụtụ usoro okwu, nke bụ na mmadụ nwere ọtụtụ ọzọ ọ nwereike iji kwuo otu ihe.
O kwukwara ụdịrị asụsụ nke ọzọ na-ewukwa ewu bụ asụsụ nke ụdịrị mba Briten bụ ‘British Sign Language’.
Asụsụ a na-enwekwa olu mba maọbụ olu ndị dịka asụsụ dị icheiche.

Uchegbu kwukwara na Naịjirịa amalitela usoro nhazị asụsụ a nke a na-akpọ ‘Nịgerian Sign Languge’.
Ụdịrị nke a nwere okwu ndị nke mba ofesi enweghị nke pụtara na okwu metụtara anyị dịka ndị Naịjirịa jụrụ n’ime ya.
Marakwa na ọ bụghị naanị imegharị aka bụ etu e si eji enwe mkparịtaụka n’asụsụ a, a na-ejikwa agwa ihu nakwa agwa ahụ na nkwukọrịta.
Ndị na-anaghị anụ ntị maọbụ ekwu okwu na-enwe aha n’asụsụ a nke bụ na ọ bụghị naanị site n’ịdepụta abidii nke asụsụ ka mmadụ ga-esi ekwu aha ya, a na-esikwa n’igosị agwa nyiri nke onye nwee ahụ nwere kpọọ aha mmadụ maọbụ gụọ mmadụ aha n’asụsụ a.
Kirie ihe onyonye a ka ị nụrụ ihe nwaada Treasures Uchegbu kọwara n’uju.
Makuochi Okafor na Vining Ogu mere akụkọ a.



