Donald Trump ahọpụtala Elon Musk dịka onyeisi ụlọọrụ Gọọmentị o hiwere ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images
Donald Trump bụ onye a họpụtara dịka Onyeisiala mba Amerịka ehiwela ụlọọrụ ọhụrụ n’ọchịchị ya a kpọrọ ‘Department of Government Efficiency (Doge)’ ma were Onye kachasị enwe ego n’ụwa bụ Elon Musk mee onyeisi ụlọọrụ ahụ.
Onye ga-eso Musk rụọ ọrụ n’ụlọọrụ ahụ bụ onye jibu aha pati Repọblikan zọọ ọkwa onyeisiala bụ Vivek Ramaswamy.
Mgbe ọ na-akpọpụta aha mmadụ abụọ a dịka ndị ndu ụlọọrụ ọhụrụ a, Trump kwuru na ọrụ ngalaba a gụnyere;
- Ikposa atụmatụ ọchịchị gọọmentị na-ele anya n’ihu tupu e nye mmadụ ọrụ.
- Ibelata oke mmefu ego na akụrụngwa gọọmentị.
- Inwogharị ụlọọrụ gọomentị etiti dị iche iche.

Ebe foto si, Getty Images
Trump kwuru na ụlọọrụ ọhụrụ a ga-eme ka atụmatụ ịzọpụta Amerịka a kpọrọ ‘Save America Movement’ ga-abịa na mmezu.
‘Doge’ bụ aha ịchafụ ụlọọrụ ọhụrụ a bụ nke e si n’akụrụngwa ego crypto a kpọrọ Dogecoin wepụta, nke Musk bụ ezigbote onye nkwado ya ma kpọọ ya “crypto ndị mmadụ nwe”.

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ndị na-ekwu na ọkwa a Trump nyere Elon Musk bụ iji kelee ya maka nkwado o nyere n’oge ọ na-azọ ọkwa onyeisiala.
Akụkọ kwuru na Musk nyere ego ruru nde narị dọla abụọ ($200m) iji kwadoo achụmnta vootu ma bụrụkwa otu n’ime ndị otu mkpu ya.
N’aka nke ọzọ Ramaswamy zọsịrị Trump ọkwa na ntuliaka imeụlọ pati Repọblikan mana o mechara bụrụ otu n’ime ndị kachasị kwadoo Trump oge e merichara ya na ntuliaka imeụlọ ahụ.
Ụlọorụ a gaghị abụ ụlọọrụ Gọọmentị kpọmkwem kama ọ ga-anọ n’ezi na-enye ọchịchị gọọmentị ndụmọdụ nakwa ntuziaka ọkachasị n’ihe banyere azụmaahịa.
Elon Musk na nnabata ọkwa ọhụrụ depụtara ozi n’akara soshal midia X ma kwuo “Ndị mmadụ amaghị etu nke a ga-esi agbanwe ọtụtụ ihe.”
N’otu aka ahụ Ramaswamy depụtakwara ma kwuo, “Anyị agaghị eji ya nwaanyọọ.”
Ndị ọzọ Trump nwereike inye ọkwa n’ọchịchị ya?

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu ọrụ Donald Trump amalitela ime nnyocha ndị ga-esonye n’ọchịchị oge a ga-edu ya n’iyi ọrụ dịka Onyeisiala mba Amerịka n’ọnwa Jenụwarị, 2025.
Cheta na ụbọchị Tọzde 7 Nọvemba, Donald Trump họpụtara Susie Summerall Wiles dịka onye ga-abụ onyeis ndị ọrụ ya.
A na-atụ anya na ọtụtụ ndị rụrụ ọrụ n’ọchịchị ya oge ọ chịburu nwereike ịlaghachita ebe ụfọdụ agaghị alaghachita.
Lee ndị a na-atụanya nwereike inweta ọkwa n’ọchịchị Donald Trump
Elon Musk

Ebe foto si, Getty Images
Na mmalite afọ a, nwoke kacha nwee ego n’ụwa niile bụ Elon Musk kwuputara nkwado ya nye Donald Trump na ntuliaka afọ 2024 n’agbanyeghị na o kwuru n’afọ 2022 na oge eruola mgbe Trump ga-awọsa ọwa n’ihe gbasara ọchịchị.
Kemgbe ahụ, Musk nyere Trump nnukwu ego nke mere ka a họta ya dị onye nkwado Trump kachasị.
Ego o nyere iji kwado achụmnta vootu Trump ruru nde narị dọla na itoolu ($119 million)
Akụkọ na-ekwu na Trump nwereike ịhọpụta Musk dịka onyeisi ngalaba gọọmenti ọhụrụ ga-ahụ maka nhazi iji belata ego gọọmenti na-emefu.
Mike Pompeo

Ebe foto si, Getty Images
Onye bụbu onyeomeiwu si Kansas bụbu onyeisi ụlọọrụ CIA. Ọ rụrụ dịka odeakwụkwọ n’ọchịchị Trump n’afọ 2016.
Ọ bụ onye na-akwado ihe ọbụla gbasara Trump. Akụkọ na-ekwu na o nwereike ịbụ onye odeakwụkwọ ọrụ nchekwa.
Mana ụfọdụ na-ekwu n’ọkwa ahụ bụ Michael Waltz ka e nwereike inye ya. Michael Waltz bụ onyeomeiwu maara ihe ekwe na-akụ banyere ọchịchị maka ọ rụrụ na kọmiti ụlọomeiwu na-ahụ maka nchekwa.
Robert F. Kennedy Jr

Ebe foto si, Getty Images
Afọ abụọ gara aga bụ ezigbo afọ nye onye a bụ nwanne onye bụburu Onyeisiala mba Amerịka bụ John F. Kennedy.
Nwaamadị a bụ onye okaiwu zọrọ ọkwa Onyeisiala na pati Demokrats mana ndị ezinaụlọ ya katọrọ atụmatụ ya banyere ịmachi ọgwụ mgbochi. Nke a mere ka ha ghara ịkwado ya.
Ọ gara n’ihu zọọ ọkwa Onyeisiala dịka onye na-akwado onwe ya mana o nwetaghị ọtụtụ ndị nkwado.
O mechara wezuga onwe ịzọ ọkwa ma malite ịkwado Donald Trump.
Trump ekwuola na Kennedy ga-arụ ọrụ dị mkpa n’ọchịchị ya ebe ọ gbasara ahụike dịka ụlọọrụ National Centers for Disease Control and the Food and Drug Administration.
Tom Homan

Ebe foto si, Getty Images
Oge Trump bụbu Onyeisiala mba Amerịka, Tom Homan rụrụ ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ndị ọbịa (Immigration Service). Ọ gbara mbọ ịnapụ ndị si ụzọ iwu megidere bata mba Amerịka ụmụaka iji gbochi ndị na-abata mba Amerịka n'ụzọ na-aadịghị mma.
O mechara gbaa arụkwaghịm n'afọ 2018. Mana ugbua ọ bụ onye a na-ahụta dịka onye nkwado Trump kara aka n'ihe gbasara ndị ọbịa ma bụrụ onye a na-ekwu na o nwereike ịbụ onyeisi ụlọọrụ Department of Homeland Security.
Caroline Leavitt

Ebe foto si, Reuters
Caroline Leavitt bụ odeakwụkwọ otu achụmnta vootu Donald Trump na ntuliaka a. Ọ bụbu osote onyeisi na-ahụ maka mgbasaozi oge Trump bụbu Onyeisiala.
Oge ọ dị afọ iri abụọ na asaa (27), ọ zọrọ ọkwa ịbụ onyeomeiwu n'afọ 2022 dịka onye ga-anọchiteanya steeti ya bụ New Hamsphire, mana o nwetaghị mmerị.
A na-atụanya na ọ ga-abụ onyeisi mgbasaozi n'ọchịchị Trump.








