Kedụ ụbọchị a mụrụ Jesus kpọmkwem dịka akwụkwọ oziọma si dee?

Ọmụmụ Jesus

Ebe foto si, Getty Images

Ịmata kpọmkwem ụbọchị a mụrụ Jesus bụ ihe na-ekweghị omume, mana ndị ọkachamara n’akụkọ mere mgbe gboo kwekọrịtara na ọ bụ n’ebe BC nke anọ ka a mụrụ ya.

Ha na-ekwu na o nwereike ịbụ n’ụbọchị 13 nke ọnwa Eprel, maọbụ ụbọchị 14 nke Ọktoba, maọbụ Julaị3...

Ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na ‘monk’ e nyere ọrụ ịgbakọ ụbọchị a mụrụ Jesus gbakọtara ya, anyị gaara ịnọ n’afọ 2026 ugbua.

Naanị ihe akaebe e nwereike ịgbado ụkwụ iji gbakọọ mgbe a mụrụ Jesus kpọmkwem bụ akwụkwọ oziọma dị icheiche, bụ nke e dere ka ọtụtụ afọ gacharala Jesus ji nwụọ.

Ọtụtụ ndị dekwaranụ oziọma ahụghị Jesus anya mgbe ọ dị ndụ, ụfọdụ n’ime ha bụkwa ndị dere akwụkwọ ndị a n’ihi nkwenye ha na Jesus bụ ‘messiah’.

Mana ndị nnyocha akụkọ mgbe gboo kwekọrịtara na mmadụ dịka Jesus dị, o biri ndụ ya n’ụwa n’otu oge n’ụwa

Oziọma Mathew na Luke

ndị dere oziọma

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E dere oziọma gbasara Christ ọtụtụ afọ dịka ọ nwụchara

Javier Alonso bụ ọkachamara n’akụkọ mgbe gboo gwara BBC Mundo na ebe mgbakwasị ụkwụ maka ndụ Jesus bụ oziọma nke Mathew na Luke bụ nke e dere ihe dịka afọ 80 maọbụ 90 dịka Jesus nwụchara (80 – 90 AD).

Oziọma Mark nakwa akwụkwọ ozi asaa nkd Paul nke Tarsus dere bụ ha bụ akwụkwọ kacha ochie n’ime agba ọhụrụ nke akwụkwọ nsọ Bible, mana ha ekwughị ihe ọbụla maka ndụ Jesus dịka nwata.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Alonso kwuru na nsogbu e nwere n’ịgbakọ oge ọmụmụ Jesus, bụ na a sị ka e soro akwụkwọ oziọma niile, ha ncha adabaghị n’oge ha kwuru na a mụrụ ya.

“Mark kwuru na a mụrụ Jesus n’oge ọchịchị Herod, nwa mgbe nta tupu Herod anwụọ. Anyị ma, site n’oziọma Mathew, na Herod nwụrụ na BC nke anọ. Nke a pụtara na oge a mụrụ Jesus nwere ịbụ na BC nke anọ, ise, isii, maọbụ asaa,” Alonso kwuru.

“Mana Luke akpọghị Herod aha n’akụkọ ọmụmụ Jesus, kama o kwuru na ọ bụ oge ngụkọ ọnụ Quirinus. Dịka akụkọ nke a si dị, Mary na Joseph, nne na nna Jesus, mere njem si Galilee ruo Bethlehem iji debanye aha na ngụkọ ọnụ ahụ.”

Ọkammụta ọzọ, Antonio Piñero, bụ onye nkuzi Greek Philology na Mahadum Madrid, kwuru nchọpụta gosiri na ọ dịka agbakwụnyere ngalaba Mathew 1 na 2, nakwa Luke 1 na 2 oge amaliterela ikesa ya bụ akwụkwọ.

“Maka na itulee ya nke ọma, ị ga-ahụ na ụfọdụ ndị nọ na Mathew 3 nakwa Luke 3 amaghị ihe mere na ngalaba Mathew 1,2 na Luke 1,2, Antonio Piñero kwuru.

“Nke a pụtara na o nwereike ịbụ na tupu e dee akụkọ gbasara ọmụmụ Jesus nakwa ndụ ya dịka nwata, ọ gafeelarị afọ 60 kamgbe ọ nwụrụ.

N’oge ahụ, Piñero kwuru, ndị okpukperechi Kraịst akarịala mmadụ puku atọ gbasara n’ụwa niile.

Oziọma Mathew kacha daba

Ngosipụta Christmas

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ọkachamara n'akụkọ mgbe gboo kwuru na ihe Luke dere na Joseph na Mary gara Bethlehem idenye aha na ngụkọ 'census' oge a mụrụ Jesus, adabaghị.

Ndị ọkachamara n'akụkọ mgbe gboo na-ekwu na n'ime ozịọma Mathew na nke Luke, a sị ka a gbakọọ oge nakwa etu ihe si mee, a ga-asị na ọ bụ oziọma Mathew kacha nweta ihe mere n'oge ahụ.

Iji chọpụta nke a, ndị na-ede akụkọ mere mgbe gboo tulere maka otu onye pụtara ihe n’akụkọ Jesus: Pontius Pilate.

“E kwenyere na Jesus nwụrụ n’oge ọchịchị Pontius Pilate, nke bụ malite na AD.C. 26 ruo 36; nakwa na Jesus malitere ịgbasa oziọma n’afọ iri na ise nke Emperor Tiberius,” Alonso kọwara.

“Ọ bụrụ na anyị gbado anya n’oziọma Mathew, ọ bụrụkwa na a mụrụ Jesus na 4 BC, o kwere nghọta. Ọ nwụrụ n’afọ 30 BC nke pụtara na ọ dị ihe dịka afọ 34.”

“I soro ụbọchị ndị a, oziọma Mathew kacha daba, a mụrụ Jesus na 4 BC, n’ebe ngwụcha ọchịchị Herod ‘The Great’.”

“N’aka nke ọzọ, akụkọ ngụkọ ọnụ Quirinus, adabachaghị. A na-eche na Luke tinyere ya dịka ọ chọrọ igosipụta ihe ndị mmadụ ji si Nazareth gaa Bethlehem, ebe e buru amụma na a ga-amụ ‘messiah’. Onweghị ihe ọzọ,” Javier Alonso kpebiri.

Antonio Piñero kwenyere na nke a nwereike ịbụ eziokwu, maka na onye ọbụla kwenyere n’amụma nke onye amụma Micah buru (Micah 5:1) na Bethlehem, obodo a mụrụ David, ga-abụ ebe a ga-amụ onye nzọpụta.

Gịnị mere na ndị 'Christian' mbụ etinyeghị uche maka oge ọmụmụ Jesus?

Ngosipụta ọmụmụ Jesus

Ebe foto si, Getty Images

Dịka Antonio Piñero si kọwaa: “Ndị mbụ kwenyere na Christ kwenyere na alaeze Chineke na-abịa nke taa nke echi. Ọ bụghị ihe ga-eme n’ọdịnihu, n’ọgwụgwụ oge maọbụ n’oge ikpe ikpeazụ. Ọ bụ nke a mere na ha etinyechaghị uchu n’ọtụtụ ihe gbasara ụbọchị ọ nwụrụ kpọmkwem maọbụkwanụ ebe e liri ya kpọmkwem, ma ya fọdụkwa ụbọchị oge a mụrụ ya.”

“Ọmụmụ Jesus abụchaghị nnukwu ihe maka ndị mbụ kwenyere na Christ, maka na oziọma mbụ e zisara bụ na Jesus nwụrụ n’ihi mmehie mmadụ ma si n’ọnwụ bilie iji merie ike ọnwụ. Ihe ndị ọzọ bụzị ihe e ji chọọ okwu mma.”

“Mana dịka ọtụtụ mmadụ na-amatawanye banyere Jesus, ndị mmadụ mmadụ malitere ịchọ ihe banyere ndụ ya.”

“Ọ bụ ya kpatara na e si n’azụ malite ide akụkọ banyere Jesus. Akwụkwọ ndị mbụ e dere maka ya bụ maka ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya. Tupu ha amalite ide maka ndụ ya nakwa afọ atọ ọ zisara oziọma. Oziọma Mathew na Luke, ndị dere maka ọmụmụ ya, bụ akwụkwọ ndị kacha ọhụrụ e dere maka Jesus.”

Dionysus onye 'Monk'

Antonio Piñero kọwara na n’afọ 497, Pope Gelasius, nyere onye Monk aha ya bụ Dionysius ọrụ ka ọ gbakọọ ma chọpụta kpọmkwem ụbọchị bụ Easter dịkwa nkwanye ụka nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ (Eastern Churches) si dị.

O mechaa nke a, ọrụ ya ọzọ bụ ịchọpụtakwa ụbọchị a mụrụ Jesus kpọmkwem.

Dionysius bụ onye na-eji ihe e dere ede akọwa oge e dere ya, maọbụ ‘Chronograph’ na bekee.

"O nweghị akụrụngwa nke ndị ọkachamara oge ugbua nwere, ya mere ọ rụrụ ọrụ ahụ dịka Chukwu si kpugheere ya, ọ dara ya,” Javier Alonso kwuru.

Onye ‘monk’ ahụ kpebiri na a mụrụ Jesus ka afọ 753 gachara e ji hibe Rome, ma kwuo na 754 bụ afọ mbụ e hibere okpukperechi ‘Christian’.

N’oge ahụ, n’ụwa ndị Rome’ a na-agbakọ afọ site n’afọ ole ‘emperor’ chịrị (iji maa atụ, n’afọ nke ise nke Tiberius, maọbụ n’afọ nke anọ nke Nero); n’ebe ụfọdụkwa a na-eji afọ e hibere obodo ahụ, dịka ọ dị na Rome.

Ebee ka Disemba 25 si?

Mmeri anyanwụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Disemba 25 bụbu ụbọchị ndị Rome ji eme emume 'Mmeri Anyanwụ'

Aka Dionysius adịghị na nke a. Ọ bụ ihe ehiberela tupu Dionysius.

Piñero kọwara na ọ bụ ‘Emperor Theodosius nke mbụ hibere ‘Christianityi’ dịka okpukperechi nke ndị Rome n’afọ 380.

“Oge ndị otu Kraịst si na ndị a na-emegbu emegbu bụrụ ndị na-emegbu ndị ọzọ, ụfọdụ emume ndị ọgọ mmụọ banyere na ya.

“Na December 25 ka alaeze Rome ji eme emume “mmeri anyanwụ”, bụ ncheta ụbọchị Zeus bụ anyanwụ meriri ọchịchịrị. Nke a bụ ihe a na-akpọ ‘winter solstice’ nke bụ oge ehihie ji adị ogologo karịa

“Mana ndị otu Christ tinyeziri ya n’okpukperechi ha, ma kwuo na onye bụ ‘Anyanwụ nke nwe mmeri niile’ bụ Jesus.”

N'ọnwa Disemba, ndị Rome na-emekwa emume 'Saturnalia' nke ha ji echeta chi ha bụ 'Saturn', Alonso gbakwụnyere

N'oge emume a, ha naeji ihe dị icheiche achọ ụlọ ha mma, na-ekekọrịta onyinye, ma nwekwaa osisi ịchọ mma nke yitere ukwuosisi ekeresimesi dịka anyị si eme ugbua.

Nke a pụtara na ụbọchị emume ekeresimesi nakwa etu esi eme ya bụ ihe e bitere ebite, Alonso kwuru.