You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Naịjirịa akpọlatala ihe ruru mmadụ 1600 tọburu na Sudan
N'ụtụtụ ụbọchị Mọnde a, Naịjirịa kpọlatara ụmụafọ Naijịrịa tọburu na Sudan ebe ọgbaghara na-adasịike kemgbe ebe etiti ọnwa Eprel, 2023.
Ozi si n’aka ụlọọrụ na-ahụ maka ụmụafọ Naijirịa bụ na mba ndị ọzọ bụ Nigerians in Diaspora Commission (Nidcom) kwuru n’ụbọchị Mọnde, abalị asatọ nke ọnwa Mee, 2023 na akpọlatara mmadụ 129 ọzọ bụ ndị si ọdụ ugboelu nke Port Sudan International Airport tụọ ụkwụ n’ọdụ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe International Airport nke Abuja.
Nidcom gbara ama na ndị a so ụlọọrụ ugboelu Tarco Air lọta n’ebe elekere itoolu n’ọkara ma kwuo na nke a mere ya nchịkọta mmadụ 1600 akpọlatarala ugbua.
Ha kwukwara na enwebeghi nwaafọ Naịjirịa ọbụla ọgbaghara na-ada na Sudan tarala isi ya.
Nidcom kọwara na nke a so agba nke a sọ n'atụmatụ mkpọlata ụmụafo Naịjirịa.
Cheta onyeisi ụlọọrụ Nidcom bụ Abike Dabiri kwuru n’ọnwa Eprel na ụmụakwụkwọ ụmụafọ na-agụ akwụkwọ na Sudan tupu ọgbaghara a amalite ruru 5500 ebe ụmụafọ Naịjirịa nọ na mba ahụ ruru nde atọ.
Ihe ruru mmadụ 800 lọtara n'ụbọchị Sọnde
Ụfọdụ ụmụafọ Naịjriịa ọzọ bụ ndị tọburu na Sudan turu ụkwụ n’ọdụ ụgbọelu Abụja n'ụbọchị Sọnde, abalị asaa nke ọnwa Mee. 2023.
Nke a so agba nke anọ na amịta mkpụrụ n’atụmatụ mkpọlata ụmụafọ Naịjirịa tọrọ na Sudan ebe ọgbaghara na-adasiike nke gọọmentị Naịjirịa na-eme.
Mmadụ 102 n’ime ndị a so ụgbọelu Tarco Airlines si akụkụ Port Sudan lọta ebe mmadụ 322 so ụgbọelu Asman Air nke si akụkụ Aswan, mba Egypt. Ndị ọzọ so kwa ụgbọelu Azman.
Ndị nke si akụkụ ọdụ ụgbọelu Port Sudan International Airport lọta tụrụ n'ọdọ ụgbọelu Nnamdi Azikiwe dị n'Abuja n’elekere 12 na ọkara nke ehihe Sọnde a.
Nke a mere ya ihe karịrị nchịkọta mmadụ 800 bụ ndị si Sudan lọta n’ụbọchị Sọnde a.
Cheta na ngalaba gbatagbata Naịjirịa bụ National Emergency Management Agency (Nema) kwuburu na ọnụọgụgụ ndị a na-atụ anya ịlọbata na Naịjirịa n'ụbọchị Sọnde bụ 700.
N'ụbọchị Satọde, bụ ụbọchị isii nke ọnwa Eprel, ụmụ Naịjirịa ọnụọgụgụ ha dị 131 - ndị okenye 124 na ụmụ ntakịrị asaa - lọbatara n'ọdọ ụgbọelu Abuja n'ebe elekere mbụ na ọkara nke ehihie.
Ọ bụ ụgbọelu Tarco Aviation si obodo Port Sudan wee bulata ndị a. Ụgbọelu ọzọkwa si Port Sudan buru ụmụ Naịjirịa ọnụọgụgụ ha dị 102 amalitekwala njem ilọghachi, dịka ndị isi Nema si kwuo.
A na-atụ anya ndị nke a n'ebe elekere ise na ọkara nke mgbede taa bụ Sọnde.