Aka akparala Pastọ zoro ọtụtụ ụmụaka n'ime ụlọụka ya

Ebe foto si, Screengrab
Aka ndị uweojii akparala otu Pastọ e boro ebubo izo ọtụtụ ndị mmadụ n'ime ụlọụka ya, ọtụtụ n'ime ndị a bụ ụmụ ntakịrị.
Ndị uweojii Ondo steeti kwuru na ọ bụghị naanị ụmụ ntakịrị ka a chọpụtara e zoro n'ime ụlọụka ahụ.
Ọ bụ na mgbede abalị ụbọchị Fraịde, Eprel 1 ka ndị uweojii mere nchọpụta a, na mpaghara a kpọrọ Valentino na 'Ondo town'.
Funmilayo Odunlami bụ ọnụ na-ekruru ndị uweojii Ondo steeti kwuru na ha kpọpụtara mmadụ iri asaa na asaa (77) n'ime ụlọụka ahụ.
Onye kpọchiri ndị a n'ime ụlọụka?

Ebe foto si, Screengrab
Ndị uwoji kwuru na Pastọ a na-agwa ndị ụka ya na oge eruola mgbe ụwa ga-emebi.
Dịka Odunlami si kwuo, "ụkọchukwu ahụ na-akụziri ndị otu ya na ụwa a ga-abịa n'isi njedebe n'ọnwa Sepụtemba afọ 2022."
"Nke a mere ha ji kpọchide onwe ha ụzọ n'ime otu nnukwu ọnụụlọ dị n'okpuru ụlọụka ha iji na-akwado ma chere mmebi ụwa."
"Ọtụtụ n'ime ndị a hụrụ n'ime ụlọụka ahụ bụ ndị ji aka ha hapụ ụlọ ha kamgbe ọnwa ise gara aga."
Ndị uweojii kwuru na ha amalitela nnyocha miri emi gbasara nke a.
Cheta na ụdị ihe di otu a emebuola n'ọdị nso a n'Ekiti steeti ebe otu Pastọ aha ya bụ Noah Abraham na-ana ndị ụka ya ego dị narị puku naịra atọ (N300,000) iji duga ha eligwe.
Ndị uweojii nwuchiri nwa amadị ahụ n'ọnwa Mee afọ a.









