Lee ụzọ isii ga-akara gị mfe idopu ego gbara ọkpụrụkpụ n'afọ 2023

Naira

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
    • Ebeg o si, Lagos

Dịka afọ ọhụrụ na-amalite, ọtụtụ ndị mmadụ nwere olileanya dị icheiche maka ihe ha na-atụ anya inweta n'afọ 2023.

Mana ọ bụrụ na olileanya nke gị bụ idopu ego gbara ọkpụrụkpụ nke ị ga-eji mepụta ihe a hụrụ anya na ngwụcha afọ a, akụkọ a bụ maka gị.

E nwere ụzọ dị icheich mmadụ ga-esi mụbawanye ego ya n'ụzọ kwụ ọtọ, dịka ịgbakwunye n'ihe nwere ike iweta ego, itinye ego n'ụlọọrụ ndị welitere isi n'ụzọ bekee kpọrọ 'investment'; iwelite aka n'ego mmadụ na-edopu nke a na-akpọ 'savings' na bekee, dgz.

BBC Igbo kpọtụụrụ Oriakụ Uche Iheanacho, onye bụ ọkachamara n'okwu ego, iji kọwaa etu mmadụ ga-esi nwee atụmatụ ga-adịrị ya mfe iji dopu ego gbara ọkpụrụkpụ ma si etu a bulie ọnọdụ akụnụba ya na 2023.

1) Gwa onwe gị eziokwu maka ọnọdụ gị ugbua

Nwaada Iheanacho kwuru na tupu mmadụ enwee olileanya ego gbara ọkpụrụkpụ ọ ga-edopu n'afọ, onye ahụ ga-ebu ụzọ tulee ma gwa onwe ya eziokwu maka ọnọdụ akụnụba ya ugbua.

"Ị ga-ajụ onwe gị, gịnị ka ị na-eme ugbua ego si abata m aka? Enwere ndị ị ji ụgwọ? Enwere ndị ị na-azụ dịka ụmụnne maọbụ ụmụ gị maọbụ ikwunibe? I nwere ihe i ji n'aka ugbua na-anapụ gị ego?"

"Ihe ndị a ga-enyere gị aka ịmata etu ị ga-ezi jikwaa ego gị, ma mata ego ole ị ga na-edopu iji nweta ihe ị na-atụ anya ya," nwaada Uche Ani-Iheanacho kwuru.

2) Nwee ihe ị na-atụ anya iji ego ahụ ị na-edopu mepụta

Ụlọ ala
Nkọwa foto, Olileanya gị nwereike ịbụ ịrụta ụlọ maọbụ ịzụta ụgbọala

Dịka oriakụ Iheanacho si kọwaa, mmadụ inwe ihe ọ na'atụ anya iji ego ọ na-edopu mepụta ga-enyere onye ahụ aka na-ajalite mmụọ ya idopu ya bụ ego, ka ọ ghara ịda mba.

"Mana ihe ahụ ị na-atụ anya ya ga-abụkwa ihe kwere omume. Iji maa atụ, onye na-arụ ọrụ nkuzi agaghị ekwu na ya na-atụ anya ịzụta ụgbọelu na ngwụcha afọ," ka o kwuru.

Ọ gara n'ihu kọwaa na mmadụ kwesịrị inwe ihe ọ na-atụ anya ya n'obere oge, n'oge etechaghị aka, nakwa n'ogologo oge.

"Ọ bụrụ na mmadụ enweghị ọrụ, olileanya ya nke mbụ ekwesịghị ịbụ ego ole ọ ga-edopu, kama o kwesịrị ịbụ ka o nwetagodu ọrụ maọbụ ihe ga na-ewetara ya ego," Iheanacho kọwara.

"Nke a ga-enyeziri ya aka ihazi usoro mmefu ego.

3) Detuo usoro mmefu ego gị (Budget)

Bọjeetị dị mkpa nke ukwuu iji nweta ihe ị na-atụ ya n'okwu gbasara ego.

Iheanacho kọwara na n'ịhazị atụmatụ mmefu ego gị, ihe atọ ka mmadụ ga-ebu n'obi: ihe ndị dị mkpa (needs), ihe ndị ị chọrọ mana ha adịchaghị mkpa (wants), na ego ndopu (savings).

Ihe oriri, ahụike na ndị ọzọ socha n'ihe ndị dị mkpa; ndị ọzọ dịka ịga pati na ndị dịka ya so n'ihe mmadụ chọrọ mana ha adịchaghị mkpa. Ọ bụ n'ime ndị a ka mmadụ ga-ewetu aka iji dopu ego maka ihe ọ na-atụ anya ya n'ọdịnihu.

"Ọ dị mkpa na mmadụ kwesịrị ị na-edopu opekata mpe pasentị 20 n'ime ego na-abata ya aka kwa mgbe. Mana ọ dabeere n'ihe onye ahụ na-atụ anya ya. Mmadụ nwereike ịkụchapụ ihe niile na-adịchaghị mkpa ma na-edopu ihe ruru pasentị 50 n'ego niile na-abatara ya," Iheanacho kwuru.

Uchenna Iheanacho

Ebe foto si, Uchenna Iheanacho

Nkọwa foto, Uchenna Iheanacho bụ ọkacha mara n'ihe gbasara nhazi ego onwe

4) Ebila ndụ gafere ego na-abatara gị

N'okwu bekee, nke a pụtara "don't live above your means".

"Iji maa atụ, ọ dịghị mkpa ibi n'okirikiri ebe ụgwọ ụlọ dị ọnụ, ma ọ bụrụ na ego na-abatara gị agaghị ezu ịkwụ ụgwọ ụlọ ahụ ma fọdụkwara gị nke ị ga-eji gboo mkpa ndị ọzọ ma dopụkwa ego," Iheanacho kọwara.

"Ọ bụrụ na ị chọrọ ibi ụdị ndụ ahụ, o kwesịrị iso n'ihe ndị ị na-atụ ya n'ogologo oge (long term goals), iji nye gị ohere ịzụlite ego gi."

5) Nwetakwuo ọmụma

Chọta ihe ndị ọzọ ga-eme ka ego na-abatara gị gbagote. Mụọ ọrụ ị ma na a na-achọ achọ.

"Ọ bụrụ na ị bụ onye ọrụ, gbaa mbọ chọọ ụzọ ị ga-eji towanye n'ihe ị na-eme nke ga-eme ka i nweta mbulielu n'ọkwa, ma bulitekwa ego ole a na-akwụ gị."

"Ọ bụrụ na inweghị ọrụ, chọpụta akaọrụ ndị mmadụ na-achọkarị, tinye ego gị ma mụta ya nke ọma, nke a ga-eme ka i soro na ndị a na-achọ achọ n'ihi ọrụ aka gị. Ọ ga-ebulikwa ego na-abata gị n'aka."

6) Na-atụle ọganihu gị

Uchenna Iheanacho kwuru na ọ dị mkpa mmadụ itule onwe ya kwa mgbe kwa mgbe iji mata ma ọ na-agakwa n'ihu n'ụzọ inweta ihe ọ na-atụ anya ya.

Ntule a ga-enyere onye ahụ aka mata ebe ọ na-eri mperi ma mezie ya, maọbụ mara ebe ọ na-eme nke ọma iji gbaa mbọ karịa.

"Ọ bụrụ na ị tulere onwe gị chọpụta na ị naghị agazite n'usoro ị mapụtaara onwe gị, obi adala gị mba. I nwere ike tulegharịa olileanya gị ma wetulata aka na ya, maọbụ ị chepụta etu ị ga-esi gbasie mbọ ike iji nweta ihe ị na-achọ," Oriaku Iheanacho kwuru.