You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Queen Elizabeth II: Foto ebe e liri ya
Buckingham Palace ewepụtala foto mbụ ebe e liri Ezenwaanyị Elizabeth nke abụọ na Windsor.
Ha ehiwela okpume ojiri n'ili ebe ahụ na George VI Memorial Chapel bụ ebe e dowere ya ụbọchị Mọnde gara aga.
Ha dere n'okwute ahụ na ncheta nne ya na nna ya nakwa di ya nwụrụ anwụ bụ Duke nke Edinburgh.
Ha ji mkpume nke a dochie anya nke dịbụ ebe ahụ bụ nke e dere na aha George VI nakwa nne Ezenwaanyị n'onwe ya.
Ihe e dere na nke a bụ "George VI 1895-1952" na "Elizabeth 1900-2002" nakwa kpakpando Garter "Elizabeth II 1926-2022" na "Philip 1921-2021".
Ha nọ socha n'otu nke Garter bụ otu nke kacha elu n'okwa nke ndị Knight nke mba Briten.
Ndị so na otu nke Chivalry kemgbe ụwa bụ ndị gboo dịka Ezenwaanyị ha na ndị isi ọchịchị dịka ndị Prịam Mịnịsta ha na ndi isi agha ha.
Ha ji okoko mara mma were gbaa ebe ahu ogige maka ịchọ ya mma.
Ha ji okwute mabụlụ dị oji e ji uhie 'brass" dee mkpụrụ okwu dị na ya.
Ọ bụ n'otu ụka George VI Chapel ahụ ka na-aga ụka.
Ebe ahụ ka e likwara nne na nna ya, nwaanne ya nwaanyị nakwa dị ya.