Ụlọikpe enyela iwu ka ejichie Ikechukwu IVD di Bimbo n'ụlọ mkpọrọ

Ebe foto si, Bimbo/IVD/Instagram
Ụlọikpe Magie dị na Legọs ekwuola ka ejichie Ikechukwu Ogbonna a ma dịka IVD maka ebubo ọnwụ nwunye ya.
Ọ pụtara n'ihu ọkaikpe Adebayo Kafayat Tella n'ụlọikpe Magie ahụ dị n'Ebute Meta.
Tella gụpụtara akwụkwọ ikpe akwadoro megide IVD kwuru na ọ bụ n'ụlọikpe ukwu ka a ga-ekpe ikpe ya.
O kwukwara na ganye mgbe a ga-amalite ikpe ya, na ọ ga-anọ n'ụlọ mkpọrọ.
Ọkaiwu na-anọchite anya ya bụ Abubakar Yesufu rịorị Ọkaikpe ahụ ka atọghapụ ya site na 'Bail' n'ihi na enyebuola ya 'bail' mbụ.
Mana Ọkaikpe Tella kọwara na ọ nweghi ikike ịnye ya 'bail' ma sị ha gawa ụlọikpe ukwu ga tinye akwụkwọ ya bụ 'bail'.
Ọ bụkwa n'ụbọchị 7 nke ọnwa Maachị ka ọkaikpe nyere a ga-eji nụ ikpe ya ọzọ.
Cheta na e boro Ikechukwu Ogbonna ebubo ịnwe aka n'ọnwụ nwunye ya bụ Abimbola Martins.
Ọtụtụ mgbe ka anyị gbara mbọ ịzọpụta ya n'ihe a gburu ya - Ezinụlo Bimbo

Ebe foto si, Others
Ezinụlọ Bimbo ezipụtala akwụkwọ ozi were gosipụta iru uju ha ma rịọ ndị mmadụ ka ha nyere ha aka hụ na Bimbo nwetara ikpe ziri ezi.
Ha kwuru sị, "Bimbo bụ ezigbo mmadụ onye mkpagbu ezinụlo nke doro mmadụ niile anya na ọ bụ ya gburu ya".
Ha kwukwara na ọtụtụ mgbe ka ha gbara mbọ ịzọpụta ya n'ọnọdụ a gburu ya.
Ha rịọkwara ka ọha mmadụ tinye ha na ụmụ ise Bimbo mụrụ n'ekpere dịka ha kwuru na ihe nwute ụmụaka a na-agabiga dị ukwu.
Ndị uweojii anwuchiela di Bimbo bụ Ikechukwu Ogbonna
Ndị uweojii Legọs Steetị ekwuola na ha anwụchiela Ikechukwu Ogbonna e ji IVD motors maara maka ebubo na aka ya dị n'ọnwụ nwunye ya bụ Bimbo Ikechukwu.
Ọnụ na-ekwuru ha bụBenjamin Hundeyin gwara BBC Ogbonna (IVD) n'ụbọchị Satọde 15 Ọktoba 2022.
A na-ebo nwamadị a na-ere ụgbọala a ebubo na o gburu Bimbo nwunye ya site n'ịmụnye ya ọkụ n'ụlọ ha dị na Lekki Legọs Steeti.
Hundeyin sị na ha akpọgala nwamadị a na ngalaba ndị uweojii pụrụiche maka ime nyocha n'ebubo e boro ya.
Ikechukwu na Bimbo lụrụ di na nwunye mgbe Bimbo dị naanị afọ iri na asatọ, mgbe ọ tụwara ya ime.
Bimbo mụtara ụmụ ise tupu ọ laa mmụọ.
Kedụ ihe butere okwu a?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Akụkọ kwuru na Ikechukwu na Bimbo nwere esemokwu n'ụbọchị Wenezde, n'ime ọgbaghara ahụ na ọkụ malitere ịgba n'ụlọ ha.
Ikechukwu gbanahụrụ ọkụ ahụ ebe ọkụ ọ gbara nwunye ya Bimbo.
Bimbo nwụrụ n'ụbọchị Satọde, 15 Ọktoba dị ka ọ lụrụ ọgụ ịzọ ndụ ya n'ụlọọgwụ abalị abụọ.
Otu onye ezinaụlọ ya kwuru na enwere oge Bimbo si na alụmdị na nwunye ha gbapụ ma mechaa lọghachite mgbe ha kpezichara.
Ọ sị n'afọ 2020, Bimbo gbajiri aka mgbe ya na Ikechukwu lụchara ọgụ.
Mgbe na Bimbo chọrọ igbu onwe ya maka oke nsogbu dị n'ezinaụlọ ahụ.
Ọ kwuru na ọ bụ arịrịọ ndị ezinaụlọ Bimbo rịọrọ ya mere o jiri lọghachị n'alụmdị na nwunye ahụ.
Onye agbataobi ha sị na ya nụrụ mkpu n'ụlọ ha n'abalị Wenezde.
Ọ gwara ndị ntaakụkọ na ọ nụrụ na Bimbo wụrụ onwe ya 'fuel' ma mụnye onwe ya ọkụ.
Kama ọ sị na ọ maghị ma ọ bụ eziokwu.
Ọtụtụ ebubo adapụtala n'okwu banyere Ikechukwu IVD na nwunye ya Bimbo mana ndị uweojii sị na ha ga-esi imi n'ala ịchọpụta nke bụ eziokwu.
Akụkọ banyere esemokwu di na nwunye nke butere ọnwụ otu n'ime ha na-arịzi elu na Naịjirịa ugbua.
Nyocha dị n'akwụkwọ Lancet ewepụtara n'afọ 2022 kwuru na otu nwaanyị n'ime ụmụnwaanyị anọ na-agabiga mwakpo n'ime ezinaụlọ ha.









