E nyochapụtala ọrịa 'Monkey Pox' n'Abia Steeti

Ọrịa Monkey Pox na-avụkasị ndị mmadụ n'elu ahụ dịka akpịkpa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọrịa Monkey Pox na-avụkasị ndị mmadụ n'elu ahụ dịka akpịkpa

Gọọmentị Abịa Steeti adọọla ndị bi ebe ahụ aka na ntị ka ha kee nkwụcha ma chekwa onwe ha dịka e nyochapụtara ọrịa Monkeypox na steeti ahụ.

Joe Osuji bụ kọmishọna ahụike sị na ebe a ndị a hụrụ ọrịa a gụnyere okpuruọchịchị Aba North, Umuahia South nakwa Ikwuano.

Osuji kwuru “Anyị emeela ihe niile anyị kwesịrị ime maka ndị a, ha na-anata ọgwụgwụ ugbua”

“Anyị anatala ozi ndị niile ha na ndị a nwerela mmekọrịta na nso nso a”

“Ụfọdụ n’ime ndị a ebughị ọrịa a dịka nnyocha si gosi ebe a ka na-eche mpụtara nnyocha ime ahụ ndị ọzọ nke ga-esi Abuja pụta”

Cheta na ọrịa a malitere na-efesa n’akụkụ ụwa dị icheiche na nso nso a.

Gọọmentị Naịjirịa machiri orure anụ ọhịa nke a na-akpọ ‘Bush meat’ na Bekee dịka otu n’ime ụzọ a ga-esi gbochie mefesa ọrịa ‘Monkey Pox’.

Ndị ọrụ ahụike na-ekwu na mmadụ nwereike isi n’ụzọ ịta anụ ọhịa bute ọrịa 'Monkey Pox’.

Nke a so ozi na a hụrụ ọrịa a n’ahụ mmadụ isii na Naịjirịa n’ọnwa Juun 2022.

N’ọnwa ahụ, nke a mere ya mmadụ 21 a na-ahụ ọrịa a n’ahụ ha na Naịjirịa n’afọ 2022.

Ihe mere e ji machie ịta anụ nchi, mgbada, ele na anụ ọhịa ndị ọzọ

Anụ nchi so na anụ ọhịa na-amasị ndị mmadụ nke ukwuu na Naịjirịa

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Anụ nchi so na anụ ọhịa na-amasị ndị mmadụ nke ukwuu na Naịjirịa
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Gọọmentị Naịjirịa amachiela orure anụ ọhịa nke a na-akpọ ‘Bush meat’ na Bekee dịka otu n’ime ụzọ a ga-esi gbochie mefesa ọrịa ‘Monkey Pox’.

Nke a na-abịa dịka a hụrụla ọrịa a n’ahụ mmadụ isii na Naịjirịa n’ọnwa a.

Nke a na-eme ya mmadụ 21 a na-ahụ ọrịa a n’ahụ ha na Naịjirịa n’afọ 2022.

Ndị ọrụ ahụike na-ekwu na mmadụ nwereike isi n’ụzọ ịta anụ ọhịa bute ọrịa 'Monkey Pox’.

Ha kwukwara na mefesa na-esi n’ụzọ a anaghị adịkarị ire.

Ọrịa Monkey Pox bụ ọrịa nje na-akpata nke ji nwayọ nwayọ mefesa Naịjirịa ugbua.

Ọrịa a na-efesakaarị n’ime obodo ebe ọtụtụ ọhịa na-eto.

Ọrịa a na-adapụta na ntunye na ntunye na Naịjirịa ugbua kemgbe 2017 mgbe ahụrụ ya na mbụ na nso nso a.

Otu ahụike ụwa World Health Organization kọwara na ọrịa a na-aka efesa na ndịda Naịjirịa mana kemgbe 2020, ọrịa a efesala gaa mpaghara etiti, ọwụwa anyanwụ na ugwu Naịjirịa.

Otu onye n’ime mmadụ 21 a hụrụla ọrịa a n’ahụ ha anwụọla nke bụ onye ahụ adịghị kemgbe.

Ndị ọrụ ahụike na mbido izu a kwuru “Enweghị ihe akaebe gosiri na ọrịa a na-efesa ugbua maọbụ nke gosiri mgbenwe na-etu o si efesa dịka ọ dị n’akwụkwọ nnyocha”

Ndị ọrụ Sanyesi na-agba mbọ ịchọpụta ihe na-akpalite mefesa ọrịa a n’akụkụ ụwa dị ịcheịche nke gụnyere Europe, Amerịka na ebe ndị ọzọ.

A na-ekwu na mefesa ọhụrụ ndị a esighị n'Afrịka apụta.

Ọrịa Monkey Pox efesala gaa ọtụtụ mba ụwa na 2022 karịa etu o si efesa na mbụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọrịa Monkey Pox efesala gaa ọtụtụ mba ụwa na 2022 karịa etu o si efesa na mbụ

Ihe i kwesịrị ima maka mefesa 'Monkey Pox' ugbua

Achọtala ọrịa monkeypox n'ahụ onye ọzọ na mba Briten, Ka anyị lebanye ọrịa pụrụiche anya.

Monkeypox o juru ebe niile?

Ọ bụ nje Monkeypox na-ebute ọrịa monkeypox, ya na ọrịa kịtịkpa nwere otu nje na-ebute ha kama monkeypox anaghị enye nsogbu ka kịtịkpa ebe ndị sayensi na-ekwu na anaghị enweta ya kwadaa.

Ọ bụ n'ime obodo dị na mpaghara etiti na ọdịda anyanwụ Afrịka, ebe ndị nọ ọhịa nso.

Nje a nwere agba abụọ nke bụ 'West African' na 'Central African'.

Mmadụ abụo a si Naijirịa bata Briten, ọ dịka ha a na-arịa nke agba West Africa nke echere anaghị enye oke nsogbu kama amatachabeghị nke bụ eziokwu.

Onye nke atọ bụ onye ọrụ gbata gbata butere ya n'aka onye na-arịa ọrị a.

Kama mmadụ anọ butere ya nsonso a enweghị etu ha na ndị butere ya na mbụ siri nwee mmekọ.

UK Health Security Agency (UKHSA) na-ekwu na onye ọbụla chere na obutela ya gaa ahụ onye ọrụ ahụike ma kpọọ ụịloọgwụ tupu ha agawa.

Gịnị bụ njirimara ọrịa a?

  • Njirimara mbụ ọrịa a gụnyere ahụ ọkụ, isi ọwụwa, ahụ ozịza, azụ mgbu, ahụ mgbu na ịchere ụkwụ na mmadụ anọkwuteghị otu ebe.
  • Mgbe ahụ ọkụ bidoro, ọkọ ahụ nwereike ipụta, ọ na-ebidokarị n'ihu, site ebe ahụị gbasaa akụkụ ahụ ndị ọzọ, kachasị aka na ichere ụkwụ.
  • Ọ na-akọ oke ọkọ.O na-ejikarị aka ya ala n'ime ụbọchị 14 na 21.

Kedụ etu esi ebute ya?

Mmadụ nwereike ibute Monkeypox ma ya na onye nwe ya nwee mmekọ.

Ọrịa nwereike isite n'ọnya ahụ, ebe esi eku ume, anya, imi maọbụ ọnụ banya ahụ onye ọzọ.

Mmadụ nwereike ibute ya site na mmetụ oge mmekọ nwoke na nwaanyị.

Anụmanụ dịka enwe, oke na ụsa maọbụ ihe ọbụla nje a metụtara nwereike ịbunye mmadụ ọrịa a.

Foto gosiri etu nje ọrịa Monkey Pox dị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Foto gosiri etu nje ọrịa Monkey Pox dị

Kedụ etu ọrịa siri dị njọ maka ahụike?

Ọtụtu mgbe, ọrịa a anaghị adị njọ ọ na-eji aka ya ala n'ime izuụka olemaole.

Monkeypox a nwereike ịkanwanye njọ dịka akụkọ na-ekwu na ogbuola ụfọdụ ndị mmadụ na mpaghhara ọdịda anyanwụ Afrịka.

Ugboro ole ka ọ na-etiwapụta?

Ọ bụ n'ahụ enweka ebu ụzọ hụ ya, mana kamgbe afọ 1970, anụla maka ya na mba iri dị n'afrịka.

Ọ bụ na mba Amerịka n'afọ 2003 ka ahụtara ọrịa na mbụ na mba na-anọghị n'Afrịka.

Ọ bụ ndị ha na anụmanụ ndị bu ọrịa nwere mmekọ butere ọrịa a dịka mmadụ 81 butere ya na mba Amerịka.

Ọ bụ n'afọ 2017 ka mmadụ 172 butere ya na Naijirịa ebe 75% n'ime ha dị site afọ 21-40.

Ọgwụgwọ Monkeypox?

Ọrịa a enweghị ọgwụgwọ, kama enwereike ịkwụsị mfesa ya.

Ọgwụ mgbochi monkeypox nwereike iji 85% gbochie ya.

Obi ekwesịrị ịmapụ anyị?

Ndị ọkaibe na-ekwu na orubeghị ọnọdụ ozurumbaọnụ.

Prof Jonathan Ball, bụ ọkaibe na molecular virology, nke mhadum Nottingham kwuru sị:

" Ebe ọ bụ naanị otu onye n'ime mmadụ 50 ha na ọrịa nwere mmekọ butere ha na-egosi na ya bụ ọrịa anaghị efesa n'ike".

Dr Nick Phin, bụ osote onyeisi, National Infection Service nke Public Health England (PHE), kwuru sị:

" Ọ dị mkpa ka ndị mmadụ mata na ọrịa mpnkeypox anaghị eji ike efesa n'etiti ndị mmadụ ma etu ọ ga-esi emetụta ahụike ndị ọha ebughị ịbụ".

PHE na ndị ha na onye nwere ọrịa nwere mmekọ na-akparịta ụka iji nye ha ezigbo ndụmọdụ na ihe ndị ọzọ dị mkpa".

Ebe akụkọ a si:PHE England and World Health Organization.