Gini na-esere Obi of Onitsha na ụmụnwaanyị otu Ọdụ Onitsha?

Ebe foto si, Ivenkilli/Facebook
Eze Ọnịcha bụ Igwe Alfred Achebe amachiela onye isi otu ọdụ Ọnicha bụ Enyi Florence Osoka ma napụ ya ikike diara ya dịka onyeisi otu ahụ.
Ozi obi Igwe Achebe wepụtara nke otu ndị ichie bụ 'Igwe in Council binyere aka na ya, kwuru na, okwu gbasara otu Ọdụ ahụ akarịala ma bụrụ ihe e kwesịrị ilebanyere anya.
Ha kọwara ma ọ bụ ụbọchị 10th June ka ha nwere nzụkọ n'ime obi were tinye ọnụ na nsogbu niile gbasara otu odu.
Gịnị na-ese?
Akụkọ kwuru na onyeisi Otu Odu bụ Enyi Flourence Osoka na nwaanyị ọzọ bụ Enyi Rita Areh nwere nsogbu kemgbe Jenụwarị 2023.
Esemokwu ahụ wetara nsogbu n'etiti ngalaba otu ọdụ mba Amerịka nakwa nke ụlọ nke mere ka ha gaa ụlọikpe iji weta udo.
N'agbanyeghị okwu ndụmọdụ niile Igwe Achebe nyere ụmụnwaanyị, ha gara n'ihu n'esemokwu ahụ. Ọ bụ nke a mere Igwe Achebe ji napụ Enyi Florence Osoka oche ya dịka onyeisi otu Ọdụ Ọnịcha.
Ntaramaahụhụ dịịrị ndị otu Ọdụ
N'ihi nnupuisi ha nakwa ejighi okwu Igwe Achebe na ndị otu ya kpọrọ ihe, Igwe Achebe kwuru na ndị otu Ọdụ ga-akwụnye ego dị nde naira isii n'akpa "Onitsha Development Trust Fund"
A gwakwara ụmụnwaanyị ahụ ka ha degara Igwe Achebe akwụkwọ arịrịọ mgbaghara maka nkparị ha kparịrị oche Eze ya.
O kwuru na ọ bụ Eze Ọnịcha hiwere otu Ọdụ ma kwuo na otu ahụ ga-edobe iwu niile e wepụtara oge e hiwere ha ma ghara ịkpa agwa dí aghaa.
Otu Ọdụ Ọnicha bụ nke e hiwere iji chie ụmụnwaanyị tozuru etozu n'ala Onicha echichi.
Ekike otu Ọdụ gụnyere ịma akwaete ọcha n'obi na ịgba ọdụ enyi n'ụkwụ.
Ọ bụ nanị ụmụnwaanyị tozuru etozu na-abanye ma chie echichi ịgba ọdụ.
Mmemme ịgba ọdụ dịkwa ebe ndị ọzọ n'Anambra na Delta steeti dika obosi, Nri, Anioma nakwa ndị ọzọ.









