O meela afọ atọ Rọshịa wakporo Yukren: Lee ihe ị kwesiri ịma

Ebe foto si, Reuters
Ụbọchị Monde 24 Febuwarị 2025 ka o mere afọ atọ kemgbe mba Rọshịa nwakporo mba Yukren.
N'ime afọ atọ a, ọtụtụ ihe emeela n'etiti mba abụọ ahụ nakwa ndị na-akwado ha.
Ka mba Yukren na ndị na-akwado ha na-enwe nghọtafe, mba Rọshịa dịka ha enweghị nsogbu ọbụla n'etiti ha na ndị nakwado ha.
Gịnị mere mba Rọshịa ji nwakpo mba Yukren n'afọ 2022?
Kemgbe agha Rọshịa na Yukren bidoro, ndị mmadụ na-aju ajuju ihe mere ọgụ ahụ ji bido.
Ihe ndị anyị mara bụ na:
- N'abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Febuwarị afọ 2022 ka mba Rọshịa kwuru na ha chọrọ ime ka mba Yukren hara inwe ndịagha.
- Tupu Rọshịa awakpo mba Yukren, ha kwadokwara ndịagha nnupuisi na-achị mpaghara ọwụwa anyanwụ mba Yukren ka ha were onwe ha. Ndị nnupuisi ahụ malitere ịchị mpaghara Yukren kemgbe afọ 2014.
- Rọshịa mechara sị na ha achọghị ka mba Yukren soro n'otu agha North Atlantic Treaty Organization (NATO).
- Ndị ọchịchị mba Rọshịa ekweteghị na mba Yukren bụ mba nke onwe ya, nke a mere ka ha kwuo na Rọshịa na Yukren bụ otu mba.
Mba ndị na-akwado Yukren na ndị na-akwado Rọshịa
Mba a maama na-akwado mba Yukren kemgbe agha ahụ bidoro gunyere:
- Mba Amerịka
- Mba Breten
- Mba Fransị
- Mba Jamini
- Na ọtụtụ mba ndị ọzọ nọ nị Yurop na mpaghara ụwa.
Mba ndị a maama kwadoro mba Rọshịa gunyere:
- Mba Nọt Kotrịa
- Mba Iran
- Mba Syria
- Mba Belarus
- Na ndị ọzọ.
Mana na mba ndị niile, mba dịka Chaịna na India apụtaghị ịkwado maọbụ ịkatọ nwakpo Rọshịa nwakporo Yukren.
Mba abụọ ndị a ka na-azụ ndị mba Rọshịa ahịa na-agbanyeghị mmachị mba dịka Amerịka na ndị ọzọ nyere ha.

Ebe foto si, Reuters
Mmemme icheta afọ atọ mba Rọshịa nwakporo Yukren
Ka a na-eme ncheta afọ atọ mba Rọshịa wakporo Yukren, ndị ndu Yurop gara mba ahụ ịdọnyere Yukren ukwu ma kpa etu a ga-esi kwụsị agha ahụ.
Ndị isi otu jikọrọ mba niile nọ na Yurop bụ Ursula von der Leyen na Antonio Costa nakwa ndị ọzọ gara njem a.
N'okwu ha "anyị nọ na Yukren taa maka na Yukren bụ Yurop. N'agha ịzọ ndụ a, ọ bụghị naanị ndị Yukren nọ na nsogbu".
Ndị ndu Yurop bidoro na-ekwupụta nkwado ha na-enye mba Yukren kemgbe Onyeisiala mba Amerika bụ Donald Trump kwuru na ọ bụ mba Yukren bidoro agha ahụ ma kpọ Onyeisiala ha 'onye ọchịchị aka ike'.
Ihe mere n'ọgbakọ mba Yukren ji eme emume icheta afọ atọ mba Rọshịa wakporo Yukren

Ebe foto si, Havariekommando
Ihe gbara ọkpụrụ mere mgbe ndị ndu mba dị na Yurop nọnyere mba Yukren n'emume nchata afọ atọ mba Rọshịa wakporo ha gunyere ịkpọ oku ka enye mba Rọshịa ntaramahụhụ.
Yurop machiri mba ha ị bubata ngwa ahịa 'aluminium ' si na mba Rọshịa. Nke a bụ ugboro iri na isii ha na-enye mba Rọshịa ntaramahụhụ maka ịnwakpo mba Yukren.









