Mariupol: Ihe mere Mariupol ji dị mkpa n'atụmatụ Rọshịa

Mariupol, 20 March

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Frank Gardner
    • Ndị mere akụkọ a, BBC security correspondent

Mariupol abụrụla obodo dị na mba Yukren ndị mba Rọshịa kacha ebuso agha ma kachakwa mebie.

Gịnị mere obodo a ji dị oke mkpa n'agha ndị Rọshịa na-ebuso mba Yukren?

E nwere ihe anọ mere inweta obodo a nwere ọdọ ụgbọmmiri jiri dị ndị Rọshịa mkpa ma bụrụ ọdachị nye ndị mba Yukren.

1. Inweta ma jide oke ala dị n'etiti Donbas na Crimea

Elewe anya n'ihe gbasara ala, Mariupol pere mpe kama ọnọchịrị ndị agha mba Rọshịa isi Crimea bata

Ha si ebe a achọ izute ndị otu ha na ndị nnupuisi Yukren nọ na Dọnbas.

Richard Barrons onye bụbu ọchịagha ndị agha Briten kwuru na Mariupol dị oke mkpa n'agha Rọshịa na-ebuso mba Yukren.

"Mgbe ndị Rọshịa lụchara agha a n'uju ha, ha ga-enweta ụzọ jịkọrọ mba Rọshịa na Crimea ma ha ga-ahụkwa nke a dịka ọganihu dị oke mkpa".

Ọ bụrụ na Rọshịa nweta Mariupol, ha enwetala 80% ikpere mmiri Blcaksea nke bụ na ha ewepụla ma jibodo ụzọ Yukren ji azụ ahịa maọbụ maọbụ ha na mba ọzọ ịnwe mmekọ.

Ndị Yukren na-aluso ndị agha Rọshịa ọgụ kamgbe izuụka atọ tinyere ndị agha Rọshịa na gbaharịa.

Ọnọdụ a ndị agha Rọshịa nọ mere ka ha were atụmatụ agha oge gboo were bido ịtụ ogbunigwe aghara aghara na mpaghara Mariupol.

Ha ewepụla ọkụ latrik, mmiri, nrị , ihe ekpemọkụ na ọgwụ. Ọ bụ dịka ndị mba Yukren ekweghị ịtọgbọ ngwa ọgụ ha ma chilie aka elu dịka Rọshịa nyere ha elekere ise mgbede nke ụbọchị Mọnde.

Otu onye omeiwu mba Yukren na-ebo Rọshịa ebubo "iji agụrụ eme ka ndị agha Yukren kwụsị igbochi Rọshịa ịbata were ọnọdụ."

Map showing how Russian forces have surrounded the port city of Mariupol.

Yukren na-ekwu na ha ga-eji ihe niile na mmadụ niile ha nwere hụ na Rọshịa abataghị Mariupol.

Etu ihe siri dị, okwu ha dịka ọ ga-abịa na mmezu.

Ndị agha Rọshịa na-abata obere obere ma dịka enweghị okwu udo ọbụla, ndị Rọshịa ga-eji ohere a tusiwa ogbunigwe ike.

Ọ bụrụ na ndị Rọshịa meecha nweta obodo Mariupol, ha ga-enye ohere ka ndị agha ruru 600, hazie onwe ha dịka batalịọn mmadụ 1,000 ma nwezie ike ga-nyere ndị agha Rọshịa nọ n'ihu.

Enwere ebe ole na ole e nwereike iziga ndị a:

  • Mpaghara ọwụwa anyanwụ nke ugwu iji nwee ike ịgba ndị agha Yukren na-aluso ndị na-akwado mba Rọshịa okirikiri.
  • Mpaghara ọdịda anyanwụ iji ruo Odesa bụ obodo ikpeazụ nyere ndị Yukren ụzọ Black Sea
  • Mpaghara ugwu gawa obodo Dnipro
Where might Russian forces advance next if Mariupol falls? - map

2. imekpa akụnaụba Yukren ahụ

Mariupol kamgbe abụrụla obodo dị oke mkpa nke dị n'ọdọ ụgbọ mmiri Oshimiri Azov, nke sọ na oshimiri Black Sea.

Oshimir Azov miri emi nke ọma nke mere ka ọ bụrụ ebe ngbere igwe n'etiti mba YUkren na ndị nke nọ na mpaghara Middle East na ebe ndị ọzọ.

Ihe ndị Yukren ji gbochie ụgbọala isite na oshimir Azov ịbata n'okporo ụzọ, 17 February

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ihe ndị Yukren ji gbochie ụgbọala isite na oshimir Azov ịbata n'okporo ụzọ, 17 Febr

Kemgbe afọ asatọ ugbua mgbe Rọshịa dọtara Crimea, obodo a nọ n'etiti ndị agha Rọshịa nọ na Crimea na ndị na-akwado Rọshịa nọ na mpaghara Donetsk na Luhansk na mba Yukren.

ihe ga-esiri akụnụba ndị mba Yukren ike ma Rọshịa mechaa were Mariupol.

3. Ohere izi ozi nrafu

Mariupol bụ ebe ndị otu Azov Brigade bụ ndị kwenyere n'echicha Adolf Hilter a na-akpọ 'Neo Nazi'.

Agbanyeghị na ha mejupụtara obere n'ime ndị agha mba Yukren, mba Rọshịa ejirila ohere a kwuo na ndị agha ha na-aga ịchụpụ ndị Neo Nazi.

Azov Battalion training camp at a former holiday resort near Mariupol, February 2019

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ebe ndị Azov Brigade na-amụ ọgụ n'ebe oriri dị nso Mariupol, February 2019

Ndị Rọshọị nwee ike jide ụfọdụ ndị Azov Brigade a, ha ga-egosịpụta ha dịka njọ ha chọrọ ịwepụ na mba Yukren.

4. Mkpalịọ mụo ndị Rọshịa

Ndị Rọshịa meecha were ọnọdụ na Mariupol, ha ga-eji ohere ahụ gosi ndị mba ha na ha enwetewala ihe ha na-achọ.

Kama onyeisiala Putin hụtara agha n'ụzọ ọzọ maka ọ na-ahụta oshimiri Black Sea dịka ihe akpọrọ Novorossiya, nke bụbu ala Rọshịa mgbe ha nọ n'ọchichị n'afo ndị 1800.

Putin chọro ịweghachi ya ọzọ site n'atụmatụ, " ịzọpụta Rọshịa n'aka ajọ mkpagbu ndị mba nọ na ọdịda ụwa".

Kama ọ ga-ewute ndị mba Yukren, akụnụba ha ma mbọ agha ha na-agba. Ọ ga-eme kwa ka obi ndị na-alụ ọgụ a daa mba ịchekwa ala nna ya.

Mariupol ga-abụgwa obodo abụọ danyere n'aka ndị Rọshịa dịka Kherson ha etinyesighị mbọ ike ịchekwa.

Ndị na-egwu ili ndị nwụrụ, 20 March

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị na-egwu ili ndị nwụrụ, 20 March

Mariupol agbaala mbọ ichekwa onwe ha kama o furu ihe ihe.

Mba Rọshịa ejirila ogbunigwe gbarie obodo ahụ.

Ọ ga-agụnye ya na obodo dịka Grozny na Allepo ndị agha Rọshịa ji ogbunigwe memilaa.

Nke a bụ ozi dọrọ anya mba Rọshịa na-ezigara obodo ndị ọzọ nọ na mba Yukren, " luso anyị ọgụ ma rite ihe Mariuolu ritere".

Dịka Richard Barrons si kwuo. " Ndị Rọshịa enweghịike iji ụkwụ maọbụ ụgbọala agha ha bata Mariupol. Ya mere ha jiri were gbunigwe gbarie ebe niile. Ọ bụ kwa etua ka ọnọdọ ebe ndị ọzọ ha chọrọ ịbata ga-anọ"