Onyonyo nzuzo egosila ka ndị na-atụ mgbere 'visa' si egwu ndị mmadụ chandum

Aha onyonyo, Onyonyo nzuzo egosila ka ndị na-atụ mgbere 'visa' si egwu ndị mmadụ chandum
Onyonyo nzuzo egosila ka ndị na-atụ mgbere 'visa' si egwu ndị mmadụ chandum
    • Onye dere ya, Tamasin Ford
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Global Disinformation Unit and Africa Eye

Onyonyo BBC setere na nzuzo egosipụtala ndị na-aghọrị ndị mbịarambịa na-achọ ohere oru na ngalaba nlekọta nke mba UK.

Otu n'ime ndị ahụ na-egwu chandum bụ Dọkịta si Naịjirịa, onye rụrụla ọrụ na ngalaba nlekọta ụbụrụ n'ụlọorụ ahụike NHS.

Ụlọorụ na-ahụ maka ihe na-eme na mba UK ekwetala na a pụrụ imetọ usoro ahụ mana nnyocha BBC World Service mere gosiri ụzọ dị mfe ndị a na-egwu chandum si aghọgbu ụmụ mmadụ, zoo onwe ha ma gaa n'ihu na-erite uru.

Onyonyoo anyị sere na nzuzo kpughere ụzọ aghụghọ ndị ahụ na-egwu chandum dịka:

  • Ire ọrụ n'ụzọ iwu megidere n'ụlọorụ nlekọta mba UK
  • Imepụta usoro adịgboroja e ji akwụ ụgwọ iji kpuchie na ụfọdụ ọrụ adịghị ire
  • Isite na ngalaba nlekọta banye na ngalaba ndị ọzọ dịka ọrụ ihe owuwu, ndị anaghị enweta ndị ọrụ zuru oke

Akụkọ gbasara ịghọgbu ndị mbịarambịa arịala elu kemgbe usoro inweta akwụkwọ visa gọọmenti haziburu iji nabata ndị ọrụ ahụike si mba ọzọ ịrụ ọrụ na UK gbasakwuru iji gụnye ndị ọrụ nlekọta.

Iji tinye akwụkwọ maka visa ahụ, ndị chọrọ ya ga-ebu ụzọ nweta asambodo nkwado bụ "Certificate of Sponsorship" (CoS) site n'aka onye na-enye ọrụ na UK ụlọorụ na-ahụ maka ihe na-eme na mba ahụ nyere nkwado. Ọ bụ mkpa ọ dị inweta asambodo nkwado ka ndị a na-egwu chandum ji aghọrị ndị mmadụ.

"Ogogo nghọrị dị n'inweta visa maka ọrụ ahụike na nlekọta bụ nke pụtara ihe," ka Dora-Olivia Vicol, Onyeisi ụlọorụ Work Rights Centre bụ ụlọọrụ na-enyere ndị mbịarambịa na ndị a ghọgburu na mba UK aka inweta ikpe ziri ezi kwuru.

"Echere m na ọ ghọọla nsogbu gazuru mba ọnụ."

O kwuru na "e nwere ihe izendụ dị n'ime" usoro inweta nkwado ahụ n'ihi na "ọ na-etinye onye na-enye ọrụ n'ọnọdụ inwe nnukwu ikike".

BBC zigara ndị ntaakụkọ abụọ na-eme nnyocha ka ha gakwuru ndị ahụ na-enye ọrụ na mba UK.

Onyonyo nzuzo gosiri ka Dr Kelvin Alaneme na-akọwa etu o si eresi ndị mba ọzọ ọrụ mba UK

Otu n'ime ha zutere Dr Kelvin Alaneme, nwafọ Naịjirịa bụ dọkịta na onye hibere ụlọọrụ CareerEdu na Harlow dị n'Essex.

Websaịt ya kwuru na ọrụ ya bụ "ebe mgbakwasa ụkwụ maka inweta ohere na mbaụwa, nke na-ahụ maka ụmụ Afrịka ndị na-eto eto", ma kwuo na ya nwere mmadụ 9,800 "obi dị mma" maka enyemaka ya.

Dịka o kwetara na onye ntaakụkọ BBC nwere mmadụ na ngalaba nlekọta mba UK, DR Alaneme gbara mbọ iwere ya n'ọrụ dịka onye ga na-akpọtara ya ndị ọrụ, ma kwuo na ọ ga-ewetara ha nnukwu uru.

"Naanị chọtara m ụlọ ndị na-elekọta mmadụ. A pụrụ m ime ka ị bụrụ ide," ka o kwuru.

Dịka onye ọ na-atụ anya mgbakọaka, o mere ka onye ntaakụkọ anyị mata ụzọ ndị dịka Dr Alaneme si egwu ndị mbịarambịa chandum. Dr Alaneme kwuru na ya ga-akwụ £2,000 ($2,600) maka ohere ọbụla ọ chọtara n'ụlọ ndị nlekọta ma kwe nkwa ịkwụ ya £500 ($650) dịka ego mkponyeaka.

O kwuru na ya ga-eresị ndị nọ Naịjirịa ohere ọrụ ndị ahụ.

Ịna ndị mmadụ ego maka ohere ọrụ na mba UK bụ nke iwu akwadoghị.

"Ndị na-achọ ọrụ ekwesịghị ịkwụ ụgwọ ọbụla maka ọ bụ n'efu. O kwesịrị ịbụ n'efu," ka ọ sịrị, dịka o wedara olu ya.

"Ha na-akwụ ụgwọ n'ihi na ha maara na o nwereike ịbụ naanị ụzọ ha pụrụ isi bata."

BBC malitere inyocha ya n'ihi ọtụtụ mkpesa e nwetara n'ịntaneetị gbasara ọrụ ịkpọga ndị mmadụ mba ofesi.

Praise bụ nwaafọ Igbo na Naịjirịa ma bụrụkwa onye nọ n'etiti afọ 30 ya bụ otu n'ime ndị nyere mkpesa, kwuo na ya kwụrụ Dr Alaneme ihe karịrị £10,000 ($13,000) maka ọrụ na mba UK. O kwuru na a gwara ya sị na ọ ga-arụrụ ụlọorụ nlekọta a kpọrọ Efficiency for Care dị na Clacton-on-Sea ọrụ. Ọ bụzi oge ọ wuchiri mba UK ka ọ chọpụtara na e nweghị ọrụ dị etu ahụ.

Praise bụ nwaafọ Naịjirịa nọ n'etiti afọ 30 ya yi akwa ojii ma nọrọ ọdụ n'ihu Clacton-on-Sea.
Nkọwa foto, Praise sị na ya kwụrụ Dr Alaneme ihe karịrị £10,000 maka ọrụ na mba UK

"Ọ bụrụ na m maara na e nweghị ọrụ, agaraghị m abịa ebe a," ka o kwuru. "Oge m nọ Naịjirịa, ọ bụrụ ma owu saa m, enwere m ike gakwuru nwanne m nwaanyị maọbụ nne na nna m rie nri efu. Ọ bụghị etu ọ dị ebe a. Ị ga-anọ agụụ."

Praise kwuru na ya zigaara Efficiency for Care na Dr Alaneme ozi ọtụtụ ọnwa, jụọ ha oge ọ ga-amalite ọrụ. N'agbanyeghị nkwa enyemaka niile Dr Alaneme kwere, ọ hụghị ọrụ ahụ. Ka otu afọ gasịrị, o nwetara ohere n'ụlọorụ nlekọta ọzọ dị njikere ịkwado ya ka ọ gaa n'ihu biri na mba UK.

Nnyocha anyị chọpụtara na Efficiency for Care weere ihe dịka mmadụ 16 n'ọrụ n'afọ 2022 nakwa mmadụ 152 n'afọ 2023. Mana akwụkwọ leta ụlọọrụ na-ahụ maka ihe na-eme na mba UK dere n'ọnwa Mee, 2023 nke BBC hụrụ gosiri na ha nyere ndị mbịarambịa asambodo nkwado 1,234 n'agbata Maachị 2022 na Mee 2023.

A napụrụ Efficiency for Care ikikere nkwado n'ọnwa Julaị, 2023. Ụlọọrụ ahụ enweghịzi ike isi na mba ọzọ were ndị ọrụ mana ha ga-aga n'ihu na-arụ ọrụ.

Ha gwara BBC na ha jụrụ ịnabata ebubo ịgbakọrọ Dr Alaneme aka. Ha sị na ha kwenyere na ha gbasoro iwu were ndị ọrụ na Naịjirịa nakwa mba ndị ọzọ. Ha agbaala ụlọọrụ Home Office akwụkwọ n'ụlọikpe maka ịnapụ ha ikikere nkwado.

Na nzukọ ọzọ e setere n'onyonyoo nzuzo, Dr Alaneme kpughere aghụghọ ọzọ gbara ọkpụrụkpụ nke gụnyere akwụkwọ nkwado maka ọrụ ndị anọghị.

O kwuru na uru inwe asambodo CoS nke na-enweghị ihe jikọtara ya na ọrụ "bụ na i nwereike họrọ obodo ọbụla ị chọrọ".

"I nwereike gaa Glasgow. I nwereike nọrọ na Lọndọn. I nwereike biri ebe ọbụla," ka ọ gwara anyị.

Nke a abụghị eziokwu. Ọ bụrụ ma onye mbịarambịa jiri visa ọrụ ahụike na nlekọta wuchie UK ma ghara ịrụ ọrụ e nyere ya, e nwereike kagbuo visa ha ma chụlaa ha.

N'ihe onyonyoo nzuzo ahụ, Dr Alaneme kọwakwara etu e si ahazi usoro ụgwọọnwa adịgboroja iji mee ka a ga-asị na ọrụ ndị ahụ dị ire.

"Ihe gọọmenti chọrọ ịhụ bụ [ebe ndị a kwụrụ ụgwọ]," ka o kwuru.

O kwuru na ụlọọrụ ya na-enye ezigbo ọrụ, gbakwunye na ego Praise nyere ya bụ nke e nyefere ndị na-akpọpụ mmadụ maka ime njem, ebe obibi na ọzụzụ Praise. Ọ sịrị na ya gbara mbọ inyere Praise aka chọta onye ọzọ na-ewe ndị ọrụ n'efu.

BBC mekwara nnyocha nzuzo na nke onye na-akpọpụ mmadụ bi na mba UK aha ya bụ Nana Akwasi Agyemang-Prempeh oge ọtụtụ mmadụ gwara BBC na ha jikọtara aka kwụọ puku kwuru puku pound maka ohere ọrụ nlekọta n'aha ndị enyi ha na ndị ezinaụlọ ha mana o nweghị isi.

Ha kwuru na ụfọdụ asambodo nwado Nana Akwasi Agyemang-Prempeh nyere ha ka ha chọpụtara bụ adịgboroja.

Nwaanyị yi uwe na-acha anụnụ anụnụ na-agwa onye ntaakụkọ okwu
Nkọwa foto, Nwaanyị a sị na ya kpọgaara Nana Akwasi Agyemang-Prempeh ndị enyi ya na ndị ezinaụlọ ya, bụ ndị kwụrụ £35,000 maka CoS ha chọpụtara bụ adịgboroja

Anyị chọpụtara na Nana Akwasi Agyemang-Prempeh amalitela inye CoS maka ọrụ owuwu na mba UK, nke bụ ngalaba ọzọ na-enye ndị mmadụ ohere isi na mba ọzọ were ndị ọrụ. Ọ gbalịrị hibe ụlọọrụ owuwu nke ya ma nata ikike nkwado n'ụlọọrụ Home Office.

Onye ntaakụkọ anyị mere ka a ga-asị na ọ bụ nwaafọ Yuganda na-azụ ahịa bi na mba UK ma chọọ ịkpọta ndị ọrụ owuwu ka ha bịa sonyere ya jụrụ Nana Akwasi Agyemang-Prempeh ma nke ahụ ọ ga-ekwe omume.

Ọ zaghachiri na ọ ga-ekwe omume n'ọnụego £42,000 ($54,000) maka mmadụ atọ.

Nana Akwasi Agyemang-Prempeh gwara anyị na ya banyere n'ọrụ owuwu n'ihi na e tinyere iwu tara akpụ na ngalaba nlekọta ma kwuo na ndị na-akpọpụ mmadụ na-eleba anya na ngalaba ndị ọzọ.

"Ndị mmadụ na-abanyezi na ngalaba IT ugbua," ka Nana Akwasi Agyemang-Prempeh gwara onye ntaakụkọ nzuzo BBC.

Nana Akwasi Agyemang-Prempeh ji ekwentị ya n'aka n'ime ụlọahịa a na-ere kọfị.
Nkọwa foto, Onye na-akpọpụ mmadụ bi na mba UK bụ Nana Akwasi Agyemang-Prempeh abanyela na ngalaba ọrụ owuwu

Gọọmenti anapụla ụlọọrụ karịrị 470 ikikere na ngalaba nlekọta na-agbata ọnwa Julaị na Disemba 2024. Ndị nkwado ahụ e nyere ikikere bụ ha hụrụ maka iwe ndị ọrụ ahụike na ndị nlekọta karịrị 39,000 n'ọrụ malite n'ọnwa Ọktoba, 2020.

Agyemang-Prempeh mechara kwuo ka a kwụọ ya ụgwọ maka asambodo nkwado ndị ahụ bụ nke BBC jụrụ ịkwụ.

Ụlọọrụ Home Office anapụla ya ikikere ugbua. Oge BBC mara ya aka, Agyemang-Prempeh kwuru na e gwuru ya onwe ya chandum dịka ọ na-amataghị na ọ bụ CoS adịgboroja ka ọ na-ere.

N'ozi ha degaara BBC, ụlọọrụ Home Office kwuru na ya enweela "atụmatụ ọhụrụ megide ndị na-enye ohere ọrụ ihere anaghị eme imetọ usoro ahụ" dịka ha "ga-amachi ụlọọrụ ndị na-enupụisi n'iwu na-elekọta ka e si enye mmadụ ọrụ na mba UK ịkwado ndị ọrụ si mba ndị ọzọ".

Nnyocha BBC mere oge gara aga kpughere ụdị chandum visa ahụ nke lekwasara anya na ndị si mba Kerala, India na ụmụakwụkwọ si mbaụwa dị iche iche ndị bi na UK bụ ndị chọrọ ịrụ ọrụ na ngalaba nlekọta.

n'ọnwa Nọvemba 2024, gọọmenti kwupụtara na ya akpachiela ndị chandum si mba ndị ọzọ enye ndị mmadụ ohere ọrụ. Na mgbakwunye, malite na 9 Eprel, ndị na-ahụ maka nlekọta n'England ga-ebu ụzọ were ndị ọrụ nlekọta si mbaụwa nọ anọ na mba UK tupu ha amalite iwe ndị si mba ọzọ.

Otu mere nnyocha: Olaronke Alo, Chiagozie Nwonwu, Sucheera Maguire, Nyasha Michelle, and Chiara Francavilla