You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Okpụrụkpụrụ okwu dị n'akwụkwọ mkpata na mmefụ akụ 2023
Onyeisiala Muhammadu Buhari gụpụtara ihe a ga-eji ego mee na Naịjirịa n'afọ 2023 n'ihu ndị ọgbakọ omeiwu Naịjirịa taa bụ Fraịde 2022.
Nke a bụ bọjetị nke ikpeazụ ya putu ọ pụọ n'ọkwa n'afọ 2023.
Buhari sị na gọọmentị ga-emefụ ego dị tarị Naịra dị N20.51T.
Ego a bụ ego kacha ukwuu Naịjiria mapụtagoro iji rụọ ọrụ kemgbe ụwa.
Aha ya bụ atụmatụ bụ " Budget of Fiscal Sustainability and transition", nke pụtara atụmatụ mkpata na mmefụ akụ nke idozi obodo nakwa nke ngabiga".
Buhari sị na atụmatụ a bụ maka imezi ihe dị oke mkpa nakwa ịme ka inyefe ọchịchị n'aka ndị ọzọ dịkwa nfe.
Ihe a bụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị n'ime ya bụ akwụkwọ ọ gụpụtara a ga-eji ego mee n'afọ ọzọ.
Ego mkpata
- Onyeisiala sị na n'ime ọkpụrụkpụ ego a akpọrọ aha na nke gọọmentị ga-akpatali ha ji aka bụ Tari Naịra 16.87 na 2023.
- Tari Naịra 11.09 bụ nke a ga-ekesa maka ịkwụ ụgwọ na ndị ọzọ.
- Ebe Tari Naịra 9.73 bụ nke a ga-etinye n'ọrụ.
- Ego a rụta n'ọrụ mmanụ agbidi bụ Tari Naịra 1.92.
- Ego ga-esi be ọzọ naabụghị n'ọrụ mmanụ agbidi bụ Tari Naịra 2.43
- Nke ga-esizi n'ahịa ndị ọzọ gọọmentị na-azụ pụta buru Tari Naịra 2.21.
- Ego ga-esikwa ebe ndị ọzọ pụta bụ Ijeri Naịra 762.000 nakwa Ijeri Naịrịa 2.42.
Ego mmefu
- Nke ha kpọrọ "Statutory Transfer" bụ ijeri Naịra N744.11 ebe ọzọ ha kpọrọ "Non-debt Recurrent Costs" bụ Ijeri Naịra N8.27.
- Ụgwọ ọnwa ndị ọrụ na ego ndị lara ezumike bụ Tarị Naịra N4.99 na Ijeri Naịra N854.8.
- Ego a ga-eji rụọ ọrụ ihe mmepe obodo (Ụzọ na ihe ndị ọzọ) traị Naịra N5.35.
- Ego 'overhead' Tari Naịra N1.11
- Ego a ga-eji kwụọ ụgwọ bụ Tarị Naịra 6.31.
- Ego "sinking Fund" ijeria Naịra N247.73
Ego mgbazite
- Ego niile a ga-azite bụ tarị asatọ na iri asatọ (N8.80).
- Ego ga-esi ngwogwo na ọrụ gọọmentị ga-ere nke a kpọrọ "Privatization" bụ Ijeri Naịra narị abụọ na isii na ụma (N206.18).
- Nakwa Ijerị Naịra otu na ụma iri asaa na asaa (N1.77) bụ ega a ga-etibe na mba ofesi.