John Mahama ekwela nkwa iweta mgbanwe na Gana dịka Onyeisiala

John Mahama

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, John Mahama
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

John Dramani Mahama ekwela nkwa na ọchịchị ya dịka Onyeisiala, ga-enweta mgbanwe na ọganihu na Gana.

Mahama, onye ji vootu dị pasenti 56.6 merie Osote Onyeisiala Bawumia nwetara vootu dị pasenti 41.6, kwuru nke a n'okwu nnabata mmeri ya na ntuliaka ahụ e mere ụbọchị Satọde 7, Disemba, 2024.

Mahama gara n'ihu kwuo na mmeri ya gosịrị na ụmụafọ Gana nwere ntụkwasịobi ebe ọ nọ ma kelee ndị Gana maka ịhọpụta nwaanyị mbụ ga-abụ Osote Onyeisiala bụ Jane Naana Opoku Agyemang.

O kelere Osote Onyeisiala Mahamudu Bawumia maka ịnabata mpụtara ntuliaka ahụ.

Oge ọ na-achụ nta vootu, Mahama kwuru na ọchịchị ga-agbanwe ọnọdụ akụnaụba mba Gana.

Onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka na Gana bụ Jean Mensa, kwuru na mmadụ dị pasenti 60.9, pụtara tụọ vootu na ntuliaka ahụ ma kwuo na mmeri pati National Democratic Congress (NDC) bụ mmeri kachasị kemgbe afọ iri na anọ na mba Gana.

A ga-edu John Mahama n'iyi ọrụ dịka Onyeisiala Gana ụbọchị Tuzde, 7 Jenụwarị, 2025.

John Mahama eturula ugo na ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Gana

John Mahama bụbu Onyeisiala mba Gana meriri ịchị nke ugboro abụọ

Ebe foto si, Reuters

Ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Gana bụ Electoral Commission akpọpụtala John Mahama, bụbu onyeisiala mba Gana dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa Onyeisiala e mere n'ụbọchị Satọde 7 Disemba 2024.

Mahama nwetere vootu karịrị pasenti 56 iji merie Osote Onyeisiala Mahamudu Bawumia maara ya aka na ntuliaka ahụ.

Tupu ụlọọrụ 'Electoral Commission akpọpụta aha ya, Bawumia dị mbụ kwuo n'ezie na Mahama emeriela ya ma kelee n'ihi nke ahụ.

A ga-edu Mahama n'iyi ọrụ n'ụbọchị asaa nke ọnwa Jenụwarị 2025.

Ụmụafọ mba Gana na-atụ anya nnukwu ihe site n'aka Mahama, ọkachasị n'ọnọdụ akụnaụba nke mba ahụ dịka ha bu n'obi na ọ ga-eme ka ọ dị mma.

Ntuliaka ahụ gara ọfụma mana e nwere ụfọdụ ọgbaghara dapụtara n'otu ebe maọbụ nke ọzọ

Ndị ọrụ ntuliaka na-agụ mpụtara ntuliaka ahụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ọrụ ntuliaka na-agụ mpụtara ntuliaka ahụ

Ụlọọrụ a malitere ịkpọpụta mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala n'ehihie ụbọchị Mọnde 9 Disemba 2024.

Akụkọ anyị nwetara kwuru na John Mahama enwetela vootu dị pasenti 61 na mpụtara si na mpaghara iri na abụọ a kpọpụtagoro, ebe osote onyeisiala bụ Mahamudu Bawumia nwetara naanị vootu dị pasenti 38

Cheta na Osote Onyeisiala Bawumia nọrọ ụbọchị Sọnde 8 Disemba, kweta na ya kpụrụ afọ n'ala na ntuliaka ahụ ma kelee Mahama maka inweta mmeri.

Mpụtara ga na-apụta dịka EC na-akpọpụta ya. Bikọ gbaa mbọ na-apị peeji a aka iji nweta ya ọkụ ọkụ.

John Mahama

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, John Mahama

Osote Onyeisiala mba Gana bụ Mahamudu Bawumia ji aha New Patriotic Party (NPP) zọọ ọkwa Onyeisiala na ntuliaka ọkwa Onyeisiala anabatala mmeri John Mahama nke pati National Democratic Congress (NDC) meriri ya na ntuliaka ahụ.

Bawumia kwuru na akụkọ ya na-enweta dịka mpụtara ntuliaka na-agba n'anwụ, gosiri na Mahama bụ onye ụmụamaala Gana chọrọ ka ọ bụrụ onyeisiala ọhụrụ ha.

Cheta na ntuliaka a kpọtụụrụ dịka mba Gana na-agba mbọ ịpụta n'ajọ ọnọdụ akụnaụba ha nọ n'ime ya ugbua.

N'agbanyeghị na Bawumia nabatara mmeri Mahama meriri ya, enwebeghị ozi mpụtara ntuliaka ahụ nke ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Electoral Commission (EC) wepụtagoro.

Ndị nkwado John Mahama na-aṅụrị dịka pati ha nwetara mmeri na ntuliaka ọkwa Onyeisiala e mere ụbọchị Satọde 7 Disemba
Nkọwa foto, Ndị nkwado John Mahama na-aṅụrị dịka pati ha nwetara mmeri na ntuliaka ọkwa Onyeisiala e mere ụbọchị Satọde 7 Disemba

Ụlọọrụ EC kwuru na enwere obere ihe mgbochi nye mkpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ maka na ndị nkwado pati Mahama nwetara ọgbaaghara dịka a na-ekwuputa mpụtara ntuliaka ahụ.

Ndị nkwado Mahama ka a hụrụ dịka ha na-aṅụrị na mpaghara ugwu Tamale, Kumasi nakwazi isi obodo Accra.

Mahama kwuru na Osote Onyeisiala Mahamudu Bawumia akpọọla ya n'ekwenti iji keele ya maka inweta mmeri na ntuliaka ahụ.

Ghana presidential election 2024: Lee etu mpụtara ntuliaka a si kwụrụ ugbua

Mahamudu Bawumia na John Mahama

Ntuliaka nke ọkwa Onyeisiala mba Ghana emechiela kpam kpam dịka a na-atụzi anya onye meriri.

Dịka ngalaba na-ahazi ya bụ ntuliaka bụ EC si kwuo, ngụkọ ga-amalite n'ọgbọ ntuliaka dị icheiche.

Cheta na ntuliaka ahụ nke malitere n'elekere asaa nke ụtụtụ n'ụbọchị 7 nke ọnwa Disemba bịara na njedebe n'elekere ise nke mgbede n'otu ụbọchị ahụ kwa.

A na-atụ anya na EC ga-akpọpụta mpụtara ntuliaka ahụ dịka abalị atọ gachara kemgbe amalitere ịgụkọ vootu ndị a tụrụ atụ.