Popu Francis apụtala n'ụlọọgwụ Rome

Mgbe Popu Francis mere mpụta nke mbụ n'ụlọọgwụ Rome

Ebe foto si, APTN

Nkọwa foto, Mgbe Popu Francis mere mpụta nke mbụ n'ụlọọgwụ Rome
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 10

Popu Francis apụtala n'ụlọọgwụ dị na Rome mgbe o mechara mpụta nke mbụ site na wido ụlọọgwọ ahụ. Nke a bụ mpụta nke mbụ ọ na-eme kemgbe ọ nọ n'ụlọọgwụ na 14 Febụwarị 2025.

Popu ahụ dị afọ iri asatọ na asatọ (88) hapụrụ ụlọọgwụ ozugbo ọ pụtachara mana ndị dọkịta ya kwuru na ọ ga-enwe ihe dika ezumike ọnwa abụọ na Vatican.

Otu n'ime ndị dọkịta na-elekọta Popu bụ Sergio Alfieri kwuru na n'ime izuụka ise gara aga, Popu nwere ọnọdụ gbatagbata ugboro abuọ nke tinyere ya na ọnọdụ ihe ize ndụ.

Alfieri kwuru na ọ dịghị mgbe e tinyere Popu Francis na tubu ma na-anọ na nche mgbe niile ma na-atụgharị uche.

Dịka ndị dọkịta ya siri kwuo, a gwọtaghị Popu kpamkpam, mana o nwekwaghị oyi baa mana ọ nọ n'ọnọdụ kwụsiri ike.

Alfieri kwuru na olu ndị ọrịa nwere oyi ịba okpukpu abụọ na-efunahụ ha ntakịrị "karịsịa na ndị agadi, ọ ga-ewe oge tupu olu onye ahụ ịlaghachi.

Akụkọ ụlọọrụ mgbasa ozi Reuters kwuru na Fraịde na Kadịnal Victor Fernandez kwuru na "Oxygen ahụ nke ji ike aga na-akpachapụ ihe niile" n'ihi nke a Popu ga-amụkwa ka esi ekwu okwu",.

Ndị dọkịta kwuru na ọ bụrụ na ọ na-aga n'ihu na-enwete onwe anyị, Popu ga-enwe ike ịlaghachi n'ọrụ ozugbo.

Pope Francis ekwupụtala okwu mbụ ya kemgbe izuụka atọ ọ nọ n'ute ọrịa n'ụlọọgwụ

Aha onyonyo, Gee ntị ka ị nụrụ ihe Pope Francis kwuru dịka ọ nọ n'ute ọrịa

Onye ụka Katọlik n'ụwa bụ Pope Francis ewepụtala ozi nke mbụ ya site n'igwe na-ekwu okwu kamgbe ụbọchị 14 Febụwarị e bugara ya n'ụlọọgwụ.

N'ozi ahụ, Pope kelere ndị mmadụ n'ụwa gbaa gburugburu maka nkwado ha na-enye ya site n'ikpere ya ekpere.

Nke a ga-abụ mbụ a ga-anụ olu nwamadị a dị afọ 88 n'ọha kamgbe ọ banyere n'ụlọọgwụ ebe a na-agwọ ya ọrịa iku ume maka na a chọpụtara na oyi banyere ya na ngụngụ.

E dekọrọ ozi ọdiyo ahụ n'ụlọọgwụ Gemelli dị na Roma ma kpọọ ya n'ọgbakọ ekpere e mere n'abalị n'ama ozuzu St Perter dị na Vatican.

Na mbido izuụka a, ụlọọrụ Vatican kwuru na Pope na-enwete onwe ma sị na ọ na-arịa ọrịa iku ume nke ogogo abụọ, na ọ na-eji igwe na-enyere mmadụ aka iku ume.

N'ihi ọrịa a, Pope akagbuola ọtụtụ emume ndị o kwesịrị ime kamgbe ọ gara n'ụlọọgwụ, nke gụnyere ụbọchị ite ntụ 'Ash Wednesday' na-egosi mmalite emume Easter.

Etu ọnọdụ Pope si dị kemgbe ahụ

Pope Francis

Ebe foto si, Reuters

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Onyeisi ụka Katọlik na mbaụwa bụ Pope Francis dị nkọ dịka ọ rịachara ọrịa metụtara nkubi ume ụgbọrọ abụọ, dịka Vatican si gbaa ama ụbọchị Monde.

Ndị dọkịta gboro ọgụ dịka ha mịsịsịrị ụkwara kochiri ya akpaume mana ọ ọ dị nkọ oge nile nke mere, dịka obi 'Holy See' siri kwuo.

Vatican kwuru na a malitere ịkwụnyere nnukwu ụkọchukwu ahụ gbara afọ 88 ihe e ji eku ume iji nyere ya aka iku ume mana "ọ dị nkọ ma na-eme ihe ndị a gwara ya mee.

Nke a bụ ugboro atọ ya ọnọdụ ahụike Popu na-akpụ afọ n'ala kemgbe abalị 18 ọ rịawara ọrịa 'pneumonia'

Ụbọchị Fraide, Popu Francis nwere nsogbu iku ume na ọgbụgbọ, dịka Vatican siri kwuo.

Ozi si n'obi Ụka Katọlik ụbọchịụka kwuru na ahụ ya na-anabata nleta 'oxygen' a na-enye ya, na ọbụghịkwa igwe oxygen o jibu eku ume.

N'ihi ọnọdụ ahụike ya,Popu Francis enwebeghị ike iidu n'ekpere Angelus kemgbe izụka atọ, kama Vatican na-ewepụta ozi e dere ede.

Ndị ọrụ obi Vatican kwuru na ihe ahụ e dere ede buu nke e si n'ụlọgwụ dee "n'abalị ole na ole gara aga."

N'ime ozi ahụ Popu kelere ndị mmadụ maka ekpere ha ma kelee ndị ọrụ ahụike na-elekọta ya.

Popu agaghị esonye na ngagharị na Missa a ga-eme ụbọchị Wenezde bụ ụbọchị mbụ nke oge 'lent', bụ izụka isii tupu Ista.

Ọtụtụ ndị Katọlik gbakọrọ n'ogige 'St Peter ụbọchị Monde n'abalị asatọ ikpe ekpere maka ahụike Popu. Ọtụtụ na-ekpe rosary' ha dịka ha na-aga Basilica.

O meela izuụka atọ Popu anọghị na St Peter Square

O meela izuụka atọ Popu anọghị na St Peter Square

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, O meela izuụka atọ Popu anọghị na St Peter Square

O meela izuụka atọ nọ n'usoro Onyeisi ụka Katọliki bụ Popu Francis enwebeghị ike ikpe ekpere ọdịnala ndị ụka Katọliki bụ Angelus n'onwe ya, kama Vatican bipụtara akwụkwọozi Popu depụtara.

Vatican kwuru na Popu dere akwụkwọozi ahụ n'akwa ọrịa ya n'ụlọọgwụ ebe ọ nọ na Rome. O dere ya n'abalị ole na ole gara aga.

N'ime ozi ya ahụ, o kelere ndị mmadụ maka ekpere ha na-ekpere ya ma kelekwa ndị otu ahụike na-elekọta ya anya n'ụlọọgwụ.

Dịka o siri kwuo, "Enwere m n'ime obi m 'ngọzi' nke zoro ezo n'ime adịghị ike, maka na ọ bụ n'oge ndị a ka anyị na-amụta karịa ịtụkwasị Onyenwe anyị obi."

O kelere Chineke maka inye ya ohere ikere oke n'anụ ahụ na mmụọ, ọnọdụ nke ọtụtụ ndị ọrịa na ndị na-ata ahụhụ nọọ.

Popu 'kwụsiri ike' mgbe o nwechara nsogbu iku ume n'ụlọọgwụ - Vatican

Mana Vatican kwuru na mgbede ụbọchị Satọde Maachị 1, 2025 na Popu enwebeghị nsogbu iku ume ọbụla ọzọ dịka ọ na-anabata ọgwụgwọ oxygen nke ọma.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mana Vatican kwuru na mgbede ụbọchị Satọde Maachị 1, 2025 na Popu enwebeghị nsogbu iku ume ọbụla ọzọ dịka ọ na-anabata ọgwụgwọ oxygen nke ọma.

Vatican ekwuola na onyeisi ụka Katọliki na mba ụwa niile bụ Popu Francis malitere inwe ọrịa oyi kemgbe izuụka abụọ gara aga, kwụsiri ike dịka o nwechara nsogbu iku ume n'ụbọchị Fraịde 28 Febụwarị 2025.

Popu dị afọ iri asatọ na asatọ malitere ịgbọ agbọọ nke mere ka nsogbu iku ume o nwere kawanye njọ n'ụlọọgwọ n'abalị ahụ mana eji ihe mkpuchi ihu iji nyere ya aka iku ume.

Mana Vatican kwuru na mgbede ụbọchị Satọde Maachị 1, 2025 na Popu enwebeghị nsogbu iku ume ọbụla ọzọ dịka ọ na-anabata ọgwụgwọ oxygen nke ọma.

Ha kwupụtaghị ihe kpatara ọrịa ahụ, mana ha kwuru na Popu mụ anya ma nọgide nke ọma.

Pope Francis na-enwete onwe ya ugbua mana ọ ka nọ n'ụlọọgwụ

Pope Francis, onyeisi ụka Katọlik n'ụwa nọ n'ụlọọgwụ kamgbe 14 Febụwarị, 2025.

Ebe foto si, Reuters

Pope Francis bụ onye nọ n'ute ọrịa n'ihi nnukwu oyi a kpọrọ pneumonia kamgbe izuụka abụọ na-enwete onwe ya ugbua, dịka isiụlọọrụ Vatican si kwuo n'ozi ha wepụtara.

Ọ ga-aga n'ihu nọrọ n'ụlọọgwụ iji na-elekọta ya anya ọfụma ka Vatican kwuru n'ụtụtụ Fraịde.

Ọ gbakwụnyere na nwamadị a dị afọ iri asatọ na asatọ "hiri ụra ọfụma n'abalị" ma "na-ezu ike ugbua" n'ụlọọgwụ Gemelli dị na Rome.

Ụlọọrụ mgbasaozi Ịtali bụ Ansa kwuru na pọntiff esila "n'ogogo ọnọdụ ahụike ọjọọ" pụta dika ozi si n'aka Vatican.

E bugaara Pope n'ụlọọgwụ n'ụbọchị 14 Febụwarị dịka o nwechara nsogbu iku ume n'ime ọtụtụ ụbọchị.

Dịka a na-agwa ya ọrịa a kpọrọ 'bronchitis' e mechara chọpụta oyi bụ 'pneumonia' na ngụgụ ya abụọ.

N'ụbọchị 22 Febụwarị, Vatican kwuru na Pope nwere ọrịa iku ume banyere "ọnọdụ ọjọọ."

N'echi ya, Pope wepụtara ozi ma kwuo ka ndị ụka Katọlik kpeere ya ekpere dịka o nweghi ike ikpe ekpere ọ na-ahazi kamgbe izuụka abụọ.

Foto: Etu ndị mmadụ si ekpere Pope Francis ekpere n'ụwa

Ndị Sista (Nọn) nọ n'ekpere dịka Pope Francis ka nọ n'ute ọrịa n'ụlọọgwụ Gemelli dị na Santa Maria Addolorata, nke obodo Rome, mba Itali n'ụbọchị 25 febụwụarị, 2025

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị Sista (Nọn) nọ n'ekpere dịka Pope Francis ka nọ n'ute ọrịa n'ụlọọgwụ Gemelli dị na Santa Maria Addolorata, nke obodo Rome, mba Itali n'ụbọchị 25 febụwụarị, 2025

Pope Francis ka nọ n'ute ọrịa, dịka Vatican si kwuo n'ozi banyere ahụike ya, nke ha kwuru na o nwere ọrịa iku ume nakwa ọrịa ngụgụ.

N'ụwa niile gbaa gburu gburu, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekpere Pọntiff ekpere ka ọ gbakee n'ute ọrịa.

Na Vatican, ndị mmadụ gbakọtara n'ọgbọ St. Peters.

Ndị mmadụ bucha obe n'ọgbọ St. Peters dị na Vatican n'ụbọchị 26 Febụwarị 2025

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị mmadụ bucha obe n'ọgbọ St. Peters dị na Vatican n'ụbọchị 26 Febụwarị 2025
Mmadụ ji foto Pope Francis n'aka n'ọgbọ St. Peters dị na Vatican n'ụbọchị 26 Febụwarị, 2025

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Mmadụ ji foto Pope Francis n'aka n'ọgbọ St. Peters dị na Vatican n'ụbọchị 26 Febụwarị, 2025
Ndị ụkọchukwu sonyere n'ekpere 'rosary' n'ihi Pope Francis n'ọgbọ St. Peters dị na Vatican n'ụbọchị 24 Febụwarị, 2025.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ụkọchukwu sonyere n'ekpere 'rosary' n'ihi Pope Francis n'ọgbọ St. Peters dị na Vatican n'ụbọchị 24 Febụwarị, 2025.
Onye ụkọchukwu ji 'rosary' n'aka na St. Peters basilica tupu amalite ekpere maka ahụike Pope Francis na Vatican n'ụbọchị 24 Febụwarị 2025

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Onye ụkọchukwu ji 'rosary' n'aka na St. Peters basilica tupu amalite ekpere maka ahụike Pope Francis na Vatican n'ụbọchị 24 Febụwarị 2025
Ndị mmadụ sonyere n'ekpere 'rosary' nke odeakwụkwọ Steeti Vatican bụ Pietro Parolin haziri n'ọgbọ St. Peters dị n'obodo Vatican n'ụbọchị 24 Febụwarị, 2025

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị mmadụ sonyere n'ekpere 'rosary' nke odeakwụkwọ Steeti Vatican bụ Pietro Parolin haziri n'ọgbọ St. Peters dị n'obodo Vatican n'ụbọchị 24 Febụwarị, 2025

In Rome, flowers and tributes were left outside the Gemelli Polyclinic, where the Pope is being treated.

Ndị mmadị kpere ekpere n'ihu akpụrụakpụ Pope John Paul nke abụọ dị n'ihu ụlọọgwụ Gemelli dị na Rome ebe Pope Francis na-anata ọgwụgwọ.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị mmadị kpere ekpere n'ihu akpụrụakpụ Pope John Paul nke abụọ dị n'ihu ụlọọgwụ Gemelli dị na Rome ebe Pope Francis na-anata ọgwụgwọ.
Ndị mmadị kpere ekpere n'ihu akpụrụakpụ Pope John Paul nke abụọ dị n'ihu ụlọọgwụ Gemelli dị na Rome ebe Pope Francis na-anata ọgwụgwọ.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị mmadị kpere ekpere n'ihu akpụrụakpụ Pope John Paul nke abụọ dị n'ihu ụlọọgwụ Gemelli dị na Rome ebe Pope Francis na-anata ọgwụgwọ.
Ndị Sista (Nọn) na-ekpe ekpere n'ihu akpụrụakpụ Pope John Paul nke abụọ dị n'ihu ụlọọgwụ Gemelli dị na Rome ebe Pope Francis na-anata ọgwụgwọ n'ụbọchị 24 Febụwarị, 2025

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị Sista (Nọn) na-ekpe ekpere n'ihu akpụrụakpụ Pope John Paul nke abụọ dị n'ihu ụlọọgwụ Gemelli dị na Rome ebe Pope Francis na-anata ọgwụgwọ n'ụbọchị 24 Febụwarị, 2025
Ụtụ okoko osisi, foto, kandụl na eserese e dosara n'okpuru akpụrụakpụ Pope John Paul nke abụọ n'ihu ụlọọgwụ Gemelli dị na Rome ebe Pope Francis na-anata ọgwụgwọ.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụtụ okoko osisi, foto, kandụl na eserese e dosara n'okpuru akpụrụakpụ Pope John Paul nke abụọ n'ihu ụlọọgwụ Gemelli dị na Rome ebe Pope Francis na-anata ọgwụgwọ.

Achịbishọp nke obodo Buenos Aires bụ Jorge Garcia Cuerva, haziri ofufe na ekpere maka ahụike Pope.

A mụrụ Pope Francis n'obodo ahụ ma bụrụkwa Achịbishọp n'afọ 1998.

Achịbishọp nke obodo Buenos Aires bụ Jorge Garcia Cuerva, haziri ofufe na ekpere maka ahụike Pope na Buenos Aires dị n'Ajentina n'ụbọchị 24 Febụwarị, 2025.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Achịbishọp nke obodo Buenos Aires bụ Jorge Garcia Cuerva, haziri ofufe na ekpere maka ahụike Pope na Buenos Aires dị n'Ajentina n'ụbọchị 24 Febụwarị, 2025.
Otu nwoke ji foto Pope Francis n'ofufe e fere maka ahụike ya n'ọgbọ Constitution dị na Buenos Aires dị n'Ajentina n'ụbọchị 24 Febụwarị, 2025.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Otu nwoke ji foto Pope Francis n'ofufe e fere maka ahụike ya n'ọgbọ Constitution dị na Buenos Aires dị n'Ajentina n'ụbọchị 24 Febụwarị, 2025.
Otu nwaanyị ji ihe ngosi aha Pope Francis n'ofufe a haziri maka ahụike ya n'ọgbọ Constitution dị na Buenos Aires dị n'Ajentina n'ụbọchị 24 Febụwarị, 2025.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Otu nwaanyị ji ihe ngosi aha Pope Francis n'ofufe a haziri maka ahụike ya n'ọgbọ Constitution dị na Buenos Aires dị n'Ajentina n'ụbọchị 24 Febụwarị, 2025.

Ndị mmadụ kpere ekpere n'obodo Guatemala.

Ndị mmadụ na-ekpe ekpere n'ofufe e fere maka ahụike Pope Francis na Metropolitan Cathedral dị n'obodo Guatemala n'ụbọchị 23 Febụwarị, 2025.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-ekpe ekpere n'ofufe e fere maka ahụike Pope Francis na Metropolitan Cathedral dị n'obodo Guatemala n'ụbọchị 23 Febụwarị, 2025.

Otu nwaanyị bere akwa n'oge ofufe e mere n'aha nwafọ Venezuela bụ Jose Gregorio Hernandez e ji "dọkịta ndị ogbenye" maara, mgbe Pope Francis kwadoro ka e mee ya Kanọn n'obodo Caracas dị na Venezuela.

Otu nwaanyị bere akwa n'oge ofufe e mere n'aha nwafọ Venezuela bụ Jose Gregorio Hernandez e ji "dọkịta ndị ogbenye" maara, mgbe Pope Francis kwadoro ka e mee ya Kanọn n'ụbọchị 25 Febụwarị, 2025.

Ebe foto si, Reuters

N'obodo Mumbai dị na mba India, onye nka sere Pope iji gosi etu ọnọdụ ahụike ya si emetụta ya.

Otu nwoke sere foto Pope Francis n'obodo Mumbai dị na mba India n'ụbọchị 24 Febụwarị, 2025.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Otu nwoke sere foto Pope Francis n'obodo Mumbai dị na mba India n'ụbọchị 24 Febụwarị, 2025.