Photo: Etu emume nkwanye ugwu ikpeazụ nke Pope Benedict XVI si aga na Vatican

Pope Benedict XVI

Ebe foto si, Vatican

Nkọwa foto, Ahụ Pope Benedict XVI dị n'ime ụlọụka na Vatican dịka ndị mmadụ na-abịa ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ

Puku kwuru puku mmadụ gbakọrọ na Basịlịka Peter dị asọ na Vatican taa bụ Tuzde iji kwanyere Pope Benedict XVI ugwu ikpeazụ tupu olili ya.

Benedict XVI bụ onye chịburu ụka Katọlik n'ụwa niile lara mmụọ n'abalị ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba 2022 dịka ọ gbara afọ 95.

Pope Benedict XVI

Ebe foto si, Getty Images

Ndị mmadụ kwụrụ n'ogologo ahịrị malite n'ogige St Peter's Square wee ruo n'ime ụlọụka ebe ahụ Pope Benedict XVI dina n'elu 'Altar of Confession' nke bụ ebe akụkọ kwuru na e liri Peter dị asọ.

Ọtụtụ mmadụ ga-enwe ohere ịhụ Benedict anya ikpeazụ ruo ụbọchị Tọzde oge a ga-akara ya ụka ọnwụ ma lie ya

Vatican

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị mmaọ̄ụ kwụrụ n'ogologo ahịrị iji hụ ahụ Pope Benedict XVI

Benedict nke iri na isii gbara arụkwaghịm afọ iri gara aga dịka Pope maka ahụike ya.

Ọ bụ n'ụbọchị Tọzde ka a ga-eme emume olili ya nke osote ya bụ Pope Francis ga-eme emume olili ya. Nke a bụ mbụ Pope na-eme emume pope ọzọ.

Pope Emeritus Benedict XVI

Ebe foto si, VaticanNews/Twitter

Foto Pope Benedict

Ebe foto si, Reuters

A ga-egozi ozu abalị atọ ya ka ndị mmadụ kwanyere ya ugwu ikpeazụ.

Ọ bụ na St Peters Square ka a ga-eme emume olili ya ma lie ya n'ogige a na-eli ndị mmadụ na Basilica.

Ihe Ị kwesịrị ịma dịka Pop Benedict XVI lara mmụọ n'afọ 95
Pope Benedict XVI

Ebe foto si, PA Media

Onye bụbu Poopụ ụka katọlịk bụ Benedict XVI alaala mmụọ n'afọ 95.

Ọ nwụrụ n'ụlọ obibi ya na Vatican dịka o ji ihe ji afọ ole m ole ka afọ 10 ruo mgbe ọ rituru n’ọkwa ya.

 O duru Ụka Katọlik n’ụwa ihe na-erughị afọ asatọ tupu n’afọ 2013, ọ rịtuo na ya bụ ọkwa.

Nke a mere ya Poopụ mbụ gbara arụkwaghịm n’ọkwa ahụ kemgbe Gregory XII mere ihe dị etu ahụ n’afọ 1415.

 Benedict nọrọ afọ ikpeazụ ya na ebe obibi ndị nsọ mọnk nke Mater Ecclesiae dị n'ime mgbidi Vatican.

Pope Francis nọchiri anya ya kwuru na ọ gara ebe ahụ lete ya anya ugboro ugboro.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Onye bụbu Poopụ ụka katọlịk bụ Benedict XVI

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Onye bụbu Poopụ ụka katọlịk bụ Benedict XVI

Isi ụka Katọlịk nke Vatican kwuru n’ozi ọkwa ọnwụ ya:

“Ọ bụ obi mwute ka anyị ji agwa ọha na onye bụbu Poopụ bụ, Benedict XVI, nwụrụ taa n’ebe elekere itoolu n’ọkara n’ụlọ ndị nsọ nke Mater Ecclesiae Monastery na Vatican."

 "A ga-enye ozi ndị ọzọ n’oge adịghị anya.”

Ha kwuru na a ga-ebupụta ozu ya maka ife aka ikpeazụ n’ama ụka St. Peter’s Basilica malịte n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụị̀arị 2023 nke bụ ‘Ikele ikpeazụ ndị nso nso ya.”

A ga-ama ọkwa atụmatụ niile gbasara akwamozu ya n’awa ole m ole dịka isi ụka katọlịk nke Vatican siri kwuo.

N'agbanyeghị na onye bụbu Poopu nọ na-arịa ọrịa kemgbe, na nso nso a, ndị isi ụka Katọlịk wepụtara ozi na-ekwu na ya bụ ọnọdụ kwanyere njọ n’ihi na ọ kaala nka.

Ụfọdụ ihe banyere Benedict XVI

N’ụbọchị Wenezde, Pope Francis rịọrọ ndị na-ege ya ntị ikpeazụ nke afọ a n’ọgabkọ e mere na Vatican ka ha “kpee ekpere pụrụiche maka onye bụbu Poopụ bụ Benedict”, onye o kwuru na ọ na-arịa ezigbo ọrịa.

A mụrụ Joseph Ratzinger na Germany, Benedict dị afọ 78 mgbe 2005 ọ rigọrọ n’ọkwa Poopụ nke mere ya otu n’ime ndị Poopu kacha ochie a họpụtara na ya bụ ọkwa.

N’oge ochịchị ya dịka Poopu, Ụka Katọlik danyere n’ebubo dị iche iche nke gụnere ebubo metụtara ịda iwu nakwa ebubo mmetọ ụmụaka sitere n’aka ndị ụkọchukwu nke a si mere n’afọ ole m ole gara aga.

N’ebe mbido afọ a, ọ kwetara na e mehiere n’ihe gbasara etu e si leba anya n’okwu mmetọ ụmụaka mgbe ọ bụ achịbishọp nke Munich n’etiti 1977 na 1982.