Nchọpụta egosila na Pope Benedict XVI emeghi ihe ọbụla maka mkpesa mmetọ ụmụaka anọ e kpesaara ya

Pope Bendict XVI

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Poopu Benedict nke XVI n'ụbọchị 19 Epreelu 2005. Ebe a ọ na-efe igwe mmadụ aka n'obodo Vatikan.

Nchọpụta egosila na enweghi ihe Pope Benedict nke iri na isii bụbu onyeisi ụka Katọlik, mere maka okwu mwakpo ụmụaka anọ e kpesara n'aka ya oge ọ bụ Achbishọp nke Munich.

Pope Benedict nọ n'ọkwa ahụ site n'afọ 1977 ruo 1982, agbụrụla aka ya n'ebubo ahụ mere mgbe ahụ ọ na-abụbeghi Pope.

Otu ụlọọrụ ndị ọkaiwu nọ na mba Jamini bụ ndị nzukọ Katọlik goro ka ha mee ya bụ nchọpụta.

Ha sị na nchọpụta ha gosiri na ya bụ Poopu aha ya bụ Josef Ratzinger mgbe ahụ, nọ n'ụlọ ya bụ ewu mụọ n'ọgbụ n'aka ụmụaka anọ ahụ.

Nke ka njọ bụ na ndị ụkọchukwu mere arụ a ka nọkwa n'ụka na-ekpori ndụ ka ọ nweghị ihe mere.

Poopu Benedict XVI gbara afọ 94 ugbua, bụ Poopu mbụ gbara arụkwaghị m kemgbe afọ narị isii (600), mgbe o mere ya n'afọ 2013.

Ọ sị na ọ bụ maka ike ọgwụgwụ ka ya ji tinye ya bụ akwụkwọ arụkwaghị m.

Pope Bendict XVI

Ebe foto si, Reuters

Ihe dị n'akwụkwọ nchọpụta

Ndị ọrụ wepụtara ya bụ akwụkwọ nchọpụta bụ ndị a kpọrọ Westpfahl Spilker Wastl n'asụsụ Jamini.

N'ime ya, Ọkaiwu Martin Pusch kwuru na, "ikpe abụọ maka mmetọ ụmụaka a mere mgbe ọ nọ n'ọchịchị nke steeti kewapụrụ ndị mere ya. N'ikpe abụọ ahụ ndị kpara ya bụ arụ ka nọ n'ụka".

Otu mgbe, e boro ya na ọ ma maka otu ụkọchụkwụ metọrọ nwa nwoke bụ ndị ezitere na dayọsis ya, mana onweghị ihe o mere fada ahụ.

Akụkọ kwuru na Poopu Benedict edegarala ndị ọrụ nchọpụta a ọtụtụ akwụkwọ na-aja ha ike maka ezigbo ọrụ ha ma gọọ na ụkwụ na na aka ya emetụghị ụtụ chara acha na ya bụ okwu.

Akwụkwọ nchọpụta a gosiri na ya bụ Poopu nọ n'ọgbakọ ebe a na-akpa maka ya bụ okwu ma nyụọ ntị mmanụ.

Ihe Vatikan mere

Vatican sị na ha ga-eleba ya bụ akwụkwọ anya mgbe e biputara ya.

Akwụkwọ nchọpụta ọzọ e biputaburu na-ekwụ na-achọpụtara mmetọ ndị ụkọchukwu mere karịrị 3,600 kemgbe afọ 1946 ruo 2014.

Ọtụtụ n'ime ndị e metọrọ bụ ụmụnwoke ndị Bekee kpọrọ 'mass servants".

Akwụkwọ nchọpụta ọhụrụ a e mere na mpaghara Munich na Freising hụrụ na e metọrọ ihe ruru mmadụ 497 site n'afọ 1945 ruo 2019.

Cardinal Reinhard Marx

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ebe Cardinal Marx na-agwa ndị ntaakukọ okwu ka e wepụtachara akwụkwọ nchọpụta ahụ na Munich n'ụbọchị Tọzde

Ọ bụghịkwa naanị Poopu a ka e boro ebubo a, ya bụ nchọpụta na-arụjere achbishọp nke mpaghara ahụ bụ Kadịnal Reinhard Marx aka ọjọọ, sị na ọ gbara nkịtị na mmetọ abụọ.

Ya bụ Kadịnal etinyelarị akwụkwọ arụkwaghị m maka ya bụ ebubo kemgbe Juun afọ 2021, sị na ya kwesịrị ịketa n'ụta mmetọ ndị a, mana Pope Francis ekweghị anabata akwụkwọ ya.

Mana mgbe gara aga Pope Francis emegharịala iwu e tiri maka imetọ ụmụaka, ime ka ahụhụ so ya tawanye akpụ.