Ihe ụmụ mmadụ kwuru maka ogbugbu ndị ojiegbe gburu ndị uweojii n'Enugwu

Ebe foto si, Screenshot, BBC
Akụkọ kwuru na ọ bụ ndị uweojii abụọ nwụrụ na mwakpo ndị ojiegbe mere n'ogige Zik Avenue dị n'Enugwu Steeti.
Oge BBC Igbo rutere n'ụlọahịa ọgwụ a kpọrọ "Uzoho Pharmacy", ndị bi gburugburu ebe ahụ kọọrọ anyị ihe ha hụrụ.
Maazị udensi Jude bi nso n'ụlọụka Christ Church Uwani kwuru na njinji ahụ jiri mgbe o ji ihe dịka ọkara gaa elekere asatọ nke abali n'ụbọchi 27 Disemba 2025.
Ọ sịrị "Ọ bụ n'ụbọchi 27 Disemba 2025 ka anyị nụrụ gbowaa gbowaa… na mkpu akwa, nke mere anyị jiri chee na ọ bụ ụmụaka na-agba "knockout".
"O teghị aka, e tisiwe mkpu ike, ọkụ na-enwu, mgbe ahụ ka onye ọbụla bidoro gbawa ọsọ," ka Maazị Udensi gwara BBC.
Onye ọzọ bi nso n'Uzoho Pharmacy kwuru sị: "N'ụbọchị ahụ, ha karịrị mmadụ anọ wakpoo ndị uweojii ebe ha na-eche nche".
"Ha gbagburu ndị uweojii abụọ ma napụ ha egbe. Tupu enyemaka abịa, ha buuru egbe ndị ahụ gbaa ọsọ, ma mụnye ụgbọala nchekwa ndị uweojii ahụ ọkụ," ka ọ kọọrọ anyị.
Anyị chọpụtara na o teghi aka, ndị uweojii na ndị ọ dị n'aka mere ngwangwa bupụ ozu ndị uweojii ahụ nakwa ụgbọala ha a gbara ọkụ.
Ka ọ dị ugbua, naanị unyi na ụfọdụ akụkụ ụgbọala gosiri ihe ahụ merenụ. Ụlọahịa ọgwụ ahụ bụ Ụzoho ka kpọchikwara akpọchị.
Anyi ezipụla ozi jụọ ndị uweojii Enugwu Steeti ka ya bụ ọdachi siri mee, mana ruo ugbua ha azaghachibeghị.









