Oziahia Bokku: Lee ihe ARCON, ndị ọkachamara n'oziahịa kwuru maka oziahịa na-ese okwu

Bokku

Ebe foto si, Screengrab

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị ọkachamara n'ihe gbasara oziazụmahịa (advertising) ekwuola na ozi azụmahịa nke ọdọahịa Bokku wepụtara na nsonso bụ "akaọrụ ndị amaghị ọrụ".

Na nsonso a ihe onyonyo nke bụ ozi azụmahịa nke ụlọahịa Bokku kpalitere esemokwu na soshal midia dịka ọtụtụ ndị si Ọwụwa Anyanwụ katọrọ ya dịka ozi akpọmasị megide ndị mpaghara ahụ.

N'ụbọchị Tọzde 30 Ọktoba, 2025, ngalaba gọọmentị na-ahụ maka ịhazi ozi azụmahịa na Naijiria bụ Advertising Regulatory Council of Nigeria(ARCON) gbarụrụ ihu n' ozi azụmahịa ahụ nke ọ sịrị "kpalitere mkparị megide otu akụkụ Naijira".

Ozi ahụ gara n'ihu kwuo na Bokku "ewetaghịrị anyị ozi azụmahịa ahụ na ndị ọzọ ha mere ma kesaa na soshal midia ka anyị tulee ha tupu ha ewepụta ya, dịka ọ dị n'iwu."

Akwụkwọ ozi ụlọọrụ ARCON wepụtara banyere oziahịa ahụ Bokku wepụtara

Ebe foto si, ARCON

Nkọwa foto, Akwụkwọ ozi ụlọọrụ ARCON wepụtara banyere oziahịa ahụ Bokku wepụtara

Bokku gara koro nnukwu nsogbu n'ihi ozi ahazIghị nke ọma - Kayode Ebatimehi

Kayode Ebatimehi bụ onye maara ihe ekwe na-akụ banyere imepụta na ikesa ozi azụmahịa

Ebe foto si, Kayode Ebatimehi

Ọkachamara n'okwu ozi azụmahịa mabụrụkwa onye nwe ụlọrụ Bluebird Communication, Kayode Ebadimehi katọrọ ozi ahụ maka na "Ọ kparịrị otu akụkụ ala anyị bụ ihe ozi azụmahịa ekwesịghị ibụ."

"Ọ bụ nnukwu nsogbu ka Bokku gara koro ọ bụghị nanị na ọ bụ ozi azụmahịa ahazighị nke ọ ma, ọ dakwara nnukwu iwu Naijiria maka na ha ezigaghị ARCON ozi ahụ ka ha binye ya aka tupu ha ewepụta ya."

Ndị nwe Bokku kwesịrị ịrịọ mgbaghara - Lanre Adisa

Lanre Adisa

Ebe foto si, Lanre Adisa

Otu oonye bụ ọkachamara n'okwu ozi azụmahia (advertising) ma bụrụkwa onye nwe ụlọọrụ 'Noah's Ark' bụ Lanre Adisa kwuru sị, "Ha kwesịrị ịrịọ mgbaghara."

"Ha nwerekwara ike gaa zute ndị ndu ozi ha metụtara."

Etu okwu si bido

Njirimara ọdọahịa Bokku

Ebe foto si, Screengrab

Mana Ụlọọrụ Bokku arịọla mgbaghara ma kwuo na ọ bụghi ihe e ziri onye wepụtara ozi ka o kwuru.

Ozi ha nyere ụlọ ntaakụkọ Guardian kwuru si,"Gbagharanụ anyị maka ihe onye a na-anu aha ya kwuru, anyị bụ ndị na-akwado Naijiria n'ihe nile anyị na-eme,"

Ihe onyonyo bụ ozi azụmahịa si n'aka Bokku na-agba ka ndị mmadụ bịa zụrụ agwa na garị Ijebu n' ọdọ Bokku kpalitere iwe dịka ụfọdụ ndị mmadụ katọrọ ihe ihu e ji ere ahụ kwuru banyere ndị Ọwụwa Anyanwụ.

Ozi ahụ kpalitere iwu ụfọdụ ndị mmadụ ndị katọrọ ya, ebe ụfọdụ kpọrọ oku ka a kwụsị ịzụ ahị n'ọdọ ahịa Bokku.