Ihe i kwesịrị ịma maka iwu nwereike igbochi ndị dọkịnta ịhapụ Naịjirịa achụ akaraka ha n'ofesi
Atụmatụ iwu ọhụrụ pụtara n'ụlọomeiwu nta Naịjirịa na nso nso a nke a kpọrọ 'Medical and Dental Practitioners Act (Amendment) Bill, 2022'.
Iwu a agafela ngụpụta nke abụọ n'ụlọomeiwu ahụ.
Ọ bụ omeiwu Ganiyu Johnson chepụtara iwu a dịka o kwuru na ọ chọrọ ka Naịjirịa mee ya iwu ka a ghara inye ndị dọkịnta nakwa ndị dọkịnta eze natara ọzụzụ n'ụlọakwụkwọ Naịjirịa ọbụla ikike ịrụ ọrụ n'uju naanị ma ha rụọ ọrụ na Naịjirịa ruo afọ ise.
O kwuru na nke a a bụ ihe kwụsịlata ọpụpụ ndị dọkịnta Naịjirịa na-eme aga mba ofesi amalite ọrụ.
Johnson ruturu aka na ntuziaka otu ahụike ụwa bụ WHO nyere nke wepụtara ọnụ ọgụgụ ndị ọrụ ahụike mba ọbụla kwesịrị ma a tụnyere mmadụ ole nọ na mba ahụ.

End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Otu ndị dọkịnta Naịjirịa kwuru na ha ga-ebuso iwu a agha ma chọọ ịkwenyere ya dịka ha kwuru na gọọmentị kwesịrị ịchọ ụzọ kwalie ọdịmma ndị ọrụ ahụike na Naịjirịa nke ha kwuru bụ isi sekpu ntị na mgbapụ ndị dọkịnta na-eme aga mba ofesi.
Okwu a ka na-akpọtu n'ụlọ omeiwu Naịjirịa dịka a na-eche ima ma ọ ga a ghọọ iwu kpom kwem ka a ga-akụchapụ ya.
Kirie ihe onyonyo nọ n'elu akụkọ a ka ị ghọta ihe niile dị mkpa banyere okwu a na-akpọtụ ugbua.


