Ihe mba Kanada na-ekwu maka nabata otu nde ndị Naịjirịa

Onye njem

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọọrụ na-ahụ maka nabata na ọpụpụ ndị mmadụ na Kanada ekwuola na ọtụtụ ndị mmadụ na-agbasa ozi ụgha banyere atụmatụ ọhụrụ ha wepụtara iji nabata ndị mbịarambịara na mba ha.

Ozi a nke si n’akara Twitter ụlọọrụ a kwuru:

“Anyị hụrụ na ọtụtụ na-agbasa ozi nke na-arụ aka na mba Kanada chọrọ ịnabata otu nde ndị Naịjirịa. Nke a bụ akụkọ ụgha, enweghị atụmatụ nabata anyị kwuru nke a.”

E nwereike ịbụ na ọtụtụ ghọtaghere ozi mbụ mba zipụta bụrụ banyere atụmatụ nabata ndị ọbịa nke ha kwuru ga-adị iri ruo afọ 2025.

Nke a emeela ọtụtụ ji ajụzị 'Kedụ nke bụ eziokwu n'okwu a?'

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Immigrants to Canada

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị mbịarambịara na mba Kanada

Lee nke bụ eziokwu n'okwu nabata ndị mbịarambịara

Mba Kanada ekwuola na ha ga-anabata ndị mbịarambịara ruru nde 1.45 n'ime afọ 2023 ruo 2025.

Ha ekwughi na ọ ga-abụ naanị ndị Naịjirịa kama ha kọwara na nke a ga-abụ ohere dịịrị mmadụ niile ruo afọ 2025.

Etu ha si hazie atụmatụ a bụ ịnabata ndị mbịarambịara ọnụọgugụ ha ruru puku 465 n'afọ 2023, puku 485 na 2024, nakwa puku 500,000 na 2025.

N'afọ gara aga, mba Kanada nabatara ndị mbịarambịara ọnụọgụgụ ha ruru puku 405.

Onyeisiala mba Kanada bụ Justin Trudeau kwuru na ndị mbịarambịara so na otu ihe na-ebuli ọnọdụ akụnụba mba ha n'ihi na ọ na-enye ndị nwere ụlọọrụ ohere ịchọta ezigbo ndị ga na-arụrụ ha ọrụ

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

Mịnịsta na-ahụ maka ndị mbịarambịara na mba Kanada bụ Sean Fraser kwuru na n'oge na-adịghị anya ndịọrụ niile dị na mba ahụ ga-abụzi ndị mbịarambịara.

Na ngụkọ mmadụ e mere n'ọdịnso a, a chọpụtara na otu n'ime ndịọrụ anọ na Kanada bụ ndị si mba ọzọ bata.

Kanada bụ mba kacha nwee ọnụọgụgụ ndị mbịarambịara n'ime mba niile so n'otu G7.

Ha kwuru na nke a bụ maka na ọnụọgụgụ ndịọrụ na-agbada agbada na mba ahụ, ọzọ kwa bụ na ọtụtụ ndị Kanada akawala nka.

Ọkọlọtọ mba Kanada

Gịnị mere ndị mmadụ ji agbapụ na Naịjirịa

Ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa na-apụ aga mba ofesi dị icheiche ugbua; nke a abụghị ihe ọhụrụ mana ọtụtụ ndị okwu akụnụba doro anya na-ekwu na ọ bụ n'ihi ihe isiike karịrị akarị ka ọnụọgugụ ndị na-apụ ji arịwanye elu.

Mba ebe ọtụtụ ndị Naịjirịa na-agakarị gụnyere UK, Amerịka, Kanada, Ọstrelịa, na ndị ọzọ

"Ọnọdụ akụnụba Naịjirịa ugbua ajọka, ihe siri ike nke ukwuu, ndị mmadụ enweghịzị nchekwube na Naịjirịa n'ihi gọọmentị ọjọọ, ọ bụ ya kpatara ọtụtụ ji agbapụ," Aisha Yesufu, onye a ma ama maka ịkwalite ikike dịịrị mmadụ, gwara BBC.

Mana oge ụfọdụ, ọbụchaghịkwa ihe akịilu na-ada n'ọnụ ka ọ na-atọ n'ụtọ.

Otu nnyocha BBC mere gosiri etu ụfọdụ ndị dọkịta si mba Naịjirịa si arụ ọrụ dịka ohu n'ụlọọgwụ ndị dị na Briten.

Ihe ndị ọzọ mere ndị mmadụ ji agbapụ gụnyere:

  • Ọnọdụ nchekwa ọjọọ
  • Ọnọdụ ahụike ọjọọ, nke mere ọnwụ ji arị elu
  • Ọnọdụ agụmakwụkwọ ọjọọ
  • Enweghị ọkụ latrik, nke na-emekpa ndị nwere ụlọọrụ nta ahụ
  • Mmekpa ahụ n'aka ndịọrụ nchekwa