You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe Uche Mefor kwuru maka nchọta Biafra na 2023
Onye bụbu osote onyeisi otu Indigenous People of Biafra bụ Uche Mefor ekwuola ka ndị mmadụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ saa anya na mmiri ma ghara ikwe ka onye ọbụla ghọgbuo ha n'ihi okwu ịchọta Biafra.
Mefor kwuru nke a n'ozi o zipụrụ site n'akara soshal midia ya n'ụbọchị Satọde, ma kwuo na "onye ọbụla na-ekwu na a ga-enweta Biafra na 2023 bụ ezigbo onye asị".
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị na-azọ maka nnwereonwe Biafra na-agwa ndị mmadụ na Biafra ga-abịarịrị na 2023.
Ụfọdụ ndị na-ekwu nke gụnyere nwa amadị a na-akpọ Simon Ekpa, onye bi na mba Finland, ma si ebe ahụ na-achịkọta otu ngalaba Ipob na Naịjirịa.
Biafra agaghị abịa na 2023 - Mefor
"Ekwubuola m mbụ na Biafra agaghị abịa na 2023, mana achọkwara m ikwu ya ọzọ ugbua," Mefor kwuru.
"Onye ọbụla na-ekwu na agaghị enwe ntuliaka na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'ihi Biafra, bụ onye Biafra.
"Anyị esobuola ụzọ dị otu a na mbụ, mana ọ mịtaghịrị anyị mkpụrụ ọbụla, Anyị kwesịrị iji ihe mere mbụ mụta ihe.
"Okwesịghị ka a na-ahụta ndị Biafra dịka ndị na-akwatụ ọchịchị onyekwuo uche ya, nakwa njirimara gọọmentị.
"Onye ọbụla na-agwa gị na ọgbaaghara na aka ike bụ ihe a ga-eji nweta Biafra, wepụ onwe gị n'ebe onye dị otu ahụ nọ.
"Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Biafra bụrụ obodo e ji ama atụ, anyị ga-ebido ugbua na-agbaso usoro iwu na ịkwụba aka ọtọ."
Mefor kwuru na ọ bụ eziokwu na nchekwa onwe bụ ihe iwu kwadoro, "mana ịga weta ngwaọgụ were ya na-egbu, na-awakpo, ma na-eyi ndị Biafra ibe gị egwu, nke ahụ abụghị ihe a ga-anabata".
Ọ gara n'ihu kọwaa, na tupu okwu nnwereonwe Bifra enwee isi, a ga-enwerịrị mba ọzọ na-akwado ya bụ okwu nnwereonwe, nke a na-akpọ 'Patron state' na bekee.
Ọ bụ mba dị otu a ga na-ekwu okwu n'otu United Nations iji nye nkwado ka mba Biafra nọọrọ onwe ya, Metu kọwara.
Mana ọ bụrụ na mwakpo, ogbugbu, iyi ndụ egwu ka na-aga n'ihu na mpaghara Biafra dịka ọ dị ugbua, onweghị mkpụrụ ọbụla ọ ga-amịta.
Mefor kwukwara na ọ ka mma ka ndị niile na-achọ nnwereonwe Biafra banye ndọrọndọrọ ọchịchị iji si ụzọ ahụbanye ọchịchị ma nwee nkwuwa okwu nke ụwa niile ga-anụ.
Ebee bụ Biafra?
Ebe a na-akpọ Biafra bụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, ndị kewapụrụ na Naịjirịa n'afọ 1967, nke butere agha a lụrụ ihe ruru ọnwa iri atọ.
Naịjirịa meriri ya bụ agha, nke mere ka Biafra nọgide n'ime Naịjirịa.
Ọ gafeela afọ 50 kamgbe a lụchara agha Biafra, mana ọtụtụ ndị bi na mpaghara ahụ ka na-achọ ikewapụ na Naịjirịa.
Ha na-ebo ebubo na gọọmentị Naịjirịa na-emegbu ha ma na-akpazo ha agwa ịkpaoke n'ụzọ dị icheiche.
Mana ka ọ dị ugbua, ọtụtụ mpaghara nọbụ na Biafra n'oge a lụrụ agha, ekwuola na ha chọziri ịnọ na Naịjirịa.
Kedụ ndị bụ IPOB?
Enweela otu dị icheiche pụtara ịzọ maka nnwereonwe Biafra, ha gụnyere 'Movement for the Actualization of the Sovereign State of Biafra' (Massob), 'Biafra Zionist Movement' (BZM), nakwa 'Indigenous People of Biafra (Ipob).
Onye hibere Ipob bụ Nnamdi Kanu, ọ bụkwa ya bụ onyeisi otu ahụ, mana gọọmentị Naịjirịa na-ahụta ndị Ipob dịka ndị na-eyi ndụ egwu.
Gọọmentị jichikwara Nnamdi Kanu maka ebubo ịkpa nkata ịchutu ọchịchị onye kwuo uche ya.
Uche Mefor bụbu osote Nnamdi Kanu, mana o mechara wepụ pnwe ya n'otu Ipob, n'ihi na ọ sị na ọ nabataghị atụmatụ Ipob na-agbaso iji nweta nnwereonwe Biafra.
Ka ọ dị ugbua, Mazi Kanu ka nọ na mkpọrọ, ebe gọọmentị na-anwụchikwa onye ọbụla bụ onye Ipob n'ihi na ọ bụ otu iwu na-akwadoghị.