'Amaghị m na William Onyeabor bụ odogwu ruo oge ọ nwụrụ' - Charles Onyeabor
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji, Adline Okere na Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist, Editor and Video Journalist
Charles Onyeabor bụ otiegwu ma bụrụkwa ọkpara ochie dike tiri egwu n'oge gboo aha ya bụ William Onyeabor.
Oge ya na BBC nwere mkparịtaụka, Charles Onyeabor kọwara na ihe kpaliri mmụọ ya ịbanye n'itiegwu bụ iji mee ka aha nna ya ghara ịnwụ.
Ọ kọwara na ndị enyi ya na-achị ya ọchị oge ọ bụ nwata n'ihi na nna ya na-eti egwu, bụ nke na-ewe ya iwe ma na-emekwa ya ihere.
"Oge ahụ, anyị gaa akwụkwọ, ndị enyi m na-achị m ọchị maka na nna m na-eti egwu, ọ na-eme m ihere," ka ọ gwara anyị.
Charles Onyeabor kwuru na ya amaghị na nna ya bụ odogwu ruo ụbọchị enyi ya nwoke si Lọndọn kpọọ ya iji gwa ya na a na-ere otu efere egwu nna ya Pound narị isii (£600).
"Otu n'ime ndị enyi m ahụ sooro chịa m ọchị oge anyị dị obere, siri Lọndọn kpọọ m otu ụbọchị gwa m na ya nọ ebe a na-ere efere egwu".
"Ọ sị m na a na-ere otu egwu nna m £600. Ọ gwara onye ọcha na-ere egwu ahụ na ya ma nwa onye tiri egwu ahụ na ọ bụ enyi ya nwoke. Ha kpọrọ m n'ekwentị, onye ọcha ahụ asị m na nna m bụ nwoke ukwu".
"Mụ onwe m bụ nwa ya amabughị etu nna m ha kama ọ bụ ugbua ọ nwụrụ ka m ghọtara na ọ bụ odogwu. Ọ bụ ya mere m ji malite iso nzọụkwụ ya ka aha ya ghara ịnwụ," ka Charles Onyeabor kọọrọ anyị.

O kwuru na ọ bụ egwu nna ya a kpọrọ "Fantastic Man" ka ụlọọrụ Apple jiri maa ọkwa azụmahịa maka iPhone 7 plus n'afọ 2007.
Dịka o siri kwuo, e nwere ụfọdụ ejije nọ na Netflix e ji egwu William Onyeabor mee tinyekwara ọkwa azụmaahịa ndị Haribo dị na mba Jamini.
Charles Onyeabor gwara anyị na e nwere atụmatụ ọhụrụ ha ji n'aka ugbua.
"Anyị na-agba mbọ iwepụta ọdịdị ọhụrụ nke egwu William Onyeabor ndị mmadụ kachasị mara n'Afrịka bụ 'When the Going is Smooth and Good'" ka o kpugheere anyị.
O kwuru na otu ihe ọ mụtara n'aka nna ya bụ iji egwu ya na-ekwusa eziokwu.
Charles Onyeabor malitere iti egwu n'afọ 2020 mana ugbua, egwu ya fọrọ ntakịrị ka o ruo iri anọ (40).
O nweela efere egwu abụọ ebe Extended Play (EP) ya ga-apụta oge adịghị anya.
Ka o sinadị, ya na ọtụtụ ndị a ma ama na-eti egwu agụkọọla egwu na nkwago. Ndị gụnyere PSquare, Ruga na Phyno.



