You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kedụ ka ihe si kwụrụ na Syria?
N'ime naanị abalị iri na abụọ, ndịagha nnupuisi Hayat Tahrir al-Sham (HTS) mba Syria kwaturu ọchịchị Bashar al-Assad ma kpachie Damascus bụ isiobodo mba ahụ. Nke a bụ ihe ịtụ n'anya nye ọtụtụmmadụ n'ụwa niile ọkachasị mba dị na mpaghara etiti ọwụwa anyanwụ.
Lee ka ihe si kwụrụ na Syria ugbua:
- Ọtụtụ mmadụ agbakọọla na Syria na-agụ egwu ma na-aṅụrị maka nkwatu Bashar al-Assad onye nọgoro n'ọchịchị kemgbe afọ iri ise.
- Akụkọ na-ekwu na Mohammed al-Bashir bụ onye ga-anọ n'isi ọchịchị dịka Praịm mịnịsta.
- Bashar al-Assad a kwaturu n'ọkwa agbagala mba Rọshịa ebe Onyeisiala Vladimir Putin nyere ya nchekwa asylum.
- Ndịagha nnupuisi gara ụlọmkpọrọ Saydnaya dị na Damascus ebe ha kwuru na ha tọhapụrụ mmadụ ruru puku atọ na narị ise (3,500) a tụrụ mkpọrọ.
- Ndị nkwado ndịagha nnupuisi nabatara onyeisi ha bụ Abu Mohammed al-Jolani n'ogige ụlọ okpukperechi Umayyad dị na Damascus.
Abu Mohammed al-Jolani gwara ụlọọrụ mgbasaozi CNN na ebumnobi otu ya bụ ime ka e nwee udo na agamnihu ma hibe usoro ọchịchị ga-ahụ maka ọdịmma ụmụafọ.
Oge a jụrụ maka okpukperechi ndị nta, Abu Mohammed al-Jolani kwere nkwa na a ga-enwe atụmatụ ga-ahụ na ikike onye ọbụla dịrị ya.
Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden etoola nkwatu ọchịchị Assad.
Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị isi mbaụwa na-akpọ oku ka e nwee emume nyefee ọchịchị na mba Syria site n'ụzọ iwu kwadoro. Onyeisi North Atlantic Treaty Organization (Nato) bụ Mark Rutte kwuru nke a ma kọwaa na ọ dị mkpa ka ndị ga-abụ ndị isi mba Syria bụrụ ndị ga-erube isi nye iwu obodo, nweta nchekwa nye ụmụafọ ma kwanyere okpukperechi onye ọbụla.
Mba Rọshịa na Iran bụ mba abụọ kwadoro ọchịchị Assad.
Ọtụtụ mmadụ anwụchiela ụlọmkpọrọ Saydnaya na Damasacus isi obodo Syria ebe akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị a tụrụ mkpọrọ n'opkuru ụlọmkpọrọ ahụ tọrọ.
Mana otu Association of Detainees & The Missing in Sednaya Prison (ADMSP) kwuru na ọbụghị eziokwu na enwere ndị tọrọ n'ụlọmkpọrọ ahụ.
Cheta na ọtụtụ ụmụafọ Syria ka e kwuru na ha furu efu oge Assad nọ n'ọchịchị tupu ndịagha nnupuisi achụpụ ya n'ọchịchị.