You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
"Ọ na-ewe m ụbọchị niile ịchọta ebe m ga-etinye ekwentị m n'ọkụ"
Ala m, mba Niger anaghị apụta bu n'akụkọ mana nke ahụ gbanwere n'ụbọchị 26 ọnwa Julaị.
Kepu kepu malitere ifegharị maka ịnapụ ọchịchị n'ike n'obi gọọmentị. Ozugbo m malitere ịme nyocha na nchọpụta ịma nke bụ eziokwu.
O teghi aka, na mgbede ụbọchị ahụ, onyeisi ndị na-echekwa onyeisisala kwuputara na Onyeisiala Mohamed Bazoum nọ na nwụchi imeụlọ. E ewepụla nye ndu nke ahọpụtara. Dịka abalị abụọ gachara, General Abdourahmane Tchiani ahọpụta onwe ya dịka onye isi.
N'izu ụka abụọ so ya ehighi m ụra. Mmadụ niile na BBC chọrọ ịgwa m okwu mana ịkpa nkata rara m ahụ.
Ozugbo ahụ, ọnọdụ malitere ịgbanwe n'ama nakwa n'okporoụzọ. Ndị agha napụrụ ọchịchị na ndị nkwado ha malitere ikwu "ọ bụ na ịkwenyeghi n'anyị, ịsoghi anyị".
Mgbe BBC na-akọwapụta ihe niile na-agafe nakwa atụmatụ ndị na-agbanwe nakwa ihe ECOWAS na mba ndị ọzọ cheere na-eme, ọnọdụ na-akawanye njọ. A na m arụ ọrụ m na-akọwapụta ihe niile na-eme gbasara ọnọdụ ahụ.
Mana ụfọdụ ndị na-ege anyị ntị chọrọ ịnụ naanị akụkọ na-akwado nkwenye ha nwere. Ndị na-akwado Rọshịa, ndị na-akwado China, ndị akwadoghi mba Fransị nakwa ihe ndị ọzọ ha bu n'uche mana anya ha malitere ịdị n'ahụ m.
Ha malitere ịmaja m na soshal midia nke pụtakwara n'imaja m n'ekwentị. Junta ndị agha adọọla aka na ntị na ha ga-achụpụ ụlọọntaakụkọ mba ndị ọzọ. Ọ dịghịrị m mfe ị pụta n'okporoụzọ Niamey bụ isiobodo ị kọ akụkọ ndị na-akwado Tchiani.
Ọrụ m malitere ịnwe oke ahụhụ dịka ndụ m niile. Ugbua a na m anọzị n'enweghi ọkụ latrik ọtụtụ ụbọchị n'ihi na Naịjirịa esepụla ọkụ. Ọ bụ ọgụ na mgba ịtinye kọmpụta m na ekwentị m n'ọkụ nke na-enwekarị nsogbu. A ma m na okwu m na-ada ka 'nsogbu ọgaranya' na ntị mana ọ bụrụ na arụghị m ọrụ m kedụ etu ndị mmadụ ga-esi ma ihe na-eme?
Ọ na-esizi ike ịchọta nri ugbua maka mmachi ECOWAS machiri. Ndị mmadụ na-ata ahụhụ nke doro anya na ha na-achọ onye ha ga-ata ụta maka ihe dakwasịrị ha. Anyị enwekwughi ego nke dị ezigbo mkpa n'obodo a ebe e nwere oke ihe isi ike. Naanị CFA 50,000 ka mmadụ nwereike isepụta n'ụlọakụ maọbụ dọlla 83.
Ọ dị ka nnukwu ego mana ọnụ ahịa ngwa ahịa arịala elu nke ukwu.
M pụọ ịzụ ahịa, a na m ezo onwe m. Ọṅụ na aṅụlị m na-ahụbu ebe niile alaala. Mmadụ niile na-akọzị maka nnapụ ọchịchị n'ike mana ọ bụ naanị otu akụkụ nwereikeik ikwu uche ha.
Onye ọbụla katọrọ ya bụ atụmatụ nwereike ịdabanye n'aka Junta ndị agha ga-eti ha ihe maọbụ waghasịa ụlọ ha. Ụjọ nwụchi na-atụ m mgbe niile. Ọ na-echekasị m oge niile mana emeela m ụfọdụ ihe ịhụ na ọ gaghị eme.
A na m akpọchị ụzọ m ma m nọrọ n'ụlọ ma jụ impere ya onye ọbụla. O yighizi ndụ m na-ebi bu mana aka m chọrọ ị na-akọ akụkọ ala m ka ụwa niile nụrụ.