Sudan civil war: Ndị nyara ndụ akọọla maka ogbugbu na ịkwaso iko n’ike ha gabigara

Mmadụ ndị zutere agha na Sụdan akọọla BBC akụkọ banyere ịkwaso iko n’ike, ọgbaaghara agbụrụ na igbu mmadụ
Nkọwa foto, Mmadụ ndị zutere agha na Sụdan akọọla BBC akụkọ banyere ịkwaso iko n’ike, ọgbaaghara agbụrụ na igbu mmadụ

Mmadụ ndị zutere agha na Sụdan akọọla BBC akụkọ banyere ịkwaso iko n’ike, ọgbaaghara agbụrụ na igbu mmadụ. Ndị ntaakụkọ anyị agbaala mbọ garuo n’ihu agha ahụ bụ nke fọdụrụ obere ka o ruo n’isi obodo mba ahụ bụ Khartoum.

Ndị ọkwa ha dị elu n’otu mbaụwa ‘UN’ ekwuola na ọgbaaghara ahụ etinyela Sụdan “n’ọnọdụ kachasị njọ nye mmadụ na nso nso a” dịka o nwere ike kpalite ọnọdụ agụụ kachasị njọ n’ụwa.

A na-atụkwa ụjọ na ihe ahụ mba Amerịka kpọrọ mkpochapụ agbụrụ afọ 20 gara aga nwere ike ime ọzọ na Darfur.

Dịka a ga-asị na enweghị ebe o si, nnukwu ogbuniigwe mara okporoụzọ jijiji na Omdurman. Ndị mmadụ tiri mkpu ma magaa na mpaghara dị iche iche dịka na-eti: “Laghachi azụ, laghachi azụ, ọzọ ga-agba.” Nnukwu anwụrụ ọkụ kpuchiri ihe niile.

Tupu oge ahụ, ahụ ndị mmadụ ka ha na-azụ osikapa, achịcha na akwụkwọ nri n’ụlọahịa dị iche iche ndị ka malitere ịgbape n’okporoụzọ ahụ aghasara.

N’etiti ọnwa Febụwarị, ndịagha Sụdan weghaara obodo ahụ bụ otu n’ime obodo ndị e nwere n’okporoụzọ ‘River Nile’ nke mejupụtara isi obodo Sụdan bụ Khartoum ọzọ.

Ịmụ mmadụ amalitela ịlọghachi ugbua mana ogbuniigwe dịka nke ahụ dara n’etiti okporoụzọ ahụ ka na-adakwa kwa ụbọchị.

Maka ndị ọrụ mgbasaozi mbaụwa, inweta ohere ịga hụ maka agha ahụ tiwapụrụ n’ọnwa Eprel gara aga bụ nke siri ike mana BBC gbara mbọ ịgaru n’ihu agha.

Ndị otu anyị hụrụ na obodo ahụ bụbu ebe na-ekwo ekwo na Omdurman agbanwoola ma bụrụzie

N’ihe ruru otu afọ, ndịagha na RSF ebuola agha maka Khartoum na obodo ndị nọ ya n’akụkụ
Nkọwa foto, N’ihe ruru otu afọ, ndịagha na RSF ebuola agha maka Khartoum na obodo ndị nọ ya n’akụkụ

Ndọrọndọrọ ikikere ọchịchị dị n’etiti ndịagha mba ahụ na ndị na-agbakọọrọ ha aka n’oge mbụ bụ Rapid Support Forces (RSF) egbuola opekata mpe mmadụ 15,000 maọbụ karịa gburugburu mba ahụ.

N’ihe ruru otu afọ, ndịagha na RSF ebuola agha maka Khartoum na obodo ndị nọ ya n’akụkụ.

RSF ewegharaala mpaghara ndị nọ na ndịda isi obodo mba ahụ nakwa ọtụtụ mpaghara Darfur bụ nke nọ na nsogbu kemgbe afọ ndị gara aga tinyere tigbuo zọgbuo ya na ndị otu mba Afrịka na Arab na-enwe.

Ụmụnwaanyị ndị sitere Dafur gbagaa obodo Chad gbara ha agbataobi agwala BBC etu ndịagha si kwasoo ha iko n’ike, ọtụtụ mgbe oge ụfọdụ. Ụmụnwoke ndị nọ n’ogige gwara anyị etu ha siri gbanarị ogbugbu na ntọrị.

Dịka ha na ndịagha nọ n’ihu agha na Omdurman, BBC kpachapụrụ anya na ngagharị ya. E nwere onye nlekọta anyị na ya so dịka ọ na-ekweghị anyi sete onyonyoo omume ndị agha.

Ndịagha na-atụ egwu na a ga-efesa ozi banyere omume ha.

Ahịa ochie Omdurman naara ekwo ekwo n’ihi ndị obodo na ndị ọbịa na-azụ ahịa ebe ahụ bụzi mkpọmkpọ ebe
Nkọwa foto, Ahịa ochie Omdurman naara ekwo ekwo n’ihi ndị obodo na ndị ọbịa na-azụ ahịa ebe ahụ bụzi mkpọmkpọ ebe

N’oge onye na-esere anyi onyonyoo malitere ise onyonyoo banyere ihe ndị mere mgbe ogbuniigwe ahụ gbawachara , ndịagha nọ n’uwe ndị nkịtị gbara ya okirikiri dịka otu n’ime ha tụeara ya egbe n’isi.

A bịara chọpụta na ha sitere na ngalaba n’ahụ maka ozi ndị pụrụ iche n’ụlọọrụ ndịagha, mana nke ahụ ihe na-egosi etu egwu siri dị ndị mmadụ n’ahụ.

N’agbanyeghị ohere ndịagha nwetara ịbanye na ọmdurman na nso nso a, anyị nwekwara ike ịnụ ụda ọkụ ọgbụgba na mpaghara ahụ n’oge ahụ.

A bịara chọpụta na ha sitere na ngalaba n’ahụ maka ozi ndị pụrụ iche n’ụlọọrụ ndịagha, mana nke ahụ ihe na-egosi etu egwu siri dị ndị mmadụ n’ahụ
Nkọwa foto, A bịara chọpụta na ha sitere na ngalaba n’ahụ maka ozi ndị pụrụ iche n’ụlọọrụ ndịagha, mana nke ahụ ihe na-egosi etu egwu siri dị ndị mmadụ n’ahụ

Ahịa ochie Omdurman naara ekwo ekwo n’ihi ndị obodo na ndị ọbịa na-azụ ahịa ebe ahụ bụzi mkpọmkpọ ebe dịka ezukọchara ngwonwo ndị nọ n’ụlọahịa ya.

Ihe karịrị nde mmadụ atọ agbapụla na Khartoum n’ime ọnwa 11 gara aga mana ụfọdụ ndị bi na Omdurman ajụla ịpụ. Ọtụtụ n’ime ndị anyị zutere bụ ndị okenye.

N’ihe na-erughị otu kilometa n’ihu agha, Mukhtar al-Badri Mohieddin ji mkpịsị na-aga n’akụkụ ụlọụka ‘mosque’
Nkọwa foto, N’ihe na-erughị otu kilometa n’ihu agha, Mukhtar al-Badri Mohieddin ji mkpịsị na-aga n’akụkụ ụlọụka ‘mosque’
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N’ihe na-erughị otu kilometa n’ihu agha, Mukhtar al-Badri Mohieddin ji mkpịsị na-aga n’akụkụ ụlọụka ‘mosque’.

Ebe oghere dị na ncherịta ihu ya bụ ebe eji mere ili nwaoge.

“E nwere mmadụ 150 ebe a. I maara m ọtụtụ n’ime ha, Mohamed, Abdullah... Jalal,” ka o kwuru dịka ọ kwụdịtụtụ ogologo oge tupu ọ kpọpụta otu aha, Dr Youssef al-Habr, onye ọkammụta a maara nke ọma n’agụmagụ Arab.

“Ọ bụ naanị m ka ọ fọdụrụ,” ka ọ gbakwunyere.

Akọchaala ndịagha Sụdan n’ebe ọ dị ukwuu maka ụdị ogbuniigwe tara ọchịchị o ji eme ihe nke gụnyere na mpaghara mmadụ nkịtị bi bụ ebe ndịagha RSF gara zoo onwe ha, ọ bụ eziokwu na o kwuru na ya na-agbaso ụkpụrụ nchekwa dị iche iche iji chekwaa ụmụ mmadụ.

Onye ntaakụkọ BBC Arabic bụ Feras Kilani ka siri mba Sụdan lọta, bụ ebe ọ hụtatụrụ etu ụmụ mmadụ si ebi ndụ na mba ahụ n’oge agha. Onye ntaakụkọ BBC Africa bụ Mercy Juma gwara Lyse Doucet banyere ndị nyara ndụ n’ọgbaaghara agbụrụ dị iche iche tinyere mmetọ n’ụdị inwe mmekọ nwoke na nwaanyị ọ hụtara na Chad bụ obodo gbara ha agbataobi ọtụtụ mmadụ gbagara.

N’ebe a ndị mmadụ na-ata otu abụọ ahụ ụta banyere mbibi a na-ahụta n’isi obodo mba ahụ nakwa gburugburu ya.

Mana ọtụtụ ndị boro RSF ebubo izukọrọ ngwongwo ndị mmadụ na ime mwakpo n’oge ahụ ha na-elekọta mpaghara ahụ.

“Ha zukọọrọ ngwongwo niile dị n’ụlọ, ha zuru ụgbọala, tiivii, ha tiri ndị okenye ihe ọbụladị ụmụnwaanyị,” ya ka onye bi na mpaghara ahụ bụ Muhammad Abdel Muttalib gwara anyị.

“Ụmụ mmadụ nwụrụ n’ihi agụụ, adọpụtara m ụfọdụ n’ime ha n’ezi ka ozu ha ghara ire n’ime ụlọ ha,” ka ọ gbakwunyere.

Ọ sịrị na “ọ bụ nke onye ọ bụla maara” na akwasoro ụmụnwaanyị iko n’ike n’ụlọ ha n’oge ndị nchekwa na-eme nnyocha.

N’ebe a ndị mmadụ na-ata otu abụọ ahụ ụta banyere mbibi a na-ahụta n’isi obodo mba ahụ nakwa gburugburu ya
Nkọwa foto, N’ebe a ndị mmadụ na-ata otu abụọ ahụ ụta banyere mbibi a na-ahụta n’isi obodo mba ahụ nakwa gburugburu ya

Afaf Muhammad Salem gbara ihe dịka afọ 50 na ụmụnne ya bi na Khartoum n’oge ahụ agha tiwapụrụ.

O kwuru na ya gbaara gafee osimiri Omdurman n’oge ndịagha RSF wakpochara ha bụ ndị o kwuru zukọọrọ ngwongwo niile ha nwere n’ụlọ ha ma gbaa nwanne ya nwoke egbe n’ụkwụ.

“Ha na-eti ndị agadị nwoke na agadị nwaanyị ihe ma na-eyikwa ụmụntakịrị ndị nwaanyị aka ha dị ọcha egwu,” ka o kwuru.

Nke ahụ bụ mmetọ mmadụ n’ụdị inwe mmekọ nwoke na nwaanyị ekpuchiri ihe, nke bụ arụ na Sụdan.

“Ịmetọ ugwu na nsọpụrụ mmadụ na-ebute ihe mgbu karịa ịnara ego,” ka ọ gbakwunyere.

‘Ngwaọgụ eji achụ ọbọ’

Ndị akwasoro iko n’ike nwere ike ịgabiga akpamooke site na ndị ezinaụlọ ha na obodo ha oge ndụ ha niile. Ọtụtụ mmadụ na Omdurman achọghị ikwu okwu banyere nsogbu ahụ.

Mana n’ihe dịka kilomita 1,000 (Maịlị 621) na mpaghara ọdịda anyanwụ, n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị n’okeala Chad, ọnụọgụ ndị akwasoro ike n’ike ji nwayọ na-apụta ihe.

Afaf Muhammad Salem gbara ihe dịka afọ 50 na ụmụnne ya bi na Khartoum n’oge ahụ agha tiwapụrụ
Nkọwa foto, Afaf Muhammad Salem gbara ihe dịka afọ 50 na ụmụnne ya bi na Khartoum n’oge ahụ agha tiwapụrụ

Amina, onye anyị gbanwere aha ya iji kpuchite ejirimara ya bịara n’ụlọọgwụ ọdụrụkụọ nke ụlọọrụ obi ebere Médecins Sans Frontiéres hiwere maka ịtepụ afọ ime. O kelere anyị na-eweliteghị isi ya elu.

Nwaaghọghọ ahụ gbara afọ 19 bụ onye sitere na Darfur nke mba Sụdan rie mbọmbọ naanị ịchọpụta na ọ dị ime n’ụbọchị ya gara aga. Ọ chọghị ka ezinaụlọ ya nwaa anwaa mata na ọ dị ime.

“Alụbeghị m di ka bụụrụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,” ka Amina kwuru dịka ọnụ na-ama ya jijiji.

Dịka o siri gwa anyị, ndịagha nnupụisi jidere ya na nwanne nne ya nakwa ụmụ nwanne nne ya dịka sitere obodo ha bụ Ardamata na-agbaga obodo ọzọ dị nso na Geneina n’ime ọnwa Nọvemba.

Ọ sịrị na “ndị nke ọzọ gbara ọsọ mana ha jidere m ụbọchị ahụ niile. Ha dị mmadụ abụọ mana otu n’ime ha kwasoro m iko ọtụtụ oge tupu m gbaa mbọ rie mbọmbọ.”

Nwaaghọghọ ahụ gbara afọ 19 bụ onye sitere na Darfur nke mba Sụdan rie mbọmbọ naanị ịchọpụta na ọ dị ime n’ụbọchị ya gara aga. Ọ chọghị ka ezinaụlọ ya nwaa anwaa mata na ọ dị ime
Nkọwa foto, Nwaaghọghọ ahụ gbara afọ 19 bụ onye sitere na Darfur nke mba Sụdan rie mbọmbọ naanị ịchọpụta na ọ dị ime n’ụbọchị ya gara aga. Ọ chọghị ka ezinaụlọ ya nwaa anwaa mata na ọ dị ime

Akụkọ Amina bụ n’ime n’ime ọtụtụ akụkọ banyere mwakpo megide ụmụ mmadụ bụ nke mere n’ihe dịka abalị anọ nke ọnwa Nọvemba n’oge ndị RSF na ndị otu ya jichiri ogige ndịagha Sụdan dị na Ardamata.

Nke ahụ sochiri ọgbaaghara e nwere na mba ahụ na mmalite afọ, dịka ozi sitere n’aka otu mbaụwa ruru BBC aka na-ekwu na ekwenyere na e gburu ihe karịrị mmadụ 10,000 na mpaghara ahụ kemgbe ọnwa Eprel afọ gara aga.

UN edebatala ozi banyere ihe dịka mmadụ 120 akpasoro agwa ọjọọ n’ụdị mmekọ mmekọ nwoke na nwaanyị na mba ahụ bụ nke ọ kọwara dịka “nke na-enweghị ụzọ o siri gosi ka ihe siri kwụrụ.”

O kwuru na ha nyere mkpesa na aka ụmụnwoke nọ n’uwe ejirimara RSF na ndịagha ha na otu ahụ nwere njikọ dị na pasenti mwakpo 80 ndị ahụ. N’aka nke ọzọ, enwetala ụfọdụ mkpesa banyere ndịagha Sụdan na-akwaso ndị mmadụ iko n’ike.

UN edebatala ozi banyere ihe dịka mmadụ 120 akpasoro agwa ọjọọ n’ụdị mmekọ mmekọ nwoke na nwaanyị
Nkọwa foto, UN edebatala ozi banyere ihe dịka mmadụ 120 akpasoro agwa ọjọọ n’ụdị mmekọ mmekọ nwoke na nwaanyị

Na mpụga otu ogige ahụ bụ nke dị n’okeala Adré, ihe dịka ụmụnwaanyị na ụmụntakịrị ndị nwaanyị 30 na-ezukọ n’ime otu ụlọ na-etiti ụbọchị.

E kowere akpa ikuku n’elu ụlọ tinyere ụfọdụ edemede gụnyere “Ịkwaso iko n’ike abụghị akaraka; ọ bụ akparamaagwa a pụrụ ịkwụsị.”

Anya mmiri na-agba akwụsịghị akwụsị dịka ụmụnwaanyị na-akọwapụta ihe ndị ha na-agabiga n’ihi mmetọ.

Anya mmiri na-agba akwụsịghị akwụsị dịka ụmụnwaanyị na-akọwapụta ihe ndị ha na-agabiga n’ihi mmetọ
Nkọwa foto, Anya mmiri na-agba akwụsịghị akwụsị dịka ụmụnwaanyị na-akọwapụta ihe ndị ha na-agabiga n’ihi mmetọ

Maryamu – nke na-abụghị ezigbo aha ya kwuru na ndịagha fụ ịchafụ nke na-egosi na ha bụ ndịagha Arab kwasoro ya iko n’ike n’ime ọnwa Julaị n’ụlọ ya dị na Geneina.

Dịka o siri kwuo n’oge ọ na-akwa akwa, ọ na-enwezi nsogbu ịga ije kemgbe ahụ. “Ụmụ mmadụ na-agba ọsọ mana anyị enweghị ike ya n’ihi na nne m ochie enweghị ike ịgba ọsọ. A na m agbakwa ọbara.”

Onye ọrụ obodo aha ya bụ Zahra, onye gbara ọsọ ndụ n’onwe ya bụ ya na-ahụ maka otu ahụ.

Amina na Maryamu bụcha ndị isiojii mba Afrịka ebe Khamis kwuru na mmadụ ndị ahụ tụmadị ndị n’agbụrụ Masalit bụ ndị a na-elekwasa anya na Darfur.

Onye ọrụ obodo aha ya bụ Zahra, onye gbara ọsọ ndụ n’onwe ya bụ ya na-ahụ maka otu ahụ
Nkọwa foto, Onye ọrụ obodo aha ya bụ Zahra, onye gbara ọsọ ndụ n’onwe ya bụ ya na-ahụ maka otu ahụ

Otu UN kwuru na e gburu mmadụ 300,000 dịka ejikwa ịkwaso iko n’ike yie ndị obodo ahụ egwu ka ha gbafuo.

Otu n’ime ndịagha RSF, onye kọwara onwe ya dịka “field commander” zipụrụ onyonyoo video n’ọbaozi ‘social media’ n’ọnwa Nọvemba.

“Ọ bụrụ ma anyị kwasoo nwa gị iko n’ike, ọ bụ agwa mmegwara. Ihe a bụ obodo anyị ma bụrụkwa ikikere anyị,” ka o kwuru n’ihe onyonyoo ahụ bụ nke ehichapụrụla ka ọ dị ugbua.

Na nzaghachi ya nyere ajụjụ BBC banyere nkwaso iko n’ike na ụdị mwakpo ndị ọzọ, RSF sịrị na ndịagha Sụdan “na-ewere ndị mmadụ n’ọrụ iyi uwe ejirimara RSF na-akpa arụ, na-akwaso iko n’ike ma na-ekpochapụ agbụrụ.”

RSF sịrị na ndịagha Sụdan na-ewere ndị mmadụ n’ọrụ iyi uwe ejirimara RSF na-akpa arụ, na-akwaso iko n’ike ma na-ekpochapụ agbụrụ.
Nkọwa foto, RSF sịrị na ndịagha Sụdan na-ewere ndị mmadụ n’ọrụ iyi uwe ejirimara RSF na-akpa arụ, na-akwaso iko n’ike ma na-ekpochapụ agbụrụ.