Ana m enyefe mmeri m n'aka Chukwu nakwa ndị Osun - Gọvanọ Ademola Adeleke

Adeleke n'obi ya

Ebe foto si, Adeleke Instagram

Nkọwa foto, Adeleke n'obi ya dịka gọvanọ

Aka na-achị Osun steeti bụ Ademola Adeleke ekwuola na mmeri ya n'ụlọikpe bụ n'aka Chukwu na ndị Osun ka ya na-enyefe ya.

Adeleke depụtara nke a n'akara Twitter ya ebe o gosiri etu obi dị ya na ya bụ mmeri.

O kwuruna mmeri ya gosiri na ọ bụ ọchịchị onye kwuo uche ya n'ezie.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Ụlọikpe kachasị kpọpụtara Ademola Adeleke nke pati People's Democratic Party dịka ezi onye meiri ntuliaka ọkwa gọvanọ nke Osun steeti e mere n'ọnwa Julaị afọ 2022.

Ụlọikpe kpebiri nke ahụ n'Abuja ụbọchị Tuzde.

Ndị ọkaikpe mmadụ ise kpere ikpe ahụ nke onyeisi ha bụ Jọstis Emmanuel Agim.

Ha kachapụrụ mkpesa ndị pati APC na Gboyega Oyetola ma kwuo na ọ bụ Adeleke meriri ntuliaka ahụ nke bụ na ọ bụ ya ga-achị steeti ahụ kpọmkwem.

Adeleke

Ebe foto si, Adeleke Instagram

Nkọwa foto, Adeleke emeriela Oyetola n'ụlọikpe kachasị iji bụrụ gọvanọ Osun steeti

Ihe ikpe ha gbadoro ụkwụ

Ụfọdụ ihe ndị APC rụtụrụ aka na mkpesa ha bụ na e binyere aka karịa n'ụfọdụ be.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Mana ụlọikpe ahụ kpebiri na Gboyega na APC enwelighi ike igosi ihe ịgba ama na-enweghi ụta ọbụla gosiri na e binyere aka karịa ọnụ ọgụgụ maka na ha egosighi akwụkwọ e ji denye aha ndị tụrụ vootu kama ọ bụ naanị igwe BVAS bụ ihe w ji ama ọnụọgụgụ ndị tụrụ vootu kpọmkwem na ntuliaka dịka iwu ntuliaka 2022 siri kwuo.

Ha kwuru na Gboyega na APC bụ naanị ndị mmadụ na otu onye ọrụ INEC ka ha chekwubere ma kpọpụta dịka ndị aka ebe.

Na mkpebi ha; "Akwụkwọ e ji edenye aha ka dị mkpa iji mata ọnụọgụgụ debanyere aha n'ebe a na-atụ vootu dị 774 a na-agbagha mana iji gosi ndị pụtara kpọmkwem ibinye aka ụbọchị ntuliaka, naanị ọnụọgụgụ BVAS ka a ga-ewe".

Jọstis Agim kwuru; "Ụlọikpe a enweghi ike iwere okwu naanị otu onye na ihe ha depụtara n'akwụkwọ dịka ihe ịgba ama na e binyere aka karịa.

N'okwu gbasara agụmakwụkwọ Adeleke, ụlọikpe ahụ kpebikwara na ndị mere mkpesa egosighi ihe aka ebe gosiri na Adeleke ji asambodo adịgboroja dịka ụlọakwụkwọ ebe ndị ọ gara ekwughi na asambodo ya bụ nke adịgboroja

Ha kwukwara na okwu gbasara asambodo ya bụ ihe ụlọikpe kpebiri kamgbe afọ 2019.

Ademola Adeleke na Oyetola

Ebe foto si, Ademola Adeleke/Facebook/Oyetola/Facebook

Gboyeya Oyetola na pati ya bụ All Progressives Congress (APC) na-agbagha bu mkpebi ụlọikpe mkpegharị mere n’ọnwa Maachị 2023 nke kwuru na ọ bụ Ademola Adeleke nke Peoples Democratic Party (PDP) bụ onye nwetere mmeri n’ezie na ntuliaka ahụ.

Oyetola na APC buuru mkpesa gaa ụlọikpe kachasị dịka ha chọrọ ụlọikpe ahụ mezie mkpebi ikpeazụ n’okwu a kpọm kwem.

Cheta na ụlọikpe mkpesa maka ntuliaka bụ Osun State Election Petition Tribunal kwuburu na ọ bụghị Adeleke nwetere mmeri kama na ọ bụ Oyetola nwetere mmeri na ntuliaka n’ikpe nke ụbọchị 16 nke ọnwa Nọvemba, 2022.

Ndị ọkaiwu na-eche mkpebi ikpe ahụ
Nkọwa foto, Ugo eberela na mgbagbu n'ụlọikpe kachasi ebe a na-eche mkpebi ikpe ahụ

N’ọnwa Maachị 2023, ụlọịkpe mkpegharị bụ ebe Adeleke bu okwu a gaa bụ ebe ọkaikpe Mohammed Shuaibu duru ikpe ahụ kwuru na ọ bụ Adeleke nwetere mmeri n’ezie.

Ụlọịkpe mkpegharị kwuru na ụlọikpe mkpesa maka ntuliaka dara ya mgbe ha kwuru na atụfere vootu site n’akụkụ ha nụrụ na ntị dịka ha tulechara ozi nọ n’igwe Bvas nakwa akwụkwọ ndị e ji tụọ vootu.

Ụlọikpe ahụ kwuru na akwụkwọ e ji tụọ vootu bụ ntụọ eji e mee mkpebi maka ntuliaka ọbụla ma kwuo na nke a bụ mkpọrọgwụ ntuliaka 2023.

Ọ bụ ọkaikpe Tertsea Kume bụ onye duru ikpe ahụ kwuru na Oyetola bụ onye nwetere mmeri dịka ha kwuru na atụfere bvootu.

Onyeisioche otu ikpe ahụ kwuru na e mere ntuliaka ahụ ‘na-esonyechaghị’ usoro iwu nyere maka ya bụ ntuliaka.

Mana cheta na n’ụbọchị 17 nke ọnwa Jụlaị 2022, ụlọọrụ nhazị ntuliaka Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) kpọpụtara aha Adeleke dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ ahụ dịka o nwetere vootu 403371 ebe Oyetole sotere ya na mmeri dịka o nwetere vootu 375027.