Etu ndị uweojii si chọpụta ozu mmadụ 20 n'ime okwu arụsị

Ebe foto si, Screen grab
Ndị uweojii Edo steeti akọwaala etu ha si chọpụta ozu mmadụ dị iri abụọ n'ọnụọgụgụ a mịkpọrọ amkịkpọ, n'ime otu okwu arụsị dị na Benin, Edo steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Edo steeti bụ Chidi Nwabuzor gwara BBC Igbo na mkparịtaụka ekwentị na ya bụ ihe mere na mpaghara Ekenwa Road, na Benin, n'ụbọchị Wenezde, abalị isi na asaa nke ọnwa Ọgọst 2022.
Nwabuzor kwuru na ọ bụ ndị mmadụ gbara ama wee gwa ndị uweojii na e nwere ụlọ dị n'okirikiri ahụ ebe ihe dị aṅaa na-aga n'ihu.
"Ndị uweojii na ndị ọrụ nche Edo steeti gara ebe ahụ wee hụ ọtụtụ ozu mmadụ kpọrọla nkụ," Nwabuzor kwuru.
"Ozu ndị ahụ nwechara akwụkwọ njirimara e kenyere na ha, nke gosiri na o nwereike ịbụ n'ụlọ ozu ka e si bute ha."
"Ndị ọrụ anyị hụkwara ọtụtụ ihe e ji achụ aja, dịka ọbara anụmanụ na ihe ndị ọzọ n'azụ ụlọ ahụ."
Nwabuzor kwukwara na ha nwụchiri mmadụ atọ n'ụlọ ebe okwu arụsị ahụ dị.
N'akwụkwọ ozi si n'aka osote ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Edo Steeti bụ Jennifer Iwegbu, aha ndị ahụ a nwụchiri bụ: “Chimaobi Okoewu, Oko Samuel, na Gideon Sunday".
Ndị ọzọ nọ ebe ahụ gbara ọsọ.
Akwụkwọ ozi ahụ kọwara na ozu mmadụ a hụrụ n'ụlọ ahụ dị iri abụọ n'ọnụọgụgụ; nke gụnyere ụmụ nwoke iri na ise, ụmụ nwaanyị atọ na ụmụaka abụọ.
"Anyị amalitela nnyocha miri emi iji chọpụta ihe niile gbasara nke a," Nwabuzor kwuru.









