President Tinubu: "Adaghị m ada kama emere m ‘dobale’ iji kwanyere ọchịchị onye kwuo uche ya ugwu"

Onyeisiala Tinubu mechara kwụrụ n'ụkwụ ya n'elu ụgbọala ahụ dịka ọ dachara

Ebe foto si, Presidency Nigeria

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu etinyela ọnụ n’ihe onyonyo ahụ na-efegharị na soshal midia nke gosiri mgbe ọ dara n’Eagle Square dị n’Abuja n’emume ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya na Wednezde.

Tinubu zọjọrọ ụkwụ mgbe ọ na-arịgoro n’elu ụgbọala ga-ebu ya akpagharị na gburu gburu Eagles Square n’emume ahụ. Mana ngwa ngwa o bilitere ma kwụrụ n’ụkwụ ya.

Mgbe ọ na-ekwu okwu n’ọgbakọ a haziri maka ụbọchị ahụ, Tinubu kpara ndị mmadụ ọchị ma kwuo na o mere ‘dobale’ – iji kwanyere ochịchị onye kwuo uche ya ugwu n’usoro ndị Yoroba.

N’okwu ya, mgbe ọ na-eme emume ahụ, “emere m ‘dobale’ nye ọchịchị onye kwuo uche ya,” (nke pụtara na o hudatara isi ya aka nye ọchịchi onye kwuo uche ya).

Onyeisiala Tibubu ji ohere ahụ kpọọ oku ka e nwee ịdịnotu na Naịjirịa agbanyeghi agbụrụ, okpukperechi nakwa otu ndọrọ ndọro ọchịchị dị iche iche.

Kamgbe ihe a mere, ọtụtụ ndị mmadụ etinyela ọnụ n’okwu ahụ nke gụnyere Atiku Abubakar na Peter Obi bụ ndị mara Onyeisiala Tinubu aka n’ịzọ ọkwa onyeisiala n’afọ 2023.

Ihe Peter Obi kwuru maka ada Onyeisiala Tinubu dara

Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi Facebook/Screenshot

Onye zọrọ ọkwa Onyeisiala bụ Peter Obi ezigarala onyeisiala Tinubu ozi itiakanobi gbasara ada ọ dara n'ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya.

Obi bụ onye wepụtara ozi n'aka soshal midia ya dị icheiche, ọ sị na o wutere ya ịnụ maka ada ahụ.

Ọ sị na o nweghi uru ọ bara ndị mmadụ ịkwa onyeisiala emo maka ihe mberede nwereike ịme onye ọbụla.

"Anyị niile bụ mmadụ, n'agbanyeghi na anyị enweghi otu nkwenye maka etu a ga-esi mee ọganihu Naịjirịa, ka anyị niile cheta ihe jikọrọ anyị ọnụ. Ka anyị gbado anya n'ihe ndị dị mkpa ga-ebute Naịjirịa ọhụrụ" ka o kwuru n'ozi ahụ.

Ihe ụlọọrụ Onyeisiala Tinubu kwuru maka ọdịda ya

Ụlọorụ Onyeisiala asaala okwu

Ebe foto si, Asiwaju Bola Ahmed Tinubu/Facebook/Screenshot

Mmadụ abụọ na-ekwuru Onyeisiala Tinubu okwu asaala ndị mmadụ na-akwa ya emo maka ada ọ dara n'ụbọchị taa.

Otu onye bụ Bayo Onanuga weputara ozi n'akara X bụbu Twitter were kwuo na Onyeisiala bụ mmadụ dịka anyị niile.

Onanuga sị "Onyeisiala Tinubu abụghị mgbọ epu ahụ, ọ bụ mmadụ dịka anyị niile. Onyeisiala Biden nakwa Barrack Obama adaala ada nke ha".

Ọ gara n'ihu kwuo na mmadụ ịda ada ghara iwepu mkpa ọ dị ịcheta ụbọchị ọchịchị onyekwuooucheya.

Ihe Atiku kwuru maka ada Onyeisiala Tinubu dara

Atiku Abubakar

Ebe foto si, Atiku ABUBAKAR/FaCEBOOK/Screenshot

Onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naịjriaị bụ Atiku Abubakar ezigarala Onyeisiala Tinubu ozi mwute maka etu osi daa ada maa ihu n'ala n'ụbọchị June 12.

Atiku depụtara n'akara X ya sị "ọ bụ ebumnu'che m na ihe niile dịrị gị mma" dịka ọ na-egosi ya uche ọma maka ada ọ dara.

Cheta na soshal midia na-ekpo ọkụ ugbua dịka ihe onyonyo gosiri ebe onyeisiala Tinubu dara ada.

Ụfọdụ na-ajụ ma ahụ adịkwa onyeisiala ebe ndị ọzọ na-ekwu na ekwesiri ịchụ ndị na-eche ya ọchị n'ihi enyeghi ya nchekwa zuruoke.

Ndị ọzọ nọkwa ebe ha nọ jiri ihe mere na-akpa ọchị.

Onyeisiala dara ada

Ebe foto si, Screenshot/TVC News

Ihe onyonyo BBC hụrụ anya n'emume ncheta 'Democracy Day' gosiri ebe onyeisiala Naịjirịa dara ada.

N'emume ahụ, ọ na-arị elu mgbe ụkwụ ya sepụrụ ọ wee jiri ihu ya daa ada.

Ọ dara ada dịka onye na-ama ọkwa kwuru na taa bụ ụbọchị dị oke mkpa na Naịjirịa.

Onye ntaakụko BBC nọ ebe ihe ahụ mere na Eagles Square dị n'Abuja kwuru na dịka Onyeisiala Tinubu dachara ada, ndị ọrụ nchekwa nọ ebe ahụ chụrụ ndị ntaakụkọ na ndị oseefoto ọsọ ụkwụ eru ala.

Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ n'okwu onyeisiala kwuru

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu

Ebe foto si, Asiwaju Bola Ahmed Tinubu/Facebook

Onyeisiala mba Naịjirịa, Bola Tinubu agwaala ụmụ Naịjirịa okwu ma kene ndị niile so webata ọchịchị onyekwuoucheya na Naịjirịa.

N’ozi Tinubu na ụbọchị ncheta ọchịchịonyekwụọucheya kwetara na e nwere nnukwu ihe ụkọ na nsogbu ọnọdụ akụnụba na Naịjirịa.

Mana lee ihe ise anyị nwere dịka ihe kachamkpa tinubu kwuru taa:

  • Tinubu kenere ndị niile ji ndụ ha chụ aja iji kwado ịdịnotu ala Naịjirịa.
  • Ọ dọrọ aka na ntị na ọchịchị onye kwụọ uche kachamma karịa ụdịrị ọchịchị ndị ọzọ. Ọ kwuru na ọchịchị onye kwụọ uche ya na adịwaga mma n’ọdịnịhu ma dọọ aka na ntị na enwere ndị nwereike ịchọ ịjị maka ọnọdu akụnụba nwere chọọ itinye ọgbaaghara maọbụ mebie ọchịchị onyekwụọuche.
  • 34 O kwere nkwa na ihe ọsọrọ ya bụrụ na ya ga eme ka ọchịchị onye kwụọ uche tọọ atọ na Naịjirịa.
  • Mgbanwe anyị na-eweta n’ọchịchị ga amịta ezi mkpụrụ n’ọdịnịrụ. Anyị ma na ọ na-eweta oke ihe ụkọ mana mgbanwe ahụ bụ ihe anyị kwesiri ime maka ọdịmma anyị niile.
  • N'agbanyeghi na otu jịkọrọ ndị ọrụ na akpo oku ka ha gba abụbọ ọrụ, anyị emekpaghị ha ahụ ma ọ bụ jiri ike soro ha; anyị ji usoro udo na mmekorita na-eso ha.