Ụgwọ opekatampe: Ihe mere gọọmentị agaghị akwụnwu ndị ọrụ ego ole ha chọrọ - Onyejeocha

Aha onyonyo, Ụgwọ opekatampe: Ihe mere gọọmentị agaghị akwụnwu ndị ọrụ ego ole ha chọrọ - Onyejeocha
Ụgwọ opekatampe: Ihe mere gọọmentị agaghị akwụnwu ndị ọrụ ego ole ha chọrọ - Onyejeocha

Minista na-ahụ maka ọrụ Bekee na Naịjirịa bụ Nkeiruka Onyejeocha akọwaala ihe mere gọọmentị agaghị akwụnwu ndị ọrụ Bekee ego ole ahụ ha chọrọ dịka ụgwọ opekatampe.

Mịnịsta a na BBC Igbo nwere mkparịtauka pụrụiche dịka otu n'ime ndị so na-akpa nkata maka ego ole gọọmentị ga-akwụnwu.

O gbara ọkụ n'ụfodụ ihe mere o jighị diri gọọmentị mfe ikwu ụgwọ ahụ otu jikọtara ndị ọrụ na-achọsi ike.

Mgbe a jụrụ ya gbasara ụfọdụ ego gọọmentị na-emefu n'ihe ndị ọzọ, ọ kọwara na ihe ndị ahụ dị mkpa.

"Ego gọọmentị na-aga n'iwulite ihe ndị dị mkpa n'obodo dịka Okporo ụzọ, ụlọ akwụkwọ, ụlọ ọgwụ wdg, ọ bụghị naanị maka ịkwụ ụgwọ ọnwa ndị ọrụ" ka o kwuru.

Onyejeocha makwara atụ n'ụfodụ ihe nke ọchịchị Onyeisiala Tinubu tinyere iji belata oke ahụhụ kemgbe e wepụrụ Subsidy mmanụ ụgbọala.

Ọ sị ka ndị mmadụ nwee ndidi n'ebe gọọmenti nọ ma nye ha ohere ịrụ ọrụ.

Cheta na o ruola izu ụka ole na ole otu jikọrọ ndị ọrụ na-enye nsogbu maka ụgwọ opekatampe ma na-ekwusi ike ka e mee ya ọfụma maka oke ahụhụ na agụru dị n'obodo.

Kirie ihe o kwuru n'uju;