Ndị oji egbe atọrọla mmadụ 15 n'Enugwu Steeti

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ si n'Enugwu steeti apụta na-akọwa na ndị oji egbe amabeghi ndị ha bụ tọrọla mmadụ 15 n'obodo Mgbuji, Eha-Amufu, dị na steeti ahụ, n'ụtụtụ Mọnde, 18 nke ọnwa Julaị afọ 2022.
Onowo obodo Mgbuji bụ Christian Nnaji, gwara BBC Igbo na mmadụ 15 ahụ ji ụgbọala na-aga ubi mgbe ndị a kwụsịrị ha n'ụzọ.
O kwuru sị, "Kemgbe ahụ, anyị anụbeghị ihe ọbụla maka ha, mana otu onye n'ime ndị a mechara kpọọ anyị n'ekwentị wee sị na e ji ha eji".
Ọ bụghị mbụ a na-atọrọ ndị mmadụ n'obodo Mgbuji
Nnaji kwuru na o ruola otu afọ ndị ọchiehi batara n'ebe ndị obodo ha na-akọ ubi.
O kwuru sị, "Ndị obodo anyị anaghịzị aga ugbo maka ndị ọchi ehi a, nke a mere taa dị nso ebe anyị bi, nke pụtara na ndị a erutewala ebe obibi anyị".
O kwuru na onyeisi ndị uweojii na mpaghara ahụ, na ndị otu ya bịara gagharịa ụzọ ahụ mana onweghị ndị ha hụrụ.
O kwukwara sị, "Ihe dị ka afọ anọ gara aga ka a chọrọ iwakpo ndị na-eme njem n'ụzọ Oboloafọ, mana ha gbalahụrụ ha. Anyị na-echekwa na ọ bụ otu ndị a".
Nnaji kwuru sị, "Ndị otu a achụpụla ndị be anyị na-akọ ubi, ha na-akutu ụzọ ha, ha na-awakpokwa ndị mmadụ, anara ụfọdụ ọgbatumtum ha ma na-atọrọ ndị mmadụ. Ahụhụ a ka anyị na-ata kemgbe otu afọ".
O kọwara na e nwere mgbe ndị agha bịara bịa nọrọ n'obodo ha ihe dị ka ọnwa ole ma ole.
O kwuru sị, " Mgbe ndị agha a nọ, mwakpo a anaghị eme. Mana mgbe ha pụrụ ha ebidokwa mwakpo ha ọzọ".
Nnaji mere ka anyị ghọta na ndị niile na-akọ ubi n'obodo ha agbachaala ọsọ.











