Akwa ọcha Fabrics: Etu m si mụta ma bụrụ akaochie n’ịkpa akwa a e ji mara ndị Aniọma
Nwada Igbudu Mary na-akpa akwa ọcha e ji maara ndị Agbo, Asaba na Aniocha akọwaala etu o si bụrụ akaochie n’ịkpa akwa a.
Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Igbudu sị na ọ mụtara ịkpa akwa ọcha site n’aka nne nne na nne mụrụ ya mgbe ọ ka bụ nwata.
Ọ sị na akụrụngwa e ji akpa akwa a bụ ogologo osisi e ji osisi ndị obere gabie n’etiti ya.
Ọ sị na ụmụ ya atọ na-akpakwa ya bụ akwa ọcha.
Igbudu sị na ọ na-ewe ya ụbọchị anọ ịkpapụta otu akwa ọcha ebe ịkpapụta ya n’uju ga-ewe izuụka atọ.

Gịnị bụ akwa ọcha?
Nwada Igbudu sị na akwa ọcha bụ akwa e ji mara ndị Aniocha dị na Delta Steeti.
“Mgbe gboo o nwere eriri a na-ji akpa ya, a na-esi ya eriri ahụ na mkpụrụosisi owu bụ (cotton) na Bekee.”
“E mepee ime mkpụrụosisi ahụ, a gbasa ya ka ọ kpọọ nkụ. Ọ kpọọ, e werezie ya kpawa akwa ọcha.”
Ọ sị na mgbe gboo ahụ na ọ bụ ndị Ubulu na-eji owu ahụ akpa akwa ma buru ya gaa ree n’Ogwashi Ukwu na ebe ndị ọzọ.
Igbudu sị na ịkpa akwa a mechara bụrụ aka ọrụ ma gbasaa ebe ndị ọzọ.
Kedụ uru akwa ọcha bara?
Nwada Igbudu sị na akwa ọcha bara uru ebe ọ dị ukwuu nye ha ọkachasị ụmụnwaanyị
Ọ sị na a na-eji ya emume dị iche iche dịka ịgba nkwụ nwaanyị, akwamozu, na ọ bụ ihe e ji ama ndị Anioma.
Kirie ihe o kwuru n’uju;










