Akwa ọcha Fabrics: Etu m si mụta ma bụrụ akaochie n’ịkpa akwa a e ji mara ndị Aniọma

Aha onyonyo, Akwa ocha fabrics: Etu m si mụta ma bụrụ aka ochie n’ịkpa akwa ndị Aniọma a

Nwada Igbudu Mary na-akpa akwa ọcha e ji maara ndị Agbo, Asaba na Aniocha akọwaala etu o si bụrụ akaochie n’ịkpa akwa a.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Igbudu sị na ọ mụtara ịkpa akwa ọcha site n’aka nne nne na nne mụrụ ya mgbe ọ ka bụ nwata.

Ọ sị na akụrụngwa e ji akpa akwa a bụ ogologo osisi e ji osisi ndị obere gabie n’etiti ya.

Ọ sị na ụmụ ya atọ na-akpakwa ya bụ akwa ọcha.

Igbudu sị na ọ na-ewe ya ụbọchị anọ ịkpapụta otu akwa ọcha ebe ịkpapụta ya n’uju ga-ewe izuụka atọ.

Akwa ọcha ndị Anioma

Gịnị bụ akwa ọcha?

Nwada Igbudu sị na akwa ọcha bụ akwa e ji mara ndị Aniocha dị na Delta Steeti.

“Mgbe gboo o nwere eriri a na-ji akpa ya, a na-esi ya eriri ahụ na mkpụrụosisi owu bụ (cotton) na Bekee.”

“E mepee ime mkpụrụosisi ahụ, a gbasa ya ka ọ kpọọ nkụ. Ọ kpọọ, e werezie ya kpawa akwa ọcha.”

Ọ sị na mgbe gboo ahụ na ọ bụ ndị Ubulu na-eji owu ahụ akpa akwa ma buru ya gaa ree n’Ogwashi Ukwu na ebe ndị ọzọ.

Igbudu sị na ịkpa akwa a mechara bụrụ aka ọrụ ma gbasaa ebe ndị ọzọ.

Kedụ uru akwa ọcha bara?

Nwada Igbudu sị na akwa ọcha bara uru ebe ọ dị ukwuu nye ha ọkachasị ụmụnwaanyị

Ọ sị na a na-eji ya emume dị iche iche dịka ịgba nkwụ nwaanyị, akwamozu, na ọ bụ ihe e ji ama ndị Anioma.

Kirie ihe o kwuru n’uju;