Ọkpụrụkpụ ihe ise dị na nkwekọrịta Tinubu na mba China na uru ọ ga-abara Naịjirịa

Ebe foto si, Nigeria Presidency
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu na ogbo ya nke China bụ Xi Jinping tinyere aka n’akwụkwọ nkwekọrịta a kpọro ‘Memorandum of understanding (MOU)’ maka iji wulite mmekọrịta mba abụọ a.
Tinubu na Xinping mere nke a na Tuzde ụbọchị atọ nke ọnwa Sepụtemba 2024 n’ime njem o mere na China maka ọgbakọ China-Africa Forum 2024.
Onyeisiala Tinubu kwuru na njem a bụ ihe dị mkpa nye Naịjirịa nakwa mba Afrịka niile, ma kwuo na ọ bịara njem a dịka onyeisioche otu ECOWAS.
Ihe ise gbara ọkpụrụkpụ n’akwụkwọ nkwekọrịta ahụ

Ebe foto si, Nigeria Presidency
- Atụmatụ ịrụkọ ọrụ ọnụ n’etiti Naịjirịa na China iji kwalite atụmatụ njem okporoụzọ nakwa nke ụgbọoloko.
- Nkwekọrịta etu Naịjirịa na China ga-esi eji akụrụngwa ikike di na nuklịa arụpụta ihe n’ụzọ udo.
- Nkwekọrịta maka etu a ga-esi ewulita akọnauche ndị mmadụ n’atụmatụ a kporo Global Development Initiative’
- Nkwekọrịta n’atụmatụ nzirita ozi n’etiti Naịjirịa na China
- Nkwekọrịta n’atụmatụ mmekọrịta n’etiti ụlọọrụ mgbasaozi China bụ China Media Group na nke Naịjirịa bụ Nigerian Television Authority.

Ebe foto si, Nigeria Presidency
Ihe ndị ọzọ Tinubu mere na njem a gụnyere njem nleta ọ gara n’isi ụlọọrụ ụgbọoloko na China bụ China Railway Construction Corporation (CRCC) bụ ebe o kwuru na ọ bụ ndị a gbara mbọ ịhụ na njem ụgbọoloko dị ire na Naịjirịa ugbua.
Onyeisiala Tinubu nọ ebe ahụ kwee nkwa na ọ ga-arụcha okporo ụgbọoloko ndị si Abuja gawa Ibadan, Kaduna na Kano.
Onyeisi ụlọọrụ a bụ Dai Hegen gwara Tinubu na ụlọọrụ ha arụọla ọrụ karịrị 300 ma zụọ ndị Naịjirịa karịrị 100,000 kamgbe afọ 43 ha batara na Naịjirịa.
N’otu aka ahụ onyeisiala Tinubu gakwara n’isiụlọọrụ Huawei Technologies dị na Beijing bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ kwuru na ga-enye Naịjirịa ụlọọakwụkwọ a na-amụ maka ịntanetị nke a ga na-ebugharị ebugharị a kpọrọ ‘DigiTruck’.




