Iranian President: Ihe ị kwesiri ịma maka Ebrahim Raisi nwụrụ anwụ

Ebe foto si, EPA
O doola anya na onyeisiala mba Iran bụ Ebrahim Raisi anwụọla n'ihe mberede ụgbọelu Helịkọpta mere n'ụbọchị ụka.
Ndị ọchịchị na mba ahụ na-ekwukwa na a ga-eli Raisi echi bụ ụbọchị Tuusde.
Ụlọntaakụkọ Tasnim kwuru na a ga-eli Raisi na ndị nwụrụ n'obodo Tabriz bụ ebe ha na-aga tupu ọdachi adakwasị ha.
Mana a ga-ebuzọ nyochaa ozu ndị ahụ tupu e lie ha.
Onyeisi kachasị na mba ahụ bụ Ayatolla Ali Khamenei amanyela ụbọchị ise iiji ru ụjụ maka ọnwụ Raisi na ndị ọzọ so ya.
Onye bụ Ebrahim Raisi?

Ebe foto si, Iranian Presidential Office
Raisi dị afọ 63 bụ onye ahọpụtara dịka onyeisiala mgbe ọ zọrọ ọkwa ugboro abụọ n'afọ 2021.
Raisi bụbụ onyeisi ọkaikpe na Iran tupuu ọzọọ ọchịchị nwere bụrụ onyeisiala mba ahụ.
A mụrụ Raisi na afọ 1960 na obodo Mashhad, bụ obodo nke abụọ na obodo kacha na mba Iran ma bụrụ ọbọdọ ebe ndị alakụba Shia jịrị mere ala nsọ.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Raisi bịdọrọ ịsọ nkụzị alakụba na oge ọ dị afọ ịrị na ise.
Na oge ọ bụ nwata akwụkwọ ọ sonyere mee ngagharị iwe megide Shah bụ onye ndị Yurop na akwadọ nke a chuturu na ọkwa na afọ 1979.
Ayatollah Ruhollah Khomeini bụ onye kwadọrọ ndị chuturu Shah na ọkwa.
Ka a kwatuchara Shah na ọkwa, Raisi sonyere ndi ọkaikpe, ma na arụ ọrụ dịka onye na akpọpụ mmadụ ụlọikpe, ma nọrọ na otu akaahụ na enwe ọzụzụ na aka Ayatollah Ruhollah Khomeini nke na achị Iran bịdọ na afọ 1981.
Na ego niile Raisi nọ na ọkwa, a na emem ngaharị iwe na Iran, ọkacha nke mere na afọ 2022 na mpaghara Iran nịịle.
Ọtụtụ ndị Iran na ndị na-akwado ikike mmadụ na akpọ oku ka enyocha aka Raisi na ka esi gbuo ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nọ na nga agharaghara na ihe dịka afọ 1980.
A na-atụ anya na ọ ga-anọchị anya Ayatollah Khamenei bụ onyeisi kachasị na mba ahụ kemgbe 1989.
N'afọ 2019, onyeisi kachasị ahụ họpụtara ya tinye n'ọkwa onyeisi ụlọikpe mba ahụ.
Raisi bụkwa onye a họpụtara dịka osote onyeisioche 'ọgbakọ ndị ọkachamara' bụ ndị o ruuru ịhọpụta onyeisi kachasị ọzọ na mba ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ozi pụtara n'ụbọchị ụka na-ekwu na ụgbọelu helikọpta bu onyeisiala Iran enweela ihe mberede.
Ọ bụ ụlọmgbasaozi Iran mere ka a mata nke a n’ụbọchị ụka Sọnde 19 Mee 2024.
Dịka ụlọọrụ ahụ siri kwuo, Onyeisiala Ebrahim Raisi nọ n’ime ụgbọelu ahụ n’oge ọ dara n’ike n’ụbọchị Sọnde.
Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme na mba ahụ kwuru na ndị ọrụ nnapụta ka na-agba mbọ ịgaru ebe ihe mberede ahụ mere n’ihi ọnọdụ ihu eluigwe na-adịghị mma.
Ihe anyị ma maka ihe mberede ụgbọelu Helikọpta mere

Ka ihe si kwụrụ ugbua, ndị ọrụ gbatagbata ka na-anwa iru ebe ihe mberede ahụ mere kpọm kwem.
Dịka ndị ntaakụkọ mba ahụ si kwuo, Raisi na-aga njem n'obodo Tabriz dị na moaghara ugwu Iran dịka o si okeala ha na Azerbaijan ebe ọ gbapere mgbidi mmiri abụọ.
Ụgbọelu Helikọpta o so na ya bụ otu n'ime atọ na-aga n'ahịrị bụ 'Convoy' na Bekee.
Minista imeobodo mba ahụ sị na ihụ elụigwe ọjọọ nakwa ahụghị ụzọ na-eme ka ọ raa ahụ ịru ebe ụgbọelu helịkọpta ahụ nọ ozugbo.
Akụkọ kwuru na ụgbọelu helịkọpta ndị ọzọ so ya n'ahịrị daturu na-enweghi nsogbu ọbụla.









