Ka osi gaa n'ikpe 'ntọrọ' Nnamdi Kanu taa- Ọkaiwu Ejiofor

Ụlọikpe Etiti dị n'Abuja ehighariala ikpe banyere akwụkwọ ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu bagbara banyere ebubo na Gọọmenti Etiti tọọrọ Nnamdi Kanu, onye ndu otu nnwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra(Ipob) na mba Kenya a kpụlata ya Naijiria, gaa abalị 14 nke ọnwa Disemba afọ 2022.

Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyị Ejiofor onye gbara ama n'ozi o wepụtara n'akara Facebook ya bn'ehihie Fraide(7/10/2022), kwuru na ụlọikpe ahụ kwuru na ndị ikpe ahụ metụta abịaghị ụlọikpe ụbọchị ọhụrụ ahụ e hiwere okwu ahụ ga-ahara ihe ọbụla e kpebiri.

Cheta na nnamdi Kanu nwere ọtụtụ ikpe metụụtara nwuchi ya n'ụlọikpe dị iche iche n'Abuja nakwa n'Ụmụahịa.

Nke a bụ nke Kanu, n'ọnwa Eprelụ afọ 2022, site na ndị ọkaiwu ya gbara Gọọmentị Etiti mgbe Mike Ozehome weghara ndu ndị ọkaiwu ya.

Akwụkwọ ahụ nke ọnụ ego ya dị ijeri naira iri ise n'ikpe akara ya bụ FHC/ABJ/CS/462/2022, bụ maka ebubo imegide ikike dịrị onye(fundamental human right) nke Nnamdi Kanu dịka o boro ebubo na e si Kenya tọọrọ ya kpọlata Naijiria maka ikpe ya ikpe.

Ụlọikpe gechara ihe ọkaiwu na-anọchite ndị okwu ahụ metụtara ma kwuo na a ga ekpe ikpe ahụ n'uju n'ọnwa ikpeazụ nke afọ a.

N'ikpe yiri ya nke metụtara iwu ọhụrụ nke ụlọikpe wepụtara banyere etu a ga-esi ekpe ikpe ọbụla metụtara iyi ndụ egwu, Ejiofor gbara ama na a dụrụ ha ọdụ wezuga akwụkwọ ha gbara n'ụsọ.

Ejiofor kọwara na ,"ihe kpatara nke a bụ na iwu ọhụrụ ahụ enweghị ka ọ ga-esi metụta ikpe onye ndu (Nnamdi Kanu.)"

Ebe okwu si bido

Gọọmenti Naijiria jichiri kemgbe ọnwa Juun afọ 2021 ma na-ekpe Nnamdi Kanu ikpe banyere ebubo metụtara inyindu egwu nakwa ịkpa nkta ịkwatu Gọọmentị Naijiria.

Nnamdi Kanu hibere otu na-achọ nkewapụ mpaghara Biafra Ochie na Naịjiria ọ kpọrọ ' Indigenous People of Biafra (Ipob) n'afọ 2012 .

Gọọmentị Naịjiria nwụchiri ya n'ọnwa Ọktoba afọ 2015, jichie ya ihe karịrị otu afọ tupu a tọhapụ ya nwa oge ka o si n'ụlọ abịa ikpe ya n'ụlọikpe nke Bekee kpọrọ 'bail' n'ụbọchị 28 nke ọnwa Epreelụ afọ 2017.

Mana Kanu ahụghịkwa ya ọzọ na Naijiria dịka ndịagha wakpochara ụlọ ya n'Afaraukwu, Abia steeti n'abalị asatọ nke ọnwa Oktoba afọ 2017.

A hụrụ ya ọzọ mbụ n'ọha na mba Izrel, n'ụbọchị 22 nke ọnwa Ọktoba afọ 2018, kemgbe e ji achọwa ya.

N'ọnwa Juun afọ 2021, gọọmentị Naijiria nwụchigharịrị Nnamdi Kanu ma si mba Kenya kpụlata ya Naịjiria ịbịa kpee ya ikpe.Kemgbe ahụ, ọ pụtala n'ụlọikpe ugboro atọ gụnyere nke ọ pụtara n'abalị iri na itoolu nke ọnwa Jenụwarị afọ 2022.