You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nnamdi Kanu eribeghị ihe ọbụla n'abalị abụọ n'ihi ahụ mgbu - Ejiofor
Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor ekwuola na ọnọdụ ahụike Mazi Kanu na-akawanye njọ n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS ebe e ji ya eji kamgbe ọnwa iri na anọ ugbua.
Ejiofor kwuru nke a dịka ọ gara leta Mazi Kanu taa bụ Fraịde, Sepụtemba 23, n'isi ụlọọrụ ndị DSS.
O kwuru na Nnamdi Kanu eribeghị ihe ọbụla n'ime abalị abụọ gara aga n'ihi nsogbu afọ mgbu ọ na-enwe nke ndị DSS na-achọghị inye ya ọgwụ maka ya.
N'akwụkwọ ozi o nyere ndị ntaakụkọ, Ejiofor kwuru sị: "Ọ dị mwute na dịka anyị tichara mkpu banyere ọnọdụ ahụike Mazi Kanu n'ụbọchị Mọnde, kama ndị DSS ga-enye ohere ka dọkịta Nnamdi Kanu hụ ya ma nye ya ọgwụgwọ, ha gara na nke ndị 'chemist' ịzụta ọgwụ adịgboroja ha ga-enye Kanu.
"Ebe ọ bụ na o doola anya na ndị DSS enweghị ụlọọgwụ dị mma ebe ha ga-eleta Mazi Kanu anya, anyị na-akpọ ndị DSS oku ka ha tọhapụ Kanu ka anyị kpọrọ ya ga nye ya ọgwụgwọ zuru oke."
"Hapụnụ anyị ka anyị zụtara ya ezigbo ọgwụ ma nye ya, dịka anyị na-eche ka ụlọikpe tọhapụ ya."
"Ka anyị jirikwa ohere a kọọrọ ụwa niile na Kanu eribeghị ihe ọbụla kamgbe awa 48 gara aga n'ihi etu afọ mgbu ya si akawanye njọ maka ọrịa 'gastro-intestine disorder' ọ na-arịa, bụ nke ndị DSS kpachara anya jụ inye ya ọgwụ maka ya."
Ejiofor kwuru na ọ dị ka ụjọ a na-atụ gọọmentị etiti maka ha maka ihe ga-abụ mpụtara mkpebi nke ụlọikpe mkpesa gbasara okwu Nnamdi Kanu.
Ọ gara n'ihu kwu na ya na ọkaiwu Mike Ozekhome (SAN) na-agba mbọ iji hụ na mmekpa ahụ niile Nnamdi Kanu na-agabiga n'aka gọọmentị.
Ihe Ohaneze Ndigbo kwuru maka ọnọdụ Nnamdi Kanu n'aka ndị DSS
Otu Ohaneze Ndigbo agwala gọọmentị Naịjirịa ka ha were ehihie chọọ ewu ojii tupu chi ejie, gbasara ọnọdụ Mazi Nnamdi Kanu n'aka ndị ọrụ nchekwa nzuzo bụ Department of State Services.
Nke a na-abịa dịka ọkaiwu Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor na-ekwu na ndị DSS anaghị enye Kanu ọgwụ maka ọrịa 'gastrointestinal disease' na-enye ya nsogbu.
Alex Ogbonnia, bụ ọnụ na-ekwuru otu Ohaneze Ndigbo kwuru na ọ ga-ajọgbu onwe ya ma ọ bụrụ na Nnamdi nwụọ n'ime ụlọ mkpọrọ.
"Onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ George Obiozor agwala Onyeisiala Buhari ugboro ugboro na okwu Nnamdi Kanu karịrị ihe a ga-ekpebi n'ụlọikpe," Obiozor dere n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Mọnde.
"Obiozor agwala gọọmentị etiti ka ha soro usoro eziokwu na ime onye ọbụla etu e si mee ibe ya iji weta udo zuru oke na ọganihu na Naịjirịa."
"Otu Ohaneze na ọtụtụ ndị Igbo ọnụ na-eru n'okwu arịọla Buhari ugboro ugboro ka ọ tọhapụ Mazi Nnamdi Kanu site n'usoro mkparịtaụka."
"Otu n'ime ndị so gbaa mbọ maka nnwereonwe Naịjirịa bụ Ichie Mbazulike Amaechi, rịọrọ Buhari arịrịọ a oge ọ gara njem nleta n'Abakiliki, Ebonyi Steeti."
"Tupu nke ahụ, Mbazulike zutekwara Buhari n'Aso Rock ma rịọkwaa ya otu ihe ahụ."
"Mana ugbua, ọ dị mkpa ka onye ọbụla jụọ ajụjụ a sị, 'gịnị mere ha ji egbochi Mazi Nnamdi Kanu ịnata ọgwụgwọ n'aka dọkịta ya? Nke a bụ nnukwu ihe mgbagwoju anya."
Ogbonnia gara n'ihu kwuo na mkpọrọ a tụrụ Nnamdi Kanu emeela ka ọnọdụ nchekwa kawanye njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
"Gịnị ga-emezi ma ọ bịrị na ihe ọjọọ ọbụla mee Mazi Nnamdi Kanu n'ụlọ mkpọrọ site n'aka ike, mmekpa ahụ nakwa agwa ọjọọ gọọmentị Naịjirịa na-akpaso ya."
Ndị DSS akachiela ntị jụ inye Nnamdi Kanu ọgwụ maka ọrịa afọ ya - Ifeanyi Ejiofor
Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor ekwukwaala ọzọ na ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ Department of State Services (DSS) anaghị enye ohere ka Mazi Kanu leta ahụike ya anya nke ọma.
Ejiuofor kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o kesara n'akara Facebook ya, dịka ọ gara leta Mazi Kanu n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS na mgbede taa bụ Mọnde.
Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Indigenous People of Biafra, nke bụ otu na-azọ nnwereonwe mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Gọọmentị Naịjirịa jichiri Kanu kamgbe ọnwa June afọ 2022, dịka a nwụchiri ya na mba Kenya ma kpụghachi ya na Naịjirịa
End of Akụkọ ndị ọzọ gbasara Nnamdi Kanu
Ebubo Ejiofor boro ndị DSS
Ejiofor kwuru na ya na ọkaiwu Mike Ozekhome (SAN) gara leta Mazị Nnamdi Kanu n'isi ụlọọrụ ndị DSS dịka ụlọikpe si nye ha iwu, mana ha chọpụtara ọtụtụ ihe nke na-adabaghị n'iwu ụlọikpe nyere.
- Ejiofor sị na Nnamdi Kanu ka nọ naanị ya na mkpọrọ, nke bekee na-akpọ 'solitary confinement' kamgbe ọnwa iri na anọ gara aga
- Ndị DSS akachiela ntị na-enupuru ọkaikpe Binta Nyako isi, dịka ha anaghị ekwe ka dọkịta Nnamdi Kanu bịa lee ya ahụ ma mara kpọmkwem ọnọdụ ahụike ya
- Nnamdi Kanu nwere ọrịa a na-akpọ 'gastro intestine disorder, nke na-ebutere ya obi ịcha ọkụ. O kwesịrị ị na-aṅụ ọgwụ 'antacid' na ọgwụ ndị ọzọ ugboro ugboro maka ọrịa a, mana ndị DSS anaghị ekwe enye ya ọgwụ a.
Ejiofor kwuru na nnukwu ọkaiwu Mike Ozekhome amalitela ime ihe o kwesịrị ime iji manye ndị DSS ka ha kwụsị ụdị ntaramahụhụ nakwa mmekpa ahụ ha na-emeso Mazi Kanu.
"Mana anyị chọkwara iji ohere a kọọrọ ụwa niile na enwee ihe ọbụla mere Onyendu (Nnamdi Kanu), ndị DSS na gọọmentị Naịjirịa ka a ga-ejide," Ejiofor kwuru.
Ọ gara n'ihu kwuo na Mazi Kanu na-arịọ ndị nkwado ya ka ha kwudosie ike n'agbanyeghị ihe nhịahụ niile ha na-agabiga.