You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onweghị mgbe m ji kpọọ Peter ma ya fọdụkwa Obi - Fr Mbaka
Ụkọchukwu a ma ama n'Enugwu steeti bụ Ejike Mbaka ejirila ọnụ ya kwuo na akụkọ na-efegharị nke kwuru na ya katọrọ Peter Obi, bụ akụkọ asị.
Mbaka kwuru nke a n'ihe onyonyo e tinyere n'akara soshal midia nke 'Adoration Ministry' n'ụbọchị Wenezde.
Cheta na BBC Igbo mere akụkọ n'ụbọchị Tuzde ma kọwaa na akụkọ ahụ na-efesa n'aha Fada Mbaka abụghị eziokwu
"Onweghị mgbe m ji kpọọ Peter ma ya fọdụkwa Obi, onye ọbụla ekwensu ji mere ngwaọrụ iji metọọ aha m site n'ịgbasa akụkọ ụgha a kwesịrị ịrịọ m mgbaghara,"
"Onye ọbụla ọ bụ, agbagharala m ya, mana achọrọ m ka o were ọnụ ya rịọ mgbaghara ma wepụkwa asịrị ahụ ọ na-ekesa n'aha m."
Ọbụghị ntufe ka a tụfere m gaa 'monastery'
Ụkọchukwu Ejike Mbaka kwuru na ya na-efere ndị Adoration Ministry aka nwa mgbe nta mana ọ pụtaghị na-ewepụla ya dịka onyeisi ha.
"Ọbụghị ntụfe ka a tụfere m na Monastery, ọ bụ njem nwa mgbe nta ka m na-aga, aga m alọghachi n'oge adịghị anya," Mbaka kwuru.
"Oge a bụ oge m ga-eji kpee ekpere ma nụkwa nke ọma ihe Mụọ nsọ chọrọ ka mee."
"Mụ na ụnụ nọ oge niile"
Mbaka kwuru sị: "Monastery m na-aga bụ iji rubere Bishọpụ m isi dịka o kwesịrị n'ụka Katọlik. Ọ bụ iji zọpụta ọtụtụ mkpuruobi, ka ihere bụrụ nke ekwensu."
"Mana ọ pụtaghị na m na-agbahapụ ụnụ. Mmekọrịta mụ na ụnụ bụ ihe ime mmụọ. Ọdịghị mkpa ebe m nọ, ebe ọ bụla m nọ, mụ na ụnụ ga na-anọ oge niile."
"Adoration Ministry emechibeghi, onye ọbụla nọsie ike n'ekpere. Ahụrụ m ụnụ niile n'anya."
Onye emekwala ngagharịiwe
Mbaka gara n'ihu kwuo na ya nụrụ na ụfọdụ ndị mmadụ na-achọ ime ngagharịiwe n'ihi ọpụpụ ọ na-apụ, mana ọ dọrọ ha aka na ntị ka ha ghara ime nke a.
"Ama m na ụnụ bụ ndị ekpere Adoration bụ ezigbo mmadụ na ndị na-atụ Chukwu egwu. Ama m na ụnụ agaghị emechu m ihu."
"Ka anyị niile gbakọọ aka ọnụ ma merie ekwensu... anyị ga-emeri ọnwụnwa a. Ka anyị ghara ịdaba n'ọnya nke ekwensu debeere anyị."
"Onweghị onye ọbụla m rịọrọ ka o mee ngagharịiwe maka m, achọghịkwa m ịnị na e mere ngagharịiwe ọbụla maka njem m a m na-aga na 'Monastery'.
Gbasara Fr Antony Amadi
Anthony Amadi bụ ụkọchukwu nke Bishọp Onaga tinyere ka ọ na-akara ndị ekpere 'adoration' ụka nwa mgbe nta ruo mgbe Mbaka ga-alọghachi.
Mana akụkọ kwuru na ndị mmadụ jụrụ na ha agaghị anabata ụkọchukwu ahụ.
N'okwu ya, Mbaka gwara ndị nkwado ya ka ha nye Fada Amadi nkwado zuru oke.
"Ahafeela m ihe niile n'aka Rev. Fr Anthony Amadi, onye m nyere aka wee họpụta, dịka Bishọpụ si nye m ntuziaka."
"Fr Tony bụ ezigbo mmadụ. Biko nyerenụ ya aka n'ọrụ. Sonyerenụ ya n'ekpere, gosinụ ya ịhụnanya."
"Na-ekperenụ m ekpere, na-ekperenụ ụka katọlik ekpere, na-ekperenụ dayọsis Enugwu ekpere, na-ekerenụ 'curia' nke dayọsis Enugwu ekpere.