Nkwekọrịta NUPENG na ụlọọrụ Dangote nwere

Ebe foto si, NUPENG, Dangote/X
Otu jikọtara ndị ọrụ mmanụ ụgbọala na Naịjirịa bụ Nigerian Petroleum and Natural Gas Transport Workers Union (NUPENG) na ụlọọrụ Dangote enweela nkwekọrịta dịka ndị otu NUPENG yichara egwu ịgba abụbụọrụ.
Nke a dị n'ozi otu NUPENG bipụtara n'akara ọbaozi X ha n'ụbọchị Tuzde 9 Septemba, 2025.
Dịka ozi ahụ siri kwuo, e nwere ya bụ nkwekọrịta na nzukọ Minista na-ahụ maka ọrụ na ohere ọrụ na Naịjirịa haziri.
Ozi ahụ kwuru na nkwekọrịta NUPENG na Dangote nwere gụnyere; na ndị ọrụ isonye n'otu bụ ikike dịịrị mmadụ nke iwu kwadoro, dịka Dangote nabatara ka ndị ọrụ ya nwere mmasị isonye n'otu ọbụla mee nke ahụ.
Nke abụọ abụrụ na usoro ịbanye n'otu ga-amalite ozugbo ma kụrụ ọnụ n'ime izuụka abụọ, ya bụ, malite n'ụbọchị 9 Septemba ruo ụbọchị 22 Septemba, 2025.
Ha nwekwara nkwekọrịta na ụlọọrụ Dangote agaghị ehiwe otu nke ya.
Gbasara nkwupụta e mere gbasara ịgba abụbụọrụ, o nweghị onye ọrụ Dangote ọbụla a ga-ata ahụhụ.
Ngwangwa a hazichara ndebanyeaha ndị ọrụ, NUPENG na Dangote ga-alaghachi na nke Minista na-ahụ maka ọrụ.
N'ihi nkwekọrịta a, NUPENG ekwetela ịkwụsị abụbụọrụ.
Ndị binyere aka na nkwekọrịta ahụ bụ Sayyu Dantata na Otunba Jibrin nke ụlọọrụ Dangote, O.K. Ukoha nke otu NMDPRA, onye nnọchiteanya NLC bụ Benson Upah, onye nnọchiteanya TUC bụ N.A. Toro na Onyeisi NUPENG bụ Akporeha Williams.
Etu abụbụọrụ NUPENG na-agba ga-esi emekpa ụmụafọ Naịjirịa ahụ

Ebe foto si, NEUPENG INFO/DANGOTE REFINERY/FACEBOOK
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Otu jikọtara ndị ọrụ mmanụ ụgbọala bụ Nigerian Petroleum and Natural Gas Transport Workers Union (NUPENG) agaala n'ihu gbaa abụbụọrụ ha yiri egwu ya.
Nke a bụ maka na maka na mkparịtaụka dị n'etiti otu jikọtara ndị ọrụ na Naịjirịa bụ NLC, TUC na ndị ụlọọrụ Dangote n'ụbọchị Mọnde 8 Sepụtemba, 2025 amịtaghị mkpụrụ ọbụla.
NUPENG yiri egwu na ha ga-agba abụbụọrụ maka mkpebi ụlọọrụ Dangote mere iji aka ya eburu mmanụ ụgbọala ga na-eresi ọdọ mmanụ ụgbọala dị iche iche.
Nke a mere ka Mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Mohammed Dingyadi na osote ya bụ Nkiruka Onyejeocha jiri kpọọ ndị a oku iji gboo nsogbu esemokwu ahụ.
Mana mkparịtaụka ahụ amịtaghị mkpụrụ maka na o nweghi ihe ha ji aka.
Odeakwụkwọ otu ndị ọrụ TUC bụ Nuhu Abbayo Toro gwara BBC na o nweghi ihe kwekọrịtara na mkparịtaụka ahụ.
O kwuru, "Ọ bụ ikike dịịrị ndị ọrụ ka ụlọọrụ Dangote chọrọ imetọ, anyị anwaala ike anyị igbo nsogbu ahụ mana ọ dababeghi."
Toro kwuru, "Ọ bụ ya mere anyị ji kwụrụ n'onwe anyị ugbua, ndị ọrụ anyị, anyị ga-aga n'ihu ịnọ etu ahụ, ọ bụgodịrị naanị otu ụbọchị, site n'ike Chineke."
"Achọrọ m ịgwa ndị mmadụ ka ha agbala ọsọ maọbụ laa azụ maka na ikike dịịrị ndị ọrụ bụ otu ruo mgbe ikike dịịrị otu jikọtara ndị ọrụ gwụrụ," ka o kwuru.
Ihe banyere ịgba abụbụọrụ bụ ichere ma hụụ ihe ọzọ ga-eme."
Comrade Nuhu Abbayo Toro, said, "The issue of engaging in a strike is to wait and see what will happen next."
Ndị nnọchiteanya ụlọọrụ Dangote na-esipụta mmanụ agbidi kwuru na ha enweghi okwu ọbụla banyere nke a.
Gịnị na-esere NUPENG na ụlọọrụ Dangote?

Ebe foto si, NNPCL/X
N'ụbọchị Mọnde ka ndị NUPENG yiri egwu na ha ga-agba abụbụọrụ megide mkpebi ụlọọrụ Dangote iji aka ha e buru mmanụ ụgbọala gaa na-eresi ọdọ mmanụ ọgbọala dị iche iche na Naịjirịa ebe a na-azụ mmanụ a.
NUPENG kwuru na ngwa ngwa Dangote malitere nke a, na ọtụtụ ndị ọrụ n'ọdọ ebe a na-eburu mmanụ ụgbọala na ụgbọala tanka mmanụ karịrị 30,000 agaghịzi enwe ọrụ.
Otu jikọtara ndị na-ere mmanụ gaasị bụ National Association of Gas Station Owners and Operators, NOGASA, egosikwala nkwado ha n'ebe NUPENG nọ ka ha gbaa abụbụọrụ.
Mana ndị nwere ụlọọrụ a na-ere mmanụ ụgbọala na gaasị na mpaghara ukwu nke Naịjirịa bụ Northern Nigeria Association of Petroleum and Gas Station Owners (AROGMA) kwuru na ha kwadoro mkpebi a ụlọọrụ Dangote mere iji aka ya na-ebuga mmanụ ụgbọala n'ọdọ ebe a na-ere ya na Naịjirịa.
Kepụkepụ na-ekwu na ndị ọrụ so n'otu NUPENG amalitela imechi ụfọdụ ọdọ ebe a na-ere mmanụ ụgbọala na mpaghara ugwu Naịjirịa na nzaghachị mkpebi ụlọọrụ Dangote mere.
Dịka ọ dị ugbua o dochabeghi anya ma ndị ọrụ NUPENG ọ malitela abụbụọrụ ahụ mana anya onye ọbụla ka na-ele ha ịmata mkpebi ha.
Etu abụbụọrụ a ga-esi metụta ndị Naịjirịa
Dịka ndị ọrụ NUPENG amalitela abụbụọrụ ha yiri egwu ya, ọ ga-emetụta ụmụafọ Naịjirịa n'ụzọ dị iche iche, nke gụnyere ụkọ mmanụ ụgbọala.
Kepu kepu na-ekwu ugbua na ọtụtụ ụgbọala amalitela ịkwụ n'ahịrị n'ọdọ ebe a na-ere mmanụ ụgbọala dị iche iche na Naịjirịa iji zọta tupu oge a gaa.
Nke a ga-emekwa ka ọnụahịa mmanụ ụgbọala rịa elu karịa ihe ọ na-ada ugbua.
Mịnịsta steeti na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa bụ Iziaq Salako kwuru na abụbụọrụ a ga-emetụta ngalaba ahụike maka na ha na-eji igwe ọkụ latrik nke e ji mmanụ ụgbọala maọbụ gaasị agbanye arụ ọrụ.
O rịọrọ ndị ọnụ na-eru n'okwu na ngalaba ahụ ka ha biko hụụ na abụbụọrụ a ga-akwụsị.








