Ndụ n'ogige ndị na-alụagha Jihad site n'anya onye e jidere

- Onye dere ya, Thomas Naadi
- Ndị mere akụkọ a, BBC News, Accra
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 8
Nwoke si mba Gana agwala BBC etu ndị omekome si mba Burkina Faso si tọrọ ya ma duru ya gaa n'ogige ha dị n'ime ọhịa ebe ọ nọ ghọta ka ndị omekome ahụ si ebi ndụ - n'aka ụmụaka o kwenyere na ha bụ ndị a zụrụ dịka ndị omekome na-atụ ogbunigwe, nakwa ime onuno ha gwuru iji gbochie ma chekwaa onwe site na mwakpo ọbụla.
Na nrụrịtaụka mbụ ya n'afọ 2019, nwoke ahụ onye anyị na-akpọ James iji chekwaa onye ọ bụ, kwuru na ụbọchị mbụ ya n'ogige ndị omekome ahụ nwụrụ ya akpataoyi oge ọ hụrụ ndị omekome ahụ gara mwakpo ka ha na-abata ma na-agbali egbe n'elu.
"E chere m na m anwụọla, ọsụsọ na-agba m," ka James kwuru, o kwuru na ọ yụrụ mamịrị n'akwa oge otu onye omekome ahụ kụrụ isi egbe ma chịa ya ọchị.
James gbara afọ 30 na ụma ma bụrụ onye kwenyere n'omenala Afrịka, kwuru ndị omekome ahụ mechara chọọ idubanye ya ka ọ bụrụ onye otu ha. O kwuru na ha kwere ya nkwa dị iche iche nke gụnyere na o nwere ibụ onyeisi ha n'oge na-adịghị anya.
"Onyeis ha wepụtara akpa ọtụtụ egbe dị n'ime ya AK-47, M16 na G3. Ọ jụrụ kedụ nke na-amasị m, a gwaram ya na mụ amaghị ihe ọbụla gbasara egbe. Ọ gwara m na ha nwere egbe ndị ọzọ buru ibu nke ọ ga-enye m ma ọ bụrụ na mụ sonyere ha", ka James gbakwụnyere.
James kwuru o nwere onwe ya n'ime izuụka abụọ a tọrọ ya. O kwuru na ọ rịrịọ ha biko ma gwa ha na o nwere nwatakịrị nọ n'ọrịa ma kwe onyeisi ha ahụ nkwa n ọ ga-abụ onye ọrụ ha na-akpọbatara ha ndị mmadụ na Gana – nkwa bụ nke James na-emeghị ruo taa.
Ụlọọrụ National Commission on Civic Education mba Gana nke na-ebu agha megide ndị ntorobịa isonye ndị omekome, gwara BBC na ha maara maka akụkọ James na ihe ndị ọgabịgara.
Onyeisi ha n;isi obodo Accra bụ Mawuli Agbenu, kwuru na o zutere James iji jiri akụkọ ya dịka ihe ịma atụ nye ndị ntorobịa ndị ọzọ n'ụlọakwụkwọ mahadum.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Akụkọ kwuru na ndị omekome ahụ tọrọ James bụ ndị otu Jama'at Nusrat al-Islam wal-Muslimin (JNIM), maọbụ otu The Support Group for Islam and Muslims. Ha bụ ndị ngalaba otu al-Qaeda e hibere n'afọ 2017 maka ịchịkọta otu ndị omekome ndị ọzọ nọ na mpaghara ahụ.
Otu a gbasiriike na mpaghara ugwu mba Bọkịna Faso dịka ha na-agba mbọ ịbanye mpaghara ndịda n'ogogo okeala ha na mba Gana.
Ụlọọrụ enyemaka kwuru na ihe ruru mmadụ putu iri na ise agbaala ọsọ n'ụlọ ha na Bọkịna Faso gbaga mpaghara ugwu Gana iji chekwaa onwe ha n'aka ndị omekome ahụ.
Mba ndị ọzọ ndị omekome ahụ nwere ọnọdụ bụ na Nije na Mali ebe ha wakporogoro ọtụtụ mmadụ na Ivori Kost, Benin na Togo. Mba ndị a bụ mba nwetara onwe ha n'aka mba Fance.
N'ọnwa Eprel, onye ọrụ UN kwuru na ebe ndị isi mmalite iyi ọha egwu esila n'etiti ọwụwa anyanwụ Afrịka banye na mpaghara ugwu Afrịka ma na-aga mpaghara sub-Sahara Afrịka.
Ndị omekome ahụ ha na al-Qaeda na Islamic State (IS) nwere mmekọ, na-awakpo mpaghara ahụ.

Onye ọrụ nchekwa nọ ọrụ n'okeala Bọkịna Faso gwara BBC na ndị omekome ahụ na-eme njem iji hazie onwe ha n'agbanyeghị ọgụ ndịagha Bọkịna Faso na-alụso ha.
O kwuru na ha na-ezo n'obodo Pusiga.
Akwụkwọ nnyocha ụlọọrụ Netherlands Institute of International Relations kwuru na ihe mere ndị omekome ahụ ji ghara ịwakpo mba Gana bụ maka na ọ bụ ebe ha si enweta ngwa agha ha.
Ọtụtụ ndị mba Gana bụ ndị ụka ebe ndị bi n'okeala ha na Bọkịna Faso bụ ndị okpukperechi alakụba – ebe ụfọdụ mpagahara bụ nke ndị omekome ahụ wakporogoro na mbụ.
ụlọọrụ Netherlands Institute of International Relations kọwara na JNIM gbara mbọ ịwakpo ụfọdụ mpaghara Gana ebe ndị okpukperechi alakụba bi.
Onye na-ezi ozioma alakụba na Bọkịna Faso bụ Amadou Koufabụ onye so hibe otu JNIM ma bụrụkwa osote onyeisi ha. Ọ bụ ya bụ ihe edubata ndị mmadụ n'otu si mapaghara ndị fulani bi na Bọkịna Faso.
Onye ọrụ nchekwa ahụ kwuru na ọtu ndịagha mba Gana ehibela ogige ha na mpagahara ugwu ya mana akụrụngwa nchekwa dị n'okeala anaghị arụ ọrụ.
BBC kpọtụrụ gọọmenti Gana mana ha agwaghị anyị ihe ọbụla.
Otu pati Ghana National Democratic Congress (NDC) - nke ga-eguzobe ọchịchị dịka ha nwetara mmeri na ntuliaka e mere na 7 Disemba - kwere nkwa na mgbasaozi achụmnta vootu ya na ọ ga-enweta ezi nchekwa n'oke ala na "mmekọrịta dị n'etiti ha na mba ndị ọzọ".
N'ọnwa Ọgọst 2023, ụlọọrụ European Union kwuru na ọ ga-enye ụgbọala ndịagha 100, yana akụrụngwa nnyocha dị ka dronu.

Ebe foto si, AFP
Dịka ọ gara ihe ruru otu ụbọchị, o kwuru na o zutere ọtụtụ ndị omekome na mpaghara ugwu ọdịda anyanwụ Burkina Faso, ka ọ na-eru nso n'oke ala ya na Mali.
Ọtụtụ ndị omekome jiọgbaatumtum kwụsịrị ya ma kpọrọ ya gaa n'ogige ha ma gbaa ya ajụjụ ọnụ ruo oge onyeisi ha nwee nkwenye na ọ bụghị onye nyopu, ka James kwuru.
O kwuru na e kechiri ya anya.
James kwuru na ọ hụrụ ndị omekome ruru 500 nke ọtụtụ n'ime ha bụ ndị ntorobịa nakwa otu onye n'ime ha kwuru na ọ bụ dọkịnta ahụike.
O kwuru na ogigie ha ahụ dị na ebe dịka ọzara. Ọ gara n'ihu kwuo na e kewara ogige ha ahụ ụzọ atọ. Ọtụ ụzọ bụ nke ndị isi na ezinaụlọ ha, nke abụọ bụ ndị na-esote ndị isi ebe nke atọ bụ maka ndị obodo a tọọrọ na ndịagha.
James kwuru na a kpọchiri ya n'etiti ndị ọzọ a tọọrọ. Ha tukwuru ala na-ege egwu Salif Keita mba Mali a maara dịka Golden Voice of Africa.
Ụfọdụ ndị omekome amachiela egwu, ha kwuru na okpekperechi alakụba akwadoghị ya.

Ebe foto si, Getty Images
James kwuru na ndị omekome ahụ wakporo ma tọrọ ọtụ ụmụnwaanyị bi n'ime obodo ma tụọ ha na mgbere maọbụ mee ha ka ha bụrụ ndịagha. O kwuru na ọ hụrụ otu nwaanyị bu egbe AK-47 o ji akwa ya kpochie. Ndị omekome ahụ na-edina ụfọdụ ụmụnwaanyị ahụ n'ike.
O kwuru na ọ bụ nwunye ndị omekome ahụ na-arụ ọrụ dịka isi nri na ịza ụlọ.
"A hụrụ m ọtụtụ ụmụaka nakwa ụmụaka ndị omekome ahụ a na-ekuziri etu e si agba egbe nakwa atụ ogbunigwe. Ị ga-ahụ otu nwatakịrị ji egbe ma na-ekwu na ọ ga-agbagbu ndị ọ ga-awakpo".
James kwuru na ụfọdụ ndị omekome ahụ gbara mbọ ime ka o sonyere ha ma gwa ya na ihe ọbụla ndị ọcha mepụtara dị njọ. Ha gosịrị ya ihe onyonyo n'abalị niile.
O kwuru na ndị omekome kwuru na ọ bụrụ na ha hụ ọgbaghara, ha na-eziga ụmụaka dịka ndị na-arịọ arịrịọ, yinye ha uwe ogbunigwe dị na ya ka ha gbuo onwe ha iji nye ha ohere ka ha mee mwakpo ha chọrọ ime.
O kwuru na ndị omekome atọ gwara ya na a na-akwụ ha ụgwọ iji nweta ụmụaka ha ka ga gbuo onwe ha.

Ebe foto si, AFP
James kwuru na ụfọdụ ndị omekome kwuru na ọ bụrụ na Sankara na Nkrumah biri ogologo ndụ, ya bụ na Afrịka kwesịrị ịbụ ebe dị mma. Nke a ga-eme ka ụfọdụ ndị ọcha si mba ha na-abịa Afrịka. Enweghị onye Afrịka ọbụla ga na-eme njem mba ofesi.
James enweghị ọrụ oge ahụ a tọrọ ya, ma kwuo na akụkọ ndị omekome ahụ kara aka. Ọ bụ maka na obi siri ya ike mere o ji ghara isonyere ha.
Maka etu e si tọrọ ya, James kwuru na ndị enyi abụọ alakụba so ya eme njem, kwere ya nkwa na ha ga-enyereaka izute otu onyeisi okpukperechi Alakụba di na Senegal ka o kpere ya ekpere maka agamnihu.
Ọ bụ oge ahụ ka ndị omekome ahụ nwụchiri ha dịka agba nke mbụ njem bịara n'isi njedebe.
James kwuru na ndị omekome ahụ gbagburu otu enyi ya dịka ọchọro ịgba ọsọ ebe a tọrọ ya na enyi ya nke ọzọ.
Ka James nwere onwe ya, o kwuru na onyeisi ndị omekome ahụ atọghapụghị enyi ya ahụ. O kwuru na enwereike ọ bụrụ na o sonyere ha maọbụ na e gbuola ya.
Onyeisi ha gwara m na ọ ga-atọhapụ m ma ọ bụrụ na m kwe ya nkwa ịkpọta ndị ga-esonyere otu ha.
Oge ndị omekome ahụ kpọpụtara ya ebe ọ ga-abanye ụgbọala ma nye ya ego ụgbọala, ha nyere James akara ekwenti ha iji hụ na ha na ya na-akpakọrịta, mana James kwuru na ya akpọghị ha. O kwuru na ọ gbanweela akara ekwenti ya.
James kwuru na ha nyere ya ọgwụ odeshi dị iche iche. Ọ gwara BBC na ụfọdụ ndị omekome ahụ ekweghị n'ọgwụ odeshi, ha kọwara ya dịka ihe megidere okpukperechi alakụba.
James gosịrị BBC ọgwụ odeshi ahụ e ji abụba ọkụkọ, akpụkpọ anụmanụ na ọgwụ mgbọrọgwụ mee. Ọgwụ odeshi ahụ gụnyere nke ha kwuru na ọ na-egbochi mgbọ egbe ịba mmadụ n'ahụ.
Ọ gara n'ihu kwuo na o cheghị na ndị omekome a chọrọ itisa mba Gana n'ihi na ha hụtara Gana dịka ebe ize ndụ nye ha site na mwakpo ndịagha Bọkịna Faso.
Ebumnobi ha bụ ịwakpo mba nwetara nwereonwe ha n'aka mba France na mba Amerịka maka na ha kwenyere na mba abụọ achọghị ọdịmma Afrịka. Mana ebubo a bụ nke mba France na Amerịka gọnarịrị.

Ebe foto si, AFP
Onye maara ihe ekwe na-akụ banyere nchekwa bi na mba Gana bụ Adib Saani, kwuru na ajọ ọnọdụ nchekwa n'Afrịka dị mwute. Ọ gara n'ihu kwuo na o cheghị na ọ bụ ọgụ ndịagha nwereike ịlụ naanị ha.
"Anyị kwesịrị ịhụta ọnọdụ dịka nke karịrị ndịagha. E nwere ihe ndị ọzọ e kwesịrị ilebanye anya na ya dịka ọnọdụ akụnaụba nakwa ihe ndị ọzọ nwereike ibute ma kwalite mwakpo na mpaghara dị iche iche," ka ọ gwara BBC.
Ụlọọrụ National Commission fo Civic Education na-eme mgbasaozi iji gwa ndị mmadụ bi na mpaghara ugwu nsogbu mwakpo a nwereike ibute.
Mgabsaozi a erula isi obodo Accra, iji gwa ndị ntorobịa ndị omekome a nwereike ibutere ha.
Agbanu gwara BBC na mgbasaozi a dị mkpa maka ndị mba Gana bụ ndị ndị omekome a nwereike ịghọnarị.








